Maka nwoke a sị tigburu nwunye ya n’Enugwu Steeti: Lee ihe BBC chọpụtara

Akụkọ fesara ebe niile taa na otu nwaokorobịa tigburu nwunye ya n’Enugwu Steeti.
Nwaokorobịa ahụ bụ Daniel Nnabuife gbara afọ 25 bụ onye e kwuru ji aka tigbuo nwunye ya mụrụ nwa ọhụrụ n’Enugwu Steeti.
Ngwa ngwa, BBC Igbo zọpụrụ njem gaa n’Ugboye dị n’Abakpa Nike ebe asị akụkọ ahụ mere ịchọpụta nke bụ eziokwu.
Onye ntaakụkọ anyị hụrụ nwoke ahụ a na-ebọ ebubo na o gburu nwunye ya bụ Blessing Nnabuife gbara afọ 22 ebe ọ na-ebe nnukwu akwa sị na otu mkpụrụ akwụ ya tinyere n’ọkụ efuola.
Mazị Nnabụife, onye Orlu dị n’Imo Steeti gwara BBC na ọ bụghị eziokwu na ya tigburu nwunye ya, kama na ọ bụ ọrịa gburu ya n’isi ụtụtụ taa.
Dịka ọ kọwara, nwunye ya bụ onye Ebonyị steeti mụrụ nwa ọhụrụ otu ọnwa gara aga mana kemgbe ọ mụchara nwa, ahụ ya niile na ụkwụ ya malitere zawa.

Nke a mere ha jiri na-aga ụlọọgwụ dị iche iche na-achọ ọgwụgwọ mana n’abali ụnyahụ ka ọ bịara dị njọ karịsịa nke mere o ji na-ama jijiji ma na-akwa nnukwu ukwara.
Dịka nwoke ahụ siri kwuo, nwunye ya malitere gbọwa ọbara n‘isi ụtụtụ taa bụ 9 Eprel 2024 mana dịka ọ kụrụ elekere ise nke isi ụtụtụ, ya ekubie ume wee laa mmụọ.
N’ogbe ahụ bụ Ugboye Abakpa, ndị agbataobi ha jupụtara n’anya mmiri.
Nne nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ bụ Virginia Nwafor ji mkpu akwa gwa BBC Igbo na ya bịara ọmugwọ be nwa ya, mana ugbua nwa ya dọzịrị n’ozu.

Onye nwe ụlọ ha bi na ya bụ Everest Nebo kwuru na ọ bụghị eziokwu na nwoke ahu tigburu nwunye ya kama na ọ bụ ahụ mgbu ka ọ na-arịa kemgbe ọ mụchara nwa otu ọnwa gara aga.
Ndị agbataobi ya rịọrọ ka a gbatara nwoke ahụ ọsọ enyemaka n’ihi na kemgbe nwunye ya nwụrụ n’isi ụtụtụ taa, o nweghị ego ibuga ya n’ọba ozu ‘Mortuary’ ma ya fọdụzie ego ọ ga-eji lie ya.









