Ụlọikpe amaala Timileyin Ajayi ikpe ọnwụ maka ọnwụ Salome Adaidu

Ụlọikpe ahụ kwuru na ọ bụ Oluwatimileyin Ajayi gburu Salome Adaidu ma bekasịa ahụ ya.

Ebe foto si, Salome Adaidu Facebook/ Caeser.T

Nkọwa foto, Ụlọikpe ahụ kwuru na ọ bụ Oluwatimileyin Ajayi gburu Salome Adaidu ma bekasịa ahụ ya.
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ụlọikpe Ukwu dị na Lafia, Nasarawa Steeti atụọla amaala Oluwatimileyin Ajayi ikpe ọnwụ ma kwuo ka a akwụgbu ya maka ọnwụ Salome Adaidu.

Ọkaikpe Simona Aboki mara ya ikpe ụbọchị ụbọchị Tọzde, 26 Juun, 2025.

Ụlọikpe ahụ kwuru na ọ bụ Oluwatimileyin Ajayi gburu Salome Adaidu ma bekasịa ahụ ya.

Cheta na a kpụpụrụ Ajayi ụlọikpe maka ebubo igbu mmadụ nke megidere mpaghara 221 nke iwu Penal Code nke mpaghara ugwu Naịjirịa. Iwu a kwuru na ntaramahụhụ nke a bụ ikpe ọnwụ.

Mama Salome gwara BBC na ọ bụ naanị Salome ka o nwere kemgbe di ya nwụrụ.

"Timileyin Ajayi gburu Salome nwa anyị abụghị ọyị ya nwoke, anyị amaghị onye ọ bụ"

Nwagbọghọ Salome e gburu na nne ya

Ebe foto si, Salome Adaidu/Facebook, Tamara Ebiwei

Nwada Ojomachenwu Adaidu bụ nne Salome Adaidu, nwagbọghọ a sị na ọyi ya nwoke gburu ma bepụ ya isi ekwuola etu ọnwụ nwa ya nwaanyị siri metụta ya.

Ọ gwara BBC Pidgin na ọ nọ n'obodo ha na-arịa ahụ mgbe arụ ọjọọ ahụ mere.

O ji ọsọ si n'obodo ha lọta mgbe otu onye uweojii kpọrọ ya ma sị ya na nwa ya nwere ihe mberede okporoụzọ n'ụbọchị Sọnde 12 Jenụwarị, 2025.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Mgbe onye uweojii kpọrọ m, ọ gwara m na na m bịawa n'ụlọọgwụ dị n'Uke, Agwara m ya ka mụ na nwa kwuo okwu mana onye uweojii ahụ jụrụ ajụ ma sị na nwa na-anata ọgwụgwọ. Amalitere m ibe akwa mana onye uweojii ahụ gwara m ka m ghara ibe akwa."

Nwanne nwaanyị Salome nke obere na di nwanne ya nwaanyị gbaara ọsọ gawa n'ụlọọgwụ. Mana o kwuru na o nweteghi ozi ọbụla site n'aka ha ruo n'oge mgbede.

"Ọ bụ n'elekere asatọ nke mgbede ka nwanne di m gwara m na e gburu nwa m ma bepụ ya isi, e tiri mkpu Chineke ekwela na ọ bụghị nwa nke m, amalitere m ikpe ekpere, amaghị m na ọ ga-emecha bụrụ eziokwu."

Nwaanyị ajadu a kwuru na ọnwụ Salome nwa ya na-ewute ya nke ukwuu.

"Ọ tara ahụhụ n'ụlọakwụkwọ, ọ taara m ahụhụ, onweghi ihe ọ naghị emere m, ọ ga-eburu ih n'isi na-ere ka anyị nwereije ịhụ nri rie."

"Lee etu o si nwụọ, agaghị anọnwuzi ndụ, achọrọ m ịnwụ soro ya, mana ndị mmadụ ekweghi m, agaghị m ekwunwuzi okwu maka na nke a karịrị m ọnụ, ka nne Salome kwuru.

Ọ gwara BBC Pidgin na ọ bụ n'ụbọchị Satọde ka ya na Salome kwuru okwu ikpeazụ, na o kwuru na ọ na-asa akwa ya.

Anyị amaghị nwokoroọbịa ahụ dịka ọyị Salome – Patience Adaidu

Patience Adaidu na Salome Adaidu

Ebe foto si, Patience Adaidu

Nkọwa foto, Patience Adaidu bụ Adanne Salome sere foto a n'ụbọchị Fraịde 10 Jenụwarị 2025 tupu ọ nwụọ na Satọde 11 Jenụwarị 2025.

Nwa mbụ n'ezinaụlọ Adaidu bụ Patience Unekwuojo Adaidu kwuru "Timileyin abụghị ọyị nwoke Salome" ma kwuo na ezinaụlọ ha amaghị nwokoroọbịa ahụ dịka ọyị ya nwoke.

"Na mgbede Satọde, nwanne m nwaanyị yiri uwe ya ma gwaa m na ọ na-aga izute otu ọyị ya."

"Enyi ya ahụ bụ onye mmadụ niile n'ezinaụlọ anyị maara kamgbe afọ asaa gara aga, ọ sị na ọ na-aga izute ya, anyị ga-enye ya ohere ịga maka na anyị anaghị egbochi ndị mmadụ n'ezinaụlọ anyị, ka Patience kwuru.

Mgbe ọ pụrụ n'ụbọchị Satọde, anyị ahụghị ya ruo Sọnde, mana mgbe m nọ n'ụzọ na-aga ọrụ ka a kpọrọ na m bịa n'ụlọọgwụ na nwanne m nwaanyị nwere ihe mberede okporoụzọ."

O kwuru mgbe o ruru n'ụlọọgwụ ka ọ hụrụ ụmụnne ya ndị obere abụọ - nwoke na nwaanyị, ha gwara ya na nwanne ha nwaanyị (Salome) anwụọla.

"Mgbe anyị gara ka anyị hụụ ozu ya, echeere m na ọ bụ ihe egwuregwu. Anyị hụrụ ka e bekasịrị ahụ nwanne nwaanyị ka anụmanụ.

Ozu ya dịka anụ nnama e bekasịrị ma kpọsa ya dịka anụ a na-ere ere. Ajụrụ m ndị uweojii ihe mere nwanne nwaanyị mana o nweghi ozi ha nyere," Ka o kwuru dịka ọ na-ebe akwa.

Patience kwuru na ha chọtara otu ebe ma gwuo ala lie ozu Salome maka na ụlọ ebe a na-edosa ozu jụrụ ịnabata ozu n'ihi mberi e beriri ya.

"Ọ bụ eziokwu na onye nwụrụ agaghị apụta kwuchite ọnụ ya. E gburu Salome, bepụ ya isi ma berie ajụ ya niile mana ihe anyị chọrọ ugbua bụ ikpe ziri ezi nye Salome."

"Egburu m ọyị m nwaanyị Salome maka na ọ gbara n'ezi" – Timileyin

Salome Adaidu na Timileyin Ajayi

Ebe foto si, Salome Adaidu/Facebook, TEASER.T/TIKTOK

Timileyin Ajayi, nwamadị a na-ebo ebubo igbu Salome kwuru na o gburu ọyị ya nwaanyị bụ Salome maka na ọ chọpụtara na ọ na-ayị ụmụnwoke ndị ọzọ.

Mgbe ụfọdụ ndị ntaakụkọ gbara ya ajụjụ ọnụ dịka a nwụchiri ya, o kwuru na mgbe Salome bịara n'ụlọya n'ụbọchị Satọde ahụ, na ọ hụrụ ozi ya na ụmụnwoke ndị ọzọ n'ezikọrịta n'ekwentị.

Na mgbe ọ jụrụ Salome banyere ya, na o kwuru na ọ bụ eziokwu ma rịọ ya mgbaghara mana dịka nwada a banyere n'ụlọ ebe a na-asa ahụ, na o weere mma jide ya ma bepụ ya isi, tupu o berie anụ ahụ ya ndị ọzọ.

Ajayi gara n'ihu kwuo na ọ naghị ewute ya na o gburu Salome maka na ọ gbawara ya obi.

Dịka ọ dị ugbua, Ajayi nọ n'aka ndị uweojii ngalaba 'Criminal Investigation Department (CID) dị na Nasarawa Steeti.

Nwada a o gburu bụ Salome Adaidu dị afọ iri abụọ na anọ bụ onye gụcharala akwụkwọ ma na-efe ala nna ya n'ụlọọrụ Nicon Insurance dị n'Abuja, isiobodo Naịjirịa.

Ọ bụ nwa nke ise nakwa nwa nwaanyị nke ise n'ime ụmụaka isii a mụrụ n'ezinaụlọ ha.