Ihe anyị chọpụtara maka ụmụaka atọ a hụrụ ozu ha n'ime ụgbọala n'obodo Nise, Anambra Steeti
Akụkọ pụtara na ngwụcha izuụka gara aga banyere ụmụaka atọ si n'otu ezinaụlọ a hụrụ ozu ha n'ime ụgbọala nna ha.
Nke a mere n'ụbọchị Satọde 4 Jenụwarị, 2024 n'obobo Arah Nise dị n'okpuruọchịchị Awka South nke Anambra Sttet.
Akụkọ kwuru na otu nwoke a kpọrọ Lawrence Eze, kpọchiri ụmụ ya na mbaraezi ụlọ ha ma sị ka ọ gaa zụta ihe mana mgbe ọ lọghachịri ka o bidoro ịchọ ụmụ ya atọ.
Eze mechara hụụ ụmụaka ahụ - nwoke abụọ na otu nwaanyị n'ime ụgbọala ya mana ọ bụrụ na ha anwụọla. O bidoro tiwe mkpu nke mere ndị obodo jiri gbakọọ.

Mgbe BBC Igbo gara n'obodo Nise ịchọpụta kpọmkwem ihe mere, a chọpụtara na ụlọ ebe ezinaụlọ a bi gbachiri agbachi.
Onye ntaakụkọ anyị gara n'isiụlọọrụ ndị nchekwa obodo Nise ebe Onyeisi ha bụ Maazị Ndubuisi kọwara ihe ọ ma banyere ọdachi ahụ.
Maazi Ndubuisi kwuru na ọ nọ n'ụlọọrụ mgbe o nwetere ozi n'ekwentị na a hụrụ ozu ụmụaka atọ n'ime ụgbọala nna ha.
O kwuru na mgbe ha ruru ebe ahụ, ha kpọtụụrụ onyeisi ndị uweojii ngalaba Awka South tupu a maara ma a ga-ebu ụmụaka ndị ahụ gawa n'ụlọozu.

"Mgbe ndị uweojii rutere, ha malitere ime nnyocha iji chọpụta ihe nwereike igbu ụmụaka atọ ndị a.
"Nnyocha ndị uweojii lere ahụ ụmụaka ahụ, ha chọpụtara na o nweghi ihe dịka mmerụ ahụ ọbụla dị n'ahụ ha iji sị na ọ bụ mmadụ pịgburu ha.
"O nweghi ihe dịka ọbara a hụrụ n'ahụ ụmụaka ahụ maọbụ n'ime ụgbọala kama a hụrụ nsị na mamịrị ụmụaka ahụ nyụrụ n'ime ụgbọala.
"Onyeisi ndị uweojii gwara anyị na site na nnyocha ha mere, na ihe ha cheere kpatara ọnwụ ụmụaka ahụ bụ ntachi obi site na-ekughi ume a kpọrọ 'suffocation'.
"O kwuru na ọ dị ka ụmụaka ndị ahụ banyere n'ime ụgbọala nna ha, mechie ya mana ha amazighi ka ha si apụta nke mere ikuku jiri kọnahụ ha n'ime ụgbọala ahụ."
Maazị Ndubuisi kwuru na nchọpụta ndị uweojii a dị iche n'ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia na ndị ojiegbe bịara Nise ma gbuo ụmụaka ndị ahụ.
Ọ gara n'ihu kwuo na Eze bụ nna ụmụaka ndị ahụ jụrụ ka e tinye ozu ha n'ụlọọgwụ kama ọ sị ka e bunye ya ozu ha ka o lie.



