A kpụpụla nwoke bepụrụ nwunye ya aka abụọ ụlọikpe

Nwanyị di ya ji mma bepụ aka abụọ

Ebe foto si, Enugu state government House

Nkọwa foto, Nwanyị di ya ji mma bepụ aka abụọ
    • Onye dere ya, Ebere Ekeopara
    • Ndị mere akụkọ a, Reporter
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

A kpụpụla nwoke bepụrụ nwunye ya aka bụ Maazị Sunday Echege Ụlọikpe Majistretị dị n'Enugwu n'ụbọchị Frịade 31 Jenụwarị, n'afọ 2025.

A na-ekpe ya ikpe ịnwa igbu mmadụ nke megidere iwu Enugwu steeti dị na ngalaba 275, nkebi nke Criminal Code (Cap 30, Vol. 1, Revised Laws of Enugu State, 2004).

N'ihi etu ebubo ahụ siri dị njọ, ụlọikpe Majistretị kwuru na ya enweghị ikike ikpe ikpe dị etu a, ma ziga ikpe ahụ na State Department of Public Prosecution (DPP).

E tinyere Maazị Echege n'ụlọ mkpọrọ dị n'Enugwu tupu mgbe a ga-amalite ikpe ya ikpe n'ụlọikpe dị elu.

Nwaanyị di ya bepụrụ aka
Nkọwa foto, Nwaanyị di ya bepụrụ aka

Nwaanyị ahụ esila ebe a wara ya ahụ "surgery" pụta

Nwaanyị di ya ji iwe nwere mma bepụ aka n'Enugwu aha ya bụ Chinonso Echege apụtala na ndụ ebe a gara waa ya aka nke bekee kpọrọ "surgery".

A wara Chinonso Echege aka n'ụlọọgwụ Parklane Enugwu n'ụbọchi tuzde, Januwarị 28, 2025.

Chinonso gbara afọ 21 n'ụbọchị Sọnde, abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Janụwari afọ 2025.

"Di m chọbụrụ ibe m isi, m tinye aka, o bepụ m aka" - Chinonso Echege

Aha onyonyo, "Di m chọbuuru ibepụ m isi, m tinye aka, o bepụ ya" - Chinonso Echege

Ahụ dị nwaanyị e bepụrụ aka mma ka anyị wachara ya ahụ - Dọkịnta

Ndị dọkịnta wara Chinonso Echege, nwaanyị e bepụrụ aka agwala BBC Igbo na ọ na-enweta onwe ya ka mgbe ha wachara ya ahụ.

Ọ sị na

Chinonso Echege bụ nwaanyị di ya bụ Maazị Sunday Echege bepụrụ aka n'obodo Ibagwa-Agu nke okpuruọchịchị Nsukka, Enugwu steeti akwọwaala ihe butere ọdachi ahụ.

Mgbe BBC Igbo gara n'ụlọọgwụ ebe nwaanyị a na-anata ọgwụgwọ, o kwuru na ọ bụ n'isi ka di ya chọburu igbu ya mma ahụ mana o tinyeziri aka ya, o bepụ ya aka.

"Di m chọbụrụ iji mma bepụ m isi, m ji aka m che mma ya o wee bepụ m aka."
Nkọwa foto, "Di m chọbụrụ iji mma bepụ m isi, m ji aka m che mma ya o wee bepụ m aka."

Etu ihe a si mee

Chinonso Echege kwuru na nke a abụghị mbụ di ya na-eti ya ihe.

n'okwu ya, "O nwere mgbe di m tiri m ihe, m gbapụ ọsọ, eku m nwa m nke abụọ n'aka gbaaga ebe nna m. Anọrọ m n'ụlọ nna m afọ abụọ.

"Di m gbara akwa m niile ma akwa ndina m ji ehi ụra na ihe niile m nwere ọkụ.

"O mechara bịa n'ụlọ nna m, sekpuru ala rịọ ka m gbaghara ya, na ọ bụ ekwensu, na ọ bụ nwa Chineke ugbua, na ọ gaghị eme ihe ahụ ọzọ.

"Ndị be anyị gwara ya ihe niile ọ ga-eme, o mecha ya, ọ bụ n'ọnwa Sepụtemba (nke afọ 2024) ka m laghachịrị n'ụlọ ya.

"O bidokwara omume ahụ ozugbo, rechaa ji niile anyị kọrọ ma bidokwa na-eti m ihe ọzọ."

"Ọ naghị ekwe ka m zaa ekwentị, ọ kụwasịrị ekwentị abụọ ma gbajie akara ekwentị m (simcard).

"A zụtaara m ekwentị ọzọ, ma dosa ya n'obodo anyị, ọ gwara na ọ bụrụ na ọ hụghị ya na ọ ga-egbu ."

"A gbara m ọsọ gbaga na nwanne di m.

Loveth Chinonso Echege
Nkọwa foto, Loveth Chinonso Echege

"Mgbe m lọghachịrị ka m kwadoo ụka, ọ gbachie ụzọ ma were mma gbuo m.

"Ọ chọburu ibepụ m isi mana e tinyere m aka, nke mere o jizi gbuo m mma n'aka ma bepụ aka m.

"Agbagaara m n'ụlọ di na nwunye ndị okenye, ha hụrụ tiwe mkpu ma kpọwa ndị mmadụ ka ha nye aka.

"Di m gbapụrụ ọsọ ga zoo n'ime ọhịa, ndi obodo wee chọta ya, nyefee ya n'aka ndị uweojii."

Chinonso kwuru na ekpere ya ugbua bụ nke ndị dọkịta gwọta ya ka o nwee ike mụọ etu e si adụ akwa na-abụghị ịkpakọ akpa sementi ere dịka o si eme tupu ihe a emee.

Ihe mere m ji gbuo nwunye m mma

Nwoke a na-enyo maka ibepụ nwunye ya aka n'Enugwu

Ebe foto si, Nigeria Police

Nkọwa foto, Nwoke a na-enyo maka ibepụ nwunye ya aka n'Enugwu

Nwamadị a bụ Sunday Echege bepụrụ nwunye ya aka gwara ndị uweojii na o mere nke a maka na o cheere na ọ na-edina nwoke ọzọ.

Daniel Ndukwe bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu steeti kọwara na nwoke a nọ n'aka ha ugbua dịka nnyocha ka na-aga n'ihu.

O kwuru na ọ bụ site n'enyemaka ndị obodo ka e jiri nwuchie nwoke a, napụta ya mma ahụ ma nyefee ya n'aka ndị uweojii.

Chinonso Echege, onye a sị na di ya bepụrụ ya aka
Nkọwa foto, Chinonso Echege, onye a sị na di ya bepụrụ ya aka

Akụkọ mwakpo na-eme n'ezinaụlọ na Naịjirịa

Akụkọ banyere mwakpo na-eme n'ime ezinaụlọ n'etiti di na nwunye abụrụla ihe na-amụbawanye na Naịjirịa.

N'ụbọchị 21 Jenụwarị 2025, ka otu nwoke wụrụ nwunye ya mmanụ ụgbọala ma mụnye ya ọkụ n'obodo Abagana, Anambra Steeti maka na ha na-enwe esemokwu.

O nwekwara nke mere n'ọnwa Eprelụ, 2022 n'Ebonyi Steeti ebe e boro otu nwoke ebubo ka ọ tigburu nwunye ya mụụrụ ya ụmụ asaa.

Ọ bụkwa site na mwakpo na-eme n'ime ezinaụlọ ka otiegwu a ma ama bụ Osinachi Nwachukwu jiri nwụọ. Ezinaụlọ boro ebubo na ọ bụ site n'ihe di ya tiri ya butere ọnwụ ya.

Ọtụtụ ngalaba na-ahụ maka ikike dịịrị onye ekwuola ka gọọmentị gbaa mbọ hụụ na e nyere ndị wakporo nwunye ha ntaramahụhụ ruru ha iji belata ụdịrị akụkọ dị etu a.