Etu ị ga-esi chọpụta ma ọgwụ, ihe oriri ị zụrụ ọ bụ adịgboroja

Ebe foto si, Getty Images
Ị makwa nke na-ewu aghara aghara na soshal midịa na Naịjiria?
Ọ bụ okwu gbasara ma e gotere nri adịgboroja ka ọ bụ nke ezigbo ya.
Nke a na-esote mkpocha na nzacha ụlọọrụ na-ahụ maka nri na ọgwu na Naịjirịa bụ 'National Agency for Food and Durg Administration and Control' bụ Nafdac n'aha ịchafụ mere n'ahịa 'Cemetry' dị n'Aba bụ ebe ha kwuru bụ ebe a na-emepụta nri adịgboroja nnukwu.
Mkpochapụ ahụ Nafdac mere malitere nnukwu mkparịtaụka na soshal midịa na Naịjirịa ebe ndị ụfọdu na-eti mkpu na okwu nri na mmanya adịgbirọja dịka ọrịa.
Ndị mmadụ na-eme onyonyo na soshal midịa na-egosi mmanya dị icheiche na nri dịka, miliki, mmanya ọkụ, ngwa e ji esi nri, tomato mmiri wdgz.
Ndị a ma ama dịka onye na-etinye ọnụ n'okwu nri na Naịjirịa bụ Opeyemi Famakin mere onyonyo na-egosi nri ndị o nwere n'ụlọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
Iji nyere ndị mmadụ aka ịmata ma ha na-azụ ezi nri na ọgwụ ka ọ bụ nke adịgboroja, Nafdac wepụtara ihe ha kpọrọ 'Four Ps' nke pụtara 'pee anọ'. Ndị a gụnyere ; 'Place, price, packaging na product'.
'Four P(s)' ị ga-eji ma ma ihe ị chọrọ ịzụ abụ ezigbo ya
- Ebe ị zụrụ ya(Place) : Nke mbụ bụ ebe ị zụrụ ihe ahụ - Gbaa mbọ hụ na ị na-azụta ihe n'ebe nwere aha na ebe nwere ikike ire ihe ahụ.
- Ego ole?(Price): Nke a bụ ego ole ị zụtara ihe ahụ. Igbo na-asị e bere ego, e bere akpa. Ọ bụrụ na mmadụ na-eresi gị ihe ọnụala karịa etu o si dị na mbụ, nyochaa ya nke ọma.
- Ngwugwu e ji kee ya(Packaging): Nke a gbasara etu e siri hazie ihe ị chọrọ ịzụ. Gbaa mbọ hụ na e dere aha ya nke ọma, na e kwuchisiri ya ike ma kpọchie ya kpamkpam. Lekwa anya na e dere ihe n'ahụ ya nke ọma maọbụ jiri ekwentị gị nyocha nke a kpọrọ 'bar code'. Chọọkwa akara ekwentị ndị mepụtara ya na ebe ha nọ n'ahụ nri maọbụ mmanya ahụ
- Ihe ị zụrụ( Product): Nke a na-arụtụ aka n'etu ihe ahụ ị zụrụ siri dị. Ọ bụrụ na ọ na-esi ka ihe na-achọ imebi emebi maọbụ ọ naghị esi ka ihe ị na-azụbu, erikwala ya.
Ụjọ dị na-iri nri maọbụ ịnụ mmanya adịgboroja
Nri maọbụ mmanya adịgboroja nwer eike ibute ọrịa dị icheiche dịka; ịgbọ agbọ, afọ mgbu, ajụ, iku ume ọkụ ọkụ maọbụ iku ụme ala ala, anụ ahụ mmadụ ịchagharị, ahụ iju oyi maọbụ mmadụ nwereike ịda tụbọ.
Dịka onyeisi Nafdac bụ Moji Adeyeye siri kwuo, akụrụ maọbụ imeju mmadụ nwereike ịkwakọrọ laa site na nsogbu nri adịgboroja nwereike ibute.
N'okwu ya; "ọ dị mkpa ka ndị mmadụ mata na 'metanol' e ji eme mmanya ọkụ adịgboroja nwereike ikpu mmadụ isi kpamkpam."
O kwukwa ka ụmụ Naịjirịa gbado anya n'pge mmemme a ma gaa kpesa ihe ọbụla ha chọpụtara na websaịt ha maọbụ zigara ha ozi gbasara ihe ahụ ị zụrụ n'akara 20543 n'efu.

Ngalaba na-ahụ maka nri na ọgwụ na Naịjirịa bụ NAFDAC n'ichafụ akpọọla oku ka agbachie ahịa Cemetary dị n'Aba nwa obere oge dịka ha chọtara ebe a na-arụpụta ngwa nri adịgboroja ebe ahụ.
Ọnyeisi ngalaba ahụ n'ọwụwa anyanwụ bụ Martin Iluyomade kwuru na ha nụrụ kepu kepu na o nwere ebe a na-eme mpụ n'ahịa ahụ ha mere mee nyocha ma chọpụta na ọ bụ eziokwu.
Mkpocha ahụ bidoro n'ụbọchị Monde gaara n'ihu rue ụbọchị Tuusde dịka Nafdac na-agba mbọ ịkpọchapụ ngwa ahịa ndị mebiri, ndị adigboroja nakwa ndị nwereike imerụ mmadụ ahụ.
Anyị na gọọmentị steeti jikọrọ aka dịka anyị chọpụtara na e nwere ọdọ ahịa ruru 240 e ji arụpụta ngwa ahịa ndị a. A nwụchiela mmadụ iri ma ka na-anwụchi ndị ọzọ
Anyị ahụla etu e si jiri ọdọ ahịa dị icheiche mere ụlọọrụ nrụpụta mmanya ike dị icheiche, ma ndị dị ọke ọnụ nakwa ihichapụ mmanya ndị mebiri emebi.
"Ihe ndị anyị si ebe a bupu, trailer anọ agaghị ebuchanwu ya" ka o kwukwara.


Ọ bụ ụdịrị ihe a mere anyị ji e nwe nsogbu ahụike aghara aghara, ọ bụ ihe ịkpa amụ na anyị ji ego anyị a zụ ihe ọjọọ dị etu a.
"Anyị agaghị ezuike rue mgbe ekpochapụrụ ngwa adịgboroja n'ahịa anyị kpam kpam.
Na ngwụcha, Iluyomade kwuru na ọ ga-amagbu onwe ya ma agbachie ahịa ahụ obere oge iji nye ha ohere inyocha ma rụọ ọrụ ọfụma.
"Anyị edegarala ndị isi edemede maka nka maka na ndị mmadụ juputa n'ahịa, ọ na-enute ọgbaghara".










