Police Brutality: Ndị nchekwa gọọmentị Benue steeti awakpoola onye ntaakụkọ BBC

Ebe foto si, Getty Images
Ndị na-echekwa ụzọ isi ụlọọrụ gọọmentị na Benue steeti tiri otu onye ọrụ BBC bụ Dooshima Abu ihe, dịka ọ na-arụ ọrụ ya.
Abu gara Benue maka ọrụ ntuliaka ọkwa onyeisiala nke mere n'ụbọchị 23 n'ọnwa Febụwarị.
Nsogbu bidoro mgbe Abu wepụtara ekwentị ya igosi ọgbaghara dara n'etiti ndị na-akwado George Akume na Samuel Ortom.
Onye ọrụ DSS bụ onye bu ụzọ wakpo ya sị ya weta ekwenti ya ka o nweike hịchaa foto na onyonyo niile dị na ya.
Dịka ha na agbagha ihe mere, otu nwaanyị uweojii malitere iti ya ihe mere ka ndị ọzọ tinye aka iti ya ihe.
Ọ bụ mgbe kọmịshọna ndị uweojii na Benue steeti bụ Omololu Bishi tinyere ọnụ ka ha hapụrụ nwata nwaanyị ahụ aka.
Bishi gwara BBC mgbe ha kpọtụrụ ya, na e bidobeghi nyocha banyere ya bụ okwu maka na Abu emebeghi mkpesa ọbụla n'aka ndị uweojii.
"A na m atụ anya na ọ ga-abịa n'ụlọọrụ m, ọ bụghị ihe a na-akpa n'ekwentị" ka Bishi kwuru.
Gịnị butere okwu a?
Sinetọ George Akume na ndị otu ya na-eme mmemme mmeri Buhari na ntuliaka, bịara nso n'isi ụlọọrụ Gọvanọ Ortom.
Ndị nkwado Ortom hụrụ ya bụ omume dịka ndị na-atụ ha aka n'anya nke mere na ọgbaghara malitere n'etiti ha.
Akụkọ ga-amasị gị:








