Christmas: FRSC ezipụla ndị ọrụ 25,000 maka ihazi njem okporoụzọ
Akụkọ dị mkpa:

Ebe foto si, @FRSCNigeria
Dịka a na-akwado mmemme ekeresimesi, ngalaba na-ahụ maka nhazi nchekwa njem, bụ FRSC n'aha ịchafụ ezipụla ndị ọrụ ha ruru puku iri abụọ na ise irụ ọrụ n'akụkụ Naijiria niile.
Ha kwuru na nke a bụ iji gbalahụ ihe mberede okporoụzọ n'oge a.
Ọzọ,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ụlọikpe enyela ndị ọrụ ụlọomeiwu na ndị na-edu ha iwu ịkwụsị abụbọọrụ ha na-agba.
Ndi isi ụlọomeiwu kpụpụrụ ndị otu ndị ọrụ ụlọikpe ikwụsị ha ha imechi ụlọomeiwu.
Na mba ofesi,
A kwụsịla ndị ọrụ ụgbọelu mba Namibia anọ ọrụ n'ike maka ife ụgbọelu ka ha ṅụchara manya nke mere ka ụgbọelu ha na-a ga Lagos, Luanda, Accra nakwa Windhoek gbuo awa asaa tupu o fepụ.
Dịka iwu ife ụgbọelu nke mba ahụ kwuru, ndị sọ efe ụgbọelu ekwesịgghị ịṅụ manya awa assatọ tupu ha efe ụgbọelu.
N'egwuregwu,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Otu egwu Arsenal na-enyere ndị uweojii aka ịchọpụta ma nwụchie onye tụrụ Dele Alli bụ onye na- agbara Tottemham bọọlụ karama oge ha gbara asompi league agba anọ nke ikpeazụ.
Gee Nkeji nke mgbede a:
Ndị ọrụ ụlọọgwụ na-eme abụbọọrụ

Ebe foto si, Getty Images
Ndị na-arụ ọrụ n'ụlọọgwụ na-elekọta ndị ihe na-emetụta n'isi a kpọrọ Federal Neuropsychiatric Hospital Enugu, amalitela abụbọọrụ ga-anọ ụbọchị atọ, iji dọọ ndị na-achịkọta ha aka na ntị ka ha mezuo nkwa ha na ndị isi ọrụ ha kwere.
Ha kwuru na ha na-enye ndị nchịkọta ha izu abụọ imezu nkwa ha kwere kemgbe ọnwa itoolu gara aga, ma ọ bụ ha amalite ya bụ abụbọọrụ ọzọ n'ọnwa Jenụwarị.
Ihe Buhari kwuru maka Badeh
Buhari enyela ndị ọrụ nchekwa iwu ka ha chọta ndị gbagburu Alex Badeh bụbụ onyeisi ndị agha Naịjirịa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Atiku tinyekwara ọnụ iji katọọ ogbugbu a.
Ọdọụgbọelu Nnamdi Azikiwe
Onyeisiala Muhammadu Buhari na-aga n'ọdọụgbọelu Nnamdi Azikiwe dị n'Abụja, ebe ọ ga-anọ gbapee akụkụ ọhụrụ a rụrụ ebe ahụ.
N'akụkọ mba ofesi,
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump, amalitela usoro ịkpọlata ndị agha mba ya nọ na mba Siria.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Trump kwuru na ha emeriela otu oyiegwu na-akpọ onwe ha Islamic State, ma kwuo na enweghịzị ihe ndịagha Amerịka ga-anọ ebe ahụ na-eme.
N'egwuregwu,
Tottenham ji goolu abụọ gbapụ Arsenal n'asọmpi iko Carabao, ebe Chelsea banyere n'agba ọkara-ikpeazụ site n'otu goolu Eden Hazard nyere.
Goolu Hazard nyere mere ya nke iri itoolu na itoolu ọ na-enye dịka onye Chelsea, nke bụ na naanị otu goolu fọrọ ka o soro n'ime ndị Chelsea nyerela goolu narị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 5
Gere akụkọ BBC na nkeji ebe a:
Ihe nkiri:
Ị ma na ihe niile dị n'osikapa nwere uru ọ bara? Lee ihe nkiri anyị mere maka etu ntụ dị n'osikapa si abụ ego.










