Taa ka ụlọọrụ BBC West Afịrịka na-emepe na Lagos
Ụlọọrụ BBC nke mpaghara ọdịdaanyanwụ Afịrịka na-emepe ụlọọrụ ha dị na Lagos, Naịjirịa nye ụwa niile taa.
Nke a na-esote mbido mgabsaozi nke asụsụ abụọ dị na Naịjirịa bụ Igbo na Yoruba nime BBC ụbọchị Febuwarị 19 afọ bụ 2018.
E mepecha ụloọrụ a taa, ị mara na Naịjirịa ga-abụ ebe mgbasaozi nke asụsụ anọ sọ na asụsụs BBC ji agbasaozi na mpaghara Afịrịka. Asụsụ ndị ahụ bụ Igbo Yoruba, Hausa na Pidgin.
Mmemme a ga-anabata Jamie Angus bụ onyeisi BBC World Service Group nakwa ọtụtụ ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu gbasara omenaala dị icheiche nke BBC ji agbasaozi.
A ga-eji hashtag #BBCWAfricaLaunch wee gbasaozi maka mmemme a n'igwe social media.






