Ntuliaka 2019: Ndịagha si na ha na-eche Ipob na ntụlịaka a

Ndịagha na Ndị Ipob

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Onyeisi ndịagha Naịjirịa bụ ọchịagha Tukur Buratai enyela iwu ka echechie ndị Ipob dịka a na-akwado ntuliaka na nsonso a.

Buratai kwuru na dịka ọ dị ugbua, ndịagha nakwa ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ na-agba izu imeụlọ ịhụ na ntuliaka 2019 gara nke ọma.

Nke a mere eji mepụta atụmatụ a kpọrọ "Operation Safe Conduct" na Bekee.

N'okwu Onnoghen,

Walter Onnoghen

Ebe foto si, @Crevo360_Ng

Nkọwa foto, Justice Walter Onnoghen

Ụlọikpe na-ahụ maka omume kwụọtọ bụ CCT n'aha ịchafụ adọtiala ikpe onye bụbu ọkaịkpe kachasị na Naịjirịa bụ Walter Onnoghen

Ụlọikpe ahụ nyekwara iwu ka Onnoghen n'onwe pụta ịzara ọnụ ya n'ụbọchị iri n'atọ nke febụwarị tupu ikpe ya agaa ihu.

Otu APC na Rivas

Tonye Cole

Ebe foto si, Tonye Cole

Ụlọikpe mkpegharị emela mkpebi ọhụrụ banyere arịrịọ otu pati APC nke Rivas steeti rịọrọ maka ikpe kagburu ntuliaka imeụlọ ha.

Ikpe ahụ nke ụlọikpe ukwu wepụtara nyere INEC iwu iwepụ aha APC na ndị ga-azọ ọkwa ọbụla na steeti ahụ.

Na mba ofesi,

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Na mba ofesi ụfọdụ ndị mmadụ na mba Malawi apụtala ịkwado otu ụkọchukwu akpọrọ Shepherd Bushiri n'ụlọikpe taa.

A kpụpụrụ Bushiri na nwunye ya ụlọikpe ịzara ọnụ ha maka ebubo nrụrụaka ego onyinye

Akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

'ụtụtụ

Ebonyi

Ebe foto si, BBC/SONNI UGOJI

Onye na-azọ ọkwa gọvanọ n'okpuru pati APC n'Ebonyi steeti bụ Sonni Ogbuoji ekwuola ihe mere ojighi bịa ndọrịtaụka BBC Igbo haziri maka ndị na-azọ oche gọvanọ n'Ebonyi steeti.

Ogbuoji sị na ọ bụ nsogbu emume ahụ ga-etinye ndụ ya mere o ji gbahapụ ya.

Onye mgbasa ozi Ogbuoji bụ Ikenna Omeiwu gwara BBC na ndọrịtaụka ga-abịa gafee mana ndụ ya ka ya mkpa.

Omeiwu zitere BBC ozi na Ogbuoji nwereike ị nọ na nnukwu nsogbu ma ọ bụrụ na o so mee ndọrịtaụka ahụ.

Ọ gwara BBC Igbo na gọvanọ Umahi na-eme ka ndụ lara ndị si pati ọzọ azọ oche gọvanọ ahụ.

N'okwu ya, gọvanọ Umahi wepụtara iwu ga-akwado ka aghara itinye foto achụmta vootu na steeti ahụ mana ọ bụ sọ pati ya bụ PDP na-etinye nke ha."

BBC Igbo gbara mbọ ịnweta onye otu Accord pati bụ Nnaji Igbokwe ka o kwuo ihe mere ihe ojighị bịa zara ọnụ ya ndọrịta ụka a mana ọzaghị ekwenti ya.

Ọzọ,

Ụgbọelụ Helikọpta

Ebe foto si, LAOLU AKANDE

Gọọmenti etiti ezigala ndị nyocha ka ha chọpụta ihe kpatara ụgbọelu Osote onyeisiala Yemi Osinbajo ji daa na Kogi steeti.

Osinbajo kelere Chukwu na ụlọụka etu o si napụta ya ma kwukwa na ọ bụ ekpere Onyeisi nchuaja Redeem bụ Enoch Adeboye zọrọ ya.

N'Egwuregwu

Sala/David

Ebe foto si, Getty Images/David Ibbotson

A chọtala ụfọdụ akụkụ ụgbọelu bụ onye otu egwuregwu bọọlụ Cardiff akpọrọ Emiliano Sala na mmiri kewara mba England na France.

E bidoro chọwa ụgbọelu Piper Malibu N264DB kamgbe ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Jenụwarị ka Sala na ọkwọ ụgbọelu David Ibbotson nọ n'ime ya.

Nkeji taa

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri taa

Aha onyonyo, Onye meriri ọrịa kansa