Nigeria: Ụmụaka ụmụnwaanyị a na-ere iji kwụọ ụgwọ
Site n'omenala obodo Becheve dị na mpaghara ndịda Naịjirịa ebe a na-ere ụmụaka ụmụnwaanyị maka i ji akwụ ụgwọ nne na nna ha ji.
A na-eresi ụmụaka ahụ ndị okenye ụmụnwoke ruru afọ iri itoolu ma ọ bụ ndị bụ ọgbọ nnanna ha dịka ihe eji agbaziri ego ma ọ bụ eji akwụ ụgwọ.
Otu nwagbọghọ akpọrọ Dorothy kọwara etu esi ree ya nakwa etu ndị mmadụ si jide ya aka ka nwoke ahụ nwee ike kwaso ya iko n'ike.
Onye Ụkọchukwu Akonnam Richards gwara BBC na ụfọ ụmụaka ndị a bụ ndị a na-eme ka ha rụọ ọrụ karịrị ha.
O kwuru na ụfọdụ na-atụrụ ime n'oge ha na anọ n'aka ndị nwoke eresiri ha.
Mana onyeisi obodo Becheve bụ Sunday Ichile kwuru na oge ụdị ihe a mere agaala, na akagburu ya n'afọ ndị dị n'okpuru afọ 1990.
Happiness gwara BBC na nwoke zụtara ya na-akụ ya ihe oge ụfọdụ, na ọ na-agwa ya na ọ bụrụ na ọ kụọ ya ihe, na onweghi onye ga-ekwu okwu.
