Akụkọ dị mkpa taa: Ipob na United Nation nwere nzukọ
Akụkọ dị mkpa taa
Nzukọ Ipob na United Nation

Ebe foto si, Getty Images
Ndị isi otu Ipob na otu United Nation nwere mkparịta ụka na Switzerland n'abalị iri na anọ nke ọnwa Seputemba maka ogbugbu ndị otu na Naịjirịa.
Emma powerful bụ ọnụ na-ekwuru ndị otu a kwuru na ọ bụ osote onye ndụ ha bụ Uche Mefor du ndị ipob mee njem ahụ.
Ntuliaka Osun steeti akụrụla ọnụ

Dịka ọ dị ugbua ntuliaka ịhọpụta gọvanọ Osun Steeti akwakọrọla ọnụ na-enweghi ọgbaghara ọbụla.
Ụlọọrụ INEC na-agụkọzi akwụkwọ mbinyeaka na Wọdụ na Wọdụ tupu akpọpụta aha onye meriri na ntuliaka.
Akụkọ si mba ofesi

Ebe foto si, AFP
Ndị oji egbe agbagbuola mmadụ ruru iri abụọ na ise na mmemme ngosi ndị agha Iran mere n'obodo Ahvaz nke mba ahụ.
Ndị agha nnupuisi Ahvaz National Resistance nakwa Islamic State ekwuola na ọ bụ ha mere mwakpo a.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ n'Afrịka CAF amachiela onye ogbu bọọlụ mba Guinea bụ Baba Leno igbu bọọlụ n'afọ iri.
Nke a bụ dịka nyocha onye ntaakụkọ Anas chọpụtara na Leno naara ego dị narị dọla ise bụ nke o kwetara na ọ bụ eziokwu.
Nkeji Nke abalịa
Ihe nkiri nke taa:
Mgba ndị obodo Igbuzo n'emume iri ji ọhụrụ ha.
Nwata makata mma...
Anita Ukah nke si n'Imo steeti abụrụla agbọghọ makarịchara na Naịjirịa niile dịka emere nyocha n'abali Fraide ụbọchị 22 nke septemba.

Ebe foto si, MBGN/FACEBOOK
Nwaada Ukah meriri ụmụagbọghọbịa ndị ọzọ ruru iri atọ n'isii ndị nọchiri anya steeti ndịọzọ na Naịjirịa nakwa isiobodo bụ Abuja.
Ihe nke a pụtara bụ na ọ ga-anọchị anya Naịjirịa na nchọpụta a ga-eme na China n'ọnwa disemba ịji mata agbọghọ makarịrị na mba ụwa niile.
Ọzọ,

Anya mba Naịjirịa niile nọ n'Osun steeti ugbua dịka ha na-akwado ịme ntụliaka họpụta onye ga-achị steetị ha n'afọ anọ n'abịa.
Dịka ndị mba ofesi bịara ịme nyocha na-ekwu na ha kachasị etinye anya n'ihe gbasara nrụrụaka vootu.
Na Delta,
Otu nwaanyị amụọla nwa n'ogige ndị gbara ọsọndụ site n'idemmiri nke dị n'Asaba na Delta steeti.
Nwaanyị ahụ bụ Oriakụ Chidinma Ismaila kelere gọọmentị steetị ahụ maka enyemaka ha nyere ya ị mụpụta nwa ya.
Na mba ofesi

Ebe foto si, Getty Images
Mba Barbados echiela onye otiegwu bụ Rihanna echichi dịka Onye nnọchị anya ha bụ ambassador na bekee
Ọrụ ya ga-achịkọta ihe gbasara agụmakwụkwọ, ịtinye ego n'obodo nakwa ịnabata ndị ọbịa nke pụtara Tourism na bekee
N'egwuregwu,
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
Onye ọgba bọọlụ otu Arsenal Pierre Emmerick Aubameyang ekwuola na nna ya ekwuputabeghị na ọ ga-achịkọta otu egwuregwu mba Gabon.
Iwe ya bụ na ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ kpọpụtara aha nna ya dịka onye nkuzị ọhụrụ ya na-anụbbeghị ma o kwetala ị nara ya bụ ọkwa.
Gee Nkeji nke ụtụtụ a:
Ihe onyonyo nke taa











