Osun 2018: Ndị uweojii anwụchiela mmadụ abụọ na-azụ vootu

Aha onyonyo, Osun 2018: "Vootu gị bụ ike gị, ere na ya"

Ndị uweoji ekwuola na ha nwụchiri ụmụnwoke abụọ bụ ndị echere na ha na-ego votu na ntuliaka ahụ.

Ndị uweojii kwukwara na ha jidere ha ebe ha ji ego karịrị narị puku isii ma bidokwa nyocha.

Amabeghi otu ndọrọndọrọ bụ ndị dupuru ha n'ọrụ a rue ugbua.

Cheta na ndị ntaakụkọ BBC nọ n'Osun steeti na-ekwu na igwe mmadụ pụtara ya bụ ntuliaka.

Ha kwukwara na ndi ọrụ nchekwa dị icheiche pụtara n'uju ha nke gụnyere ndị agha, ndị uweojii, ndịọrụ 'civil defence' ma ndị ji otu afọ efe ala nna ha.

Ndị pụtara ịtụ votu

Mmadụ iri anọ pụtara ịzọ ọkwa Gọvanọ Osun steeti ahụ.

Ademola Adeleke ama dịka 'dancing senator' pụtara tunye votu ya. Adeleke nọchịrị anya PDP na ya bụ ntụlịaka.

Ademola Adeleke
Nkọwa foto, Ademola Adeleke atụọla votu ya

Ibe ya bụ Isiaka Oyetola nke na-anọchi anya APC atụọla votu ya.

Isiaka Oyetola
Nkọwa foto, Oyetola don vote

Igwe mmadụ pụtara ịtunye votu ha.

Ndị mmadụ chọrọ ibinyeaka
Nkọwa foto, Ntuliaka na-aga n'ihu n'Osun state

Ụfọdụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị pụtara ịkwado ibe ha.

Isaac Adewole

Anaghị eji afọ egwu egwu dịka ndị pụtara ịtụ votu na-ego ihe oriri.

Woman wey dey sell food
Nkọwa foto, Pipo wey come vote buy food to chop

Akụkọ ga-amasị gị