Genevieve Nnaji: Ugboro isii nwaada Igbo a gosiri na agbara bụ nwanne mmadụ

Genevieve Nnaji

Ebe foto si, Instagram/Genevieve Nnaji

Nkọwa foto, Genevieve Nnaji nwere nturuugo "Member of the Order of the Federal Republic" nke gọọmentị etiti nyere ya n'afọ 2011
    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Genevieve Nnaji bụ nwaada Igbo a ma ama n'ime ejije nke aha ya na-akpọtụ na Naijiria na mba ndị ọzọ n'ihi nka ya.

O sonyela n'ihe nkiri karịrị iri asaa, ma nwetakwa ọtụtụ nturuugo na Naijiria nakwa n'Afrịka n'ihe gbasara ime ejije.

Ọtụtụ ndị mmadụ na-anụ aha ya mana ha amaghị nke ọma, ya mere akụkọ a ga-eji emepe gị anya banyere nwada a.

Ihe i kwesịrị ịma maka Genevieve Nnaji

Genevieve Nnaji

Ebe foto si, Twitter/Genevieve Nnaji

  • A mụrụ nwada a n'ụbọchị atọ nke ọnwa Mee afọ 1979 mana o toro na Legọs
  • Ọ bụ nwafọ Mbaise dị n'Imo Steetị, ọ bụ nwa nke anọ n'ime ezinaụlọ ụmụaka asatọ.
  • Nna ya bụ injinịa ebe nne bụ onye nkuzi n'ụlọakwụkwọ.
  • Genevieve gụrụ akwụkwọ na Methodist College nakwa Mahadum Legọs dịcha na Yaba (ngalaba creative arts).
  • Ọ malitere ime ihe onyonyo mgbe ọ dị afọ asatọ n'emume 'soap opera Ripples' nakwa mgbe ọ nọ na mahadum.
  • O meela ọtụtụ ihe onyonyo ma rite nturuugbo dị iche iche.

Ihe ada Mbaise a na-eme na-atụ ndị mmadụ n'anya nke na ọtụtụ na-ahụ ya dịka ụgbala enweghị oyiri.

Mana agbara a abụghị kwanụ mmụọ; lee ihe ụfọdụ o merela mere e ji ahụ ya ka 'nwa mama'

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

1. Na nso nso a o wepụtara ihe onyonyo n'akara Igwe okwu na-ewu ugbua a kpọrọ Tiktok nke mere aha ya ji malite iwu na Twitter.

Ụfọdụ na-efezi ya ka chi kpọrọ ya "Beyonce nke Afrika".

Ebe ụfọdụ ji ụmụnwaanyị kara aka dịka Agbani Darego, Omotola Jalade Ekeinde, Nse Ikpe Etim atụnyere ya.

Mana ndị ọzọ si na o nwere ihe dị iche n'etiti akara edemede 'B' na ụkwụ ehi.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

2. Ọ haziri ejije 'Lion Heart' nke kpọtụrụ akpọtụ na mba uwa niile.

E mechara họrọ ya bụ ejije ka ọ nọchite anya ejije ndị Naịjirịa na emume nturuugo 'Oscar' nke afọ 2019, mana ọ garughi n'isi mmiri.

Ya bụ ihe mere ka iwe too ọtụtụ ụmụ Naijiria afọ dịka ha kwuru na nzere ahụ tọsịrị Genevieve na ihe nkiri 'Lion Heart.'

3. Genevieve gbara n'ihe onyonyo ọkpọka nwaanyị mba Amerịka a kpọrọ Oprah Winfrey n'afọ 2009, oge enwebeghị onye ihe nkiri Naijiria rọwara ụdịrị nrọ ahụ.

Oprah kwuru na Genevieve bụ "Julia Roberts nke Afrịka."

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

4. A na-ahụ ndị isi ojii bu ntutu ha dịka chi si kee ya dịka ndị Mgbeke

Genevieve Nnaji

Ebe foto si, Twitter/Genevieve Nnaji

Mana n'afọ ole na ole gara aga, nwaada Genevieve laghachịrị n'isi ya etu chi ndị isi ojii siri kee ya.

Nzọụkwụ a mere ka ọtụtụ jaa ya mma maka ịkwado ihe ndị isi ojii.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

5. Genevieve abụghị naanị n'ime ejije ka o nwere aha

Aha ya dịkwa n'aha ndị e ji ihu ha ere ahịa dịka ọ kpọtụrụ akpọtụ mgbe o mere 'face of Lux.'

Na nso nso a, akpụnwa a tiri akwa e ji egwu mmiri maọbụ nọrọ ezumike n'ikperemmiri see foto gosiri ya dịka 'tomato Jos' n'agbanyeghị na o teela Awụsa na ụta.

Ejiji o yi na foto ahụ mụnyere ọkụ n'ịntanetị.

6. Nwaada ịtụ ime mkpuke abụghị ihe ọhụrụ

Genevieve Nnaji

Ebe foto si, Genevieve Nnaji/Facebook

Mana ihe Genevieve jiri dị iche na ndị nọrọla be nna ha mụọ nwa bụ na ọ chịkọtara onwe ya chụwa akara aka ya na-eleghị anya n'azụ.

Nke a mere na ọtụtụ anaghị echetazi na o nwere mgbe 'leather' bụ kanda nkịtị.

Ndụ nwata a nke nne ya bụbu onye nkuzi ọtakara na-akasi ọtụtụ enweghị olileanya obi, n'ihi na ọ bụ onye nwere etu o si ebu onwe ya nke mere ka a na-ahụ ya dịka onye ngala kwesịrị.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Anyanwụ anaghị agwọ coronavirus