Imo insecurity: Gịnị mere ndị omekome ji awakpo mpaghara Oguta ugboro ugboro?

Ọkaikpe Emperor Iwuala
Mgbe e biputara ya

N'ụzọ ụtụtụ ụbọchị Monde, ka ndị omekome amaghị ndị ha bụ wakporo ụlọikpe ukwu dị n'ime isiụlọorụ obodo Oguta ma gbaa ya ọkụ.

Nke a na-abịa dịka ndị omekome bara n'ụlọikpe ebe otu ọkaikpe aha ya bụ Nnaemeka Ugboma, dọpụta ya ebe ọ na-ekpe ikpe ma gbagbuo ya.

O nwekwara nsogbu ndị ọzọ si na mpaghara ahụ apụta mere ka ndị bi na mpaghara ebe ahụ na-atụ ụjọ mana kedụ ihe bụ ihe ahụ na-akpọtụ?

Gịnị na-ebe n'akụkụ Oguta mere ka nsogbu nchekwa ka njọ ebe ahụ karịa ebe ndị ọzo na steeti Imo?

BBC Igbo gbara mmadụ abụọ ọnụ na-eru n'okwu gbasara nsogbu a iji ghọta ihe na-eme.

Ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-eme ihe a - Charlyboy

Charles Oputa

Ebe foto si, Areafada1/Instagram

N'uche Charles Oputa bụ otiegwu nakwa onye na-azọ ikike ruru onye, ọ sị na ọ bụ aka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-ebute nsogbua nchekwa nke a.

Charly Boy, dịka ndị mmadụ si akpọ ya, bụ onye Oguta. O kwuru na nsogbu nchekwa na-akawanye njọ n'Imo steeti bụ ihe si n'ọchịchị ọjọọ.

"Nsogbu a bụ ihe malitere na mpaghara ugwu mana ugbua, o ruola n'Ọwụwa Anyanwụ n'ihi na ndị ọchịchị anyị nwere dị njọ"

O kwukwara na ọ bụghị ya ga-akpọ ndị na-akwado ọgbaaghara a aha, mana ha na-eme ya n'ihi na o doro ha anya na ha agaghị emeri na ntuliaka na-abịa, nke mere ka ha chọzie ikposa obodo.

Nnaemeka Ugboma bụ ọkaikpe egburu ebe ọ nọ n'ime ụlọikpe ekpe ikpe n'Oguta

Ebe foto si, Emperor Iwuala

Nkọwa foto, Nnaemeka Ugboma bụ ọkaikpe egburu ebe ọ nọ n'ime ụlọikpe ekpe ikpe n'Oguta
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Onye ọzọ tinyere ọnụ n'okwu a bụ onye ntaakụkọ gbasara okwu nchekwa achọghị ka akpọọ aha ya.

Onye ntaakụkọ ahụ anyị ga-akpọ Mazi bụ onye bi n'Imo steeti ma na-arụ ọrụ ntakụkọ ihe karịrị afọ isii.

O kwuru na ihe butere nsogbu nchekwa gbara ụzọ atọ n'Imo steeti, ọ kachasị na mpaghara Oguta ahụ.

Ihe ndị ọ kpọrọ aha bụ:

  • - Okwu mmanụ agbịdị a na-amịpụta na mpaghara Oguta/Izombe
  • - Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ji nsogbu nchekwa emebi ihe
  • - Ndị na-achọ mwereonwe n'aha Ipob maọbụ 'Autopilot'.

"Okwu nchekwa metụtara Oguta abụghị taa ka o bidoro mana ọ kawala njọ. Oguta so na mpaghara na-emepụta mmanụ agbịdị mana ndị ntorobịa ala ahụ enweghi ntụkwasị obi na gọọmentị inye ha oke ruru ha site n'ihe ndị a na-ewepu n'ala ha" ka ọ kọwara.

Ọ sị na ọnọdụ a na-ebutekarị esemokwu n'otu dị icheiche na steeti ahụ nke mere na ọgbaghara na-adapụta n'ebe ahụ kwa mgbe kwa mgbe.

Esemokwu otu na otu a aghọrọla ihe ndọrọndọrọ dịka otu dị icheiche na-ese okwu maka ego mmanụ agbịdị kwụnyere otu ndọrọndọrọ dị icheiche.

N'ihe gbasara ịgba ụlọikpe ọkụ nakwa ịwakpo ndị ọkaikpe na ọkaiwu, ọ kọwara ya ọfụma.

"A gbaala ụlọikpe ọkụ na Njaba, Ihitte-Uboma nakwa Orlu, ọ bụghị naanị na Oguta ka ha mere nke a" ka o kwuru.