Imo insecurity: Gịnị mere ndị omekome ji awakpo mpaghara Oguta ugboro ugboro?

N'ụzọ ụtụtụ ụbọchị Monde, ka ndị omekome amaghị ndị ha bụ wakporo ụlọikpe ukwu dị n'ime isiụlọorụ obodo Oguta ma gbaa ya ọkụ.
Nke a na-abịa dịka ndị omekome bara n'ụlọikpe ebe otu ọkaikpe aha ya bụ Nnaemeka Ugboma, dọpụta ya ebe ọ na-ekpe ikpe ma gbagbuo ya.
O nwekwara nsogbu ndị ọzọ si na mpaghara ahụ apụta mere ka ndị bi na mpaghara ebe ahụ na-atụ ụjọ mana kedụ ihe bụ ihe ahụ na-akpọtụ?
Gịnị na-ebe n'akụkụ Oguta mere ka nsogbu nchekwa ka njọ ebe ahụ karịa ebe ndị ọzo na steeti Imo?
BBC Igbo gbara mmadụ abụọ ọnụ na-eru n'okwu gbasara nsogbu a iji ghọta ihe na-eme.
Ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-eme ihe a - Charlyboy

Ebe foto si, Areafada1/Instagram
N'uche Charles Oputa bụ otiegwu nakwa onye na-azọ ikike ruru onye, ọ sị na ọ bụ aka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-ebute nsogbua nchekwa nke a.
Charly Boy, dịka ndị mmadụ si akpọ ya, bụ onye Oguta. O kwuru na nsogbu nchekwa na-akawanye njọ n'Imo steeti bụ ihe si n'ọchịchị ọjọọ.
"Nsogbu a bụ ihe malitere na mpaghara ugwu mana ugbua, o ruola n'Ọwụwa Anyanwụ n'ihi na ndị ọchịchị anyị nwere dị njọ"
O kwukwara na ọ bụghị ya ga-akpọ ndị na-akwado ọgbaaghara a aha, mana ha na-eme ya n'ihi na o doro ha anya na ha agaghị emeri na ntuliaka na-abịa, nke mere ka ha chọzie ikposa obodo.

Ebe foto si, Emperor Iwuala
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Onye ọzọ tinyere ọnụ n'okwu a bụ onye ntaakụkọ gbasara okwu nchekwa achọghị ka akpọọ aha ya.
Onye ntaakụkọ ahụ anyị ga-akpọ Mazi bụ onye bi n'Imo steeti ma na-arụ ọrụ ntakụkọ ihe karịrị afọ isii.
O kwuru na ihe butere nsogbu nchekwa gbara ụzọ atọ n'Imo steeti, ọ kachasị na mpaghara Oguta ahụ.
Ihe ndị ọ kpọrọ aha bụ:
- - Okwu mmanụ agbịdị a na-amịpụta na mpaghara Oguta/Izombe
- - Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ji nsogbu nchekwa emebi ihe
- - Ndị na-achọ mwereonwe n'aha Ipob maọbụ 'Autopilot'.
"Okwu nchekwa metụtara Oguta abụghị taa ka o bidoro mana ọ kawala njọ. Oguta so na mpaghara na-emepụta mmanụ agbịdị mana ndị ntorobịa ala ahụ enweghi ntụkwasị obi na gọọmentị inye ha oke ruru ha site n'ihe ndị a na-ewepu n'ala ha" ka ọ kọwara.
Ọ sị na ọnọdụ a na-ebutekarị esemokwu n'otu dị icheiche na steeti ahụ nke mere na ọgbaghara na-adapụta n'ebe ahụ kwa mgbe kwa mgbe.
Esemokwu otu na otu a aghọrọla ihe ndọrọndọrọ dịka otu dị icheiche na-ese okwu maka ego mmanụ agbịdị kwụnyere otu ndọrọndọrọ dị icheiche.
N'ihe gbasara ịgba ụlọikpe ọkụ nakwa ịwakpo ndị ọkaikpe na ọkaiwu, ọ kọwara ya ọfụma.
"A gbaala ụlọikpe ọkụ na Njaba, Ihitte-Uboma nakwa Orlu, ọ bụghị naanị na Oguta ka ha mere nke a" ka o kwuru.









