Orlu Killing: Ihe ndịagha Naijiria kwuru maka ihe mere n'Orlu n'ụbọchị ụka

Ebe foto si, Screen grab
Ndịagha Naijiria ekwuola na ihe onyonyo na-efegharị nke gosiri ebe a wakporo obodo Amaifeke, dị n'Ọlụ, Imo steeti bụ a-kpụrụ-akpụ.
Ha kwuru na ọ bụ nkata ndị omekome aka ha dị n'ihe mere kpara iji mee ka ọha ndị mmadụ meere ha ebere.
Akụkọ na-ekwu na ndị agha Naijria na ndị a na-enyo na ha bụ ndị Indigenous People of Biafra (Ipob) kwara mgbọ butere ọnwụ ụfodụ ndị mmadụ okwu ahụ emetụtaghị n'Olụ, Imo steeti.
Mana n'ozi mgbasaozi nke ọnụ na-ekwuru ndịagha Naijiria bụ Onyema Nwachukwu binyere aka ma wepụta n'ụbọchị Monde, ndịagha Naijiria kọwara na ndị ogbo ha si 34 Artillery Brigade Nigerian Army na-akpaghị dịka ọrụ ha siri dị, oge ndị otu Ipob/ESN zutere ha n'Ihioma dị n'Ọlụ, gbawa egbe.
Ha kwuru ha na ha kwarịtara mgbọ, ma nwụchie otu onye n'ime ha, ebe ndị ọzọ riri mbombo ọsọ.
Ha kwukwara na ha ji azịza zachaa mpaghara hụ dịka ha na-achọ ndị gbara ọsọ.
Ha gara n'ihu kwuo na ọ bụ iwe na a napụrụ ndị Ipob ara n'ọnụ n'mere ha jiri zipụta onyonyo a kpụrụ akpụ na-ebo ndịagha ebubo ụgha, ma rịọ ndị mmadụ ka ha gbaa ha nkịtị.
Ozi ahụ kwuru sị, "Ndịagha na-akpagharị zutere ndị otu Ipob otu Ipob/ESN, ha malite gbawa na Banana Junction iji hụ na ndị mmadụ dowere iwu nọrọ n'ụlọ.
"Oge ndị Ipob /ESN hụrụ ndịagha, ha bu ụgbọala 'Toyota Highlander' gawa akụkọ Ihioma.
"Dịka ọgụ ahụ na-aga, aka ndị agha kparala otu n'ime ndị omekome ahụ, ndị ọzọ gbalaga. Ndịagha chọwakwara ha".
Cheta na tigbuo-zọgbuo na-arị elu n'Ọwụwa Anyanwụ kemgbe ihe karịrị otu afọ dịka ndị bu egbe na-awakpo ogige ndị uweojii, ndịagha ma na-egbusi ndị ọrụ chekwa na ndị Igbo welitere isi.
Ndị ọrụ nchekwa ebola ndị otu nnwereonwe Biafra na ọ bụ ha na-akpa mkpamkpa ndị a niile.
Mana ugboro ugboro, Ipob agọọla sị na aka ha dị ọcha.
Ihe mere ndị mmadụ ji eti mkpu na Orlu na-agba ọbara

Ebe foto si, Screen grab
Mpaghara Orlu dị n'Imo Steeti nwuuru ọkụ ọzọ n'ụbọchị Sọnde, abalị iri na asaa nke ọnwa Eprel 2022.
Ndị bi na mpaghara ahụ kọọrọ BBC etu ụda egbe na-ada n'elu na ala si mee ka ha chịrị obi n'aka ogologo ụbọchị ahụ niile.
Ọtụtụ tinyekwara ihe a na soshal midia ma na-ekwu na Orlu na-agba ọbara, nke mere ka #Orluisbleeding malite iwu na Twitter Naịjirịa.
BBC Igbo achọpụtabeghị kpọmkwem ihe merenụ, maka na ndị uweojii na ndị agha Imo steeti ekwebeghị ịza anyị oku iji nye nkọwa doro anya.
Mana anyị anụla n'ọnụ ndi mmadụ nkịtị bi n'Orlu, ndị ji anya ha hụụ ma werekwa ntị ha nụụ ihe merenụ.
Olee ndị kpara ike a n'Orlu n'ụbọchị Easter Sọnde?
Otu onye na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ọ bụ oge ọ gara ịzụrụ mmanụ ụgbọala ka ndị mmadụ malitere ịgba ọsọ.
Ihe a na-eme n'oge dịka elekere iri na abụọ nke ehihie ụbọchị ụka, nke bụkwa ụbọchị emume Easter nke afọ 2022.
O kwuru na ndị mmadụ malitere ịgba ọsọ n'ihi na ndị uweojii, ndị agha nakwa ndị ọrụ nchekwa a na-akpọ Ebube Agu bucha egbe na ụgbọala aha juputa n'okporoụzọ.
Nwoke a gwara BBC Igbo na ndị ya na ha bi n'otu ụlọ kpọrọ ya n'ekwentị dọọ ya aka na ntị ka ọ ghara ịlọghachite n'ogbe ha, maka na "nnukwu ọsọ na-agba".
"Ndị agha, ndị uweojii na ndị Ebube Agu agbaala okirikiri anyị gburugburu na-agba egbe," nwoke a kwuru.
"Anọ m ebe ahụ wee hụ nnukwu ụgbọala ndị agha bụ 'armoured car' ka o ji ọsọ kwofere, dịka a ga-asị na e nwere ndị ọ na-chụ ọsọ."
"Otu a ka ụdaegbe na-adakwa aghara aghara, onye ọbụla agbakpuchaa n'ime."
Oge ụdaegbe dajụtụrụ ka nwa amadia a ji nwayọ buru ụgbọala ya lawa, ọ hụrụ otu onye mgbọ tụtara ebe o dina n'okporoụzọ, na mpaghara Oleme 'street'.
Dịka nwoke a si kọwara BBC Igbo, "Onye a a gbara egbe yi akwa ojii n'elu n'ala, bịakwa nyara akpa na-acha ọbara ọbara n'azụ."
"N'uche m, ọ dịka onye na-agara onwe ya chọrọ iji ọsọ gbaba n'otu ụlọ oge ọ nụrụ ụda egbe."

Nwoke a gwakwara anyị na ọ hụrụ otu ụgbọala dabara n'ime ọwa mmiri, ndị mmadụ kwuru na ọ bụ 'armoured car' ndị agha kwabara ya n'ime ọwa mmiri ahụ."
O kwukwara na ndị mmadụ kọrọ akụkọ etu ndị agha si wakpo ụlọ oriri na nkwari a na-akpọ "Ukwu Akị" ma gbaa ya ọkụ.
Dịka o si kọwaa, "Ukwu Aki" bụ ụlọ oriri na nkwari ebe ọtụtụ ndị akwụna na-anọkarị.
Nwoke a kwukwara na ya ahụkwala ọtụtụ ụgbọala ndị ọrụ nchekwa, gụnyere ndị agha, ndị uweojii, na ndị Ebube Agụ, dịka ha na-akpagharị n'ụtụtụ taa bụ Mọnde, Eperel 18.
Ihe onye ọzọ gwara anyị gbasara ihe mere na Orlu

Ebe foto si, Screengrab
Otu nwafọ obodo Orlu hụkwara ka ihe si mee sị na a ọ hụrụ ozu mmadụ atọ n'ihu ụlọ ndina ebe ọ nọ.
Ọ sị na otu n'ime ndị e gburu bụ enyi ya na-eti egwu a Roco Nnadiekwe bụ onye e ji 'Ja Rule' maara.
Ọ sị na nke a mere mgbe ndị ọrụ nchekwa gụnyere ndịagha na ndị ọzọ yi uweojii na ndị oji egbe kwakọrịtara mgbọ.
Onye a na-achọghị ka a kpọọ aha ya sị na nkwakọrịta mgbọ ahụ were ihe ruru awa atọ, nke mere ndị nkịtị n'ọgbe ahụ ji gbaa ọsọ.
"Mgbọ egbe a na-agba aghara aghara tụrụ mmadụ atọ ma gbagbuo ha n'ihu anya m".
"A hụrụ m ozu otu nwaanyị ma akwa ndị nne, hụkwa ozu nwata nwoke nwere ike ịdị afọ iri na ise (16yrs)."
Otu onye ọzọkwa bi n'Orlu, mana ọ chọghị ka a kpọọ aha ya, kọọrọ BBC Igbo ihe ọ ma banyere ihe a merenụ.
N'okwu ya, ọ sị: "Ihe a malitere dịka ndị a na-eche bụ ndị otu Ebubeagu wụbatara mpaghara Orlu n'ụbọchị Satọdee maka ọrụ nchekwa
"Ndị ojiegbe a ji iwe maka mbata ndị otu Ebubeagu n'Orlu pụta n'igwe ma busowe ha agha n'ụbọchị Sọnde."
Onye ahụ kwukwara na mwakpo ahụ mere ka ndị ojiegbe ahụ gbaa otu ụlọ ndina dị n'Amadim, a ma dịka "Ukwu Aki" ọkụ.
E kwuru na agha a ndị ojiegbe na ọrụ nchekwa Ebubeagu busoro onwe ha ruru awa abụọ dịka ha nọ na-akwakọrịta mgbọ.
Ka akụkọ si kwuo, ya bụ ọgbaghara metụtakwara ndị agha Naịjirịa nọ nso Ụlọikpe Ukwu nke Orlu.
Ndị ọrụ nchekwa ekwubeghị okwu gbasara ya
Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Michael Abattam, o kwuru ka anyị kpọọ ọnụ na-ekwuru ndị agha.
O kwuru na ihe ahụ merenụ bụ n'etiti ndị agha na ndị ekperima, na ndị uweojii amaghị maka ya.
Ọnụ na-ekwuru ndị agha Imo Steeti bụ Joseph Akubo azaghị ekwentị ya, o saghịkwa ozi anyị zigaara ya n'ekwentị.
BBC Igbo nwakwara inweta onye nhazi otu Ebubeagu bụ Panchris Ikechukwu n'ekwentị, mana ọ zaghị ekwentị ya.
Ọtụtụ ihe onyonyo nakwa foto pụtara na soshal midia gosiri ndị bụ ọnya si na mgbọ egbe tụrụ ha, mana BBC Igbo ka na-agba mbọ ịma ma ihe onyonyo ndị a esi n'ihe mere n'Orlu n'ezie.
Cheta na ọnọdụ nchekwa akwanyela njọ na mpaghara Orlu na Orsu akawanyela njọ n'ọdịnso a.
Ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-ebo ebubo na ọ bụ ndị otu na-achọ nnwereonwe, a kpọrọ 'Indigenous People of Biafra' na ndị ngalaba nche ha bụ 'Eastern Security Network' na-enye nsogbu a.
Ihe a kawanyere njọ dịka Ụlọikpe kachasị kpọpụtara aha Hope Uzodimma dịka gọvanọ Imo steeti.
Ọzọkwa bụ nwuchi gọọmentị Naịjirịa nwụchiri onyeisi ndị IPOB bụ Mazi Nnamdi Kanu.
Ihe gọọmentị Imo steeti kwuru nmaka nke a

Ebe foto si, Hope Uzodinma/Instagram
Gọọmentị Imo nke Gọvanọ Hope Uzodimma nọ n'isi ya katọrọ ogbugbu na mwakpo niile na-ame na Steetị ọkachasị na mpaghara Orsu/Orlu.
Uzodimma ekwubuola na mwakpo niile na-eme bụ maka ndọrọndọrọ ọchịchị, ọ bụghị ebubo a na-ebo ndị otu Indigenous People Biafra bụ (Ipob).
"Onweghị ihe dịka 'unknown gunmen', ihe niile a na-eme bụ aka ọrụ ndị na-agba anyị mgba okpuru," Uzodimma kwuru.
N'ozi 'Easter' Uzodinma wepụtara n'ụbọchị ụka, o kwuru sị: "Ọ bụ ihe mwute na ọtụtụ ndị na-ebute enweghị nchekwa n"imo steeti nakwa ala Igbo niile bụcha ndị kpọrọ onwe ha ndị okpukperechi Kraịst."
"Ndị a ha abụ ndị otu Kraịst n'ezie? Ha echetakwara na iwu nke Chukwu nke ise sị mmadụ egbukwala ọchụ?"
"Ugboro ugboro ka m rịọrọla arịrịọ ka ndị niile na-awakpo ma na-egbu mmadụ ka ha kwụsị ya."
"Arịọla m ha ka ha gbasoo udo ma tinye mma ha n'ọbọ."
"Arịọkwaala m onye ọbụla gọọmentị Imo steeti mejọrọ ka ọ gbaghara."
"Eji m ohere Easter a na-akpọ oku ka onye ọbụla gbasoo udo maka ọdịmma nke ụmụ anyị na nke ụmụ ụmụ anyị."
Uzodimma gara n'ihu kwee ndị Imo nkwa na ọchịchị ya ga-ewete udo, ọganihu nakwa mmepe obodo.
Kedụ ndị bụ Ebube Agu?

Ebube Agu bụ otu nchekwa ndị gọvanọ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ hibere iji buso nsogbu nchekwa dakwasịrị mpaghara ahụ agha.
E hibere ha n'ọnwa Epreelụ, afọ 2021, ka ndị gọvanọ Ọwụwa anyanwụ ndị na ndị isi ọrụ nchekwa mechara nzukọ n'Owere, Imo steeti.
Isi ụlọọrụ ha dị n'Enugwu steeti, ebe ha si achịkọta ndị otu ha ndị nọ na steeti ndị ọzọ.
Mgbe Gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi steeti na-ehibe otu Ebube Agu nke steeti ya, o kwuru sị "Ọ bụ Ebubeagụ ga-enyere onyeisiala Muhammadu Buahri aka maka ọrụ ya na nchekwa n'Ọwụwa Anyanwụ".










