Niger coup: Ihe a na-atụ anya n'ọgbakọ ndị Ecowas maka mweghara ọchịchị mba a

Ndị isi Ecowas bụ otu jịkọrọ mba 15 na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka

Ebe foto si, Ecowas/Twitter

Nkọwa foto, Ndị isi Ecowas bụ otu jịkọrọ mba 15 na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka ọnụ

Otu ndi isi ụfọdụ mba ndị nọ n’Ọdịda anyanwụ Afrịka n’okpuru aha Ecowas ga-ezute n’ụbọchị Tọọzde, abalị 10 nke ọnwa Ọgọostụ 2023 maka atụmatụ ịhụị na ndịagha weghaara ọchịchi na Niger weghachitere ọchịchị onye kwuo uche ya ebe ahụ.

O meela izuụka abụọ kemgbe ndịagha na-echekwa onyeisiala Mohamed Bazoum jichịrị ya ma weghara ọchịchị na mna ahụ nke so agwa weghara ọchịchị malitere iri elu na akụkụ Afrịka ọzọ na nso nso a.

Ndị isi Ecowas a na-ezute n’Abuja, isi obodo Naịjirịa.

Ka ọ dị ugbua, ọnọdọ a taara ndị isi Afrịka akpụ dịka ozi nakwa atụmatụ ndị ha zịgaarala mba a maka mweghachite ọchịchị onye kwuo uche ya na Niger amịtabeghi mkpụrụ.

Mba Niger bụ mba nwere ala buru oke ibu nke ụbịam na-emekpa ahụ dịka ndịagha nnupụisi nke ụka Alakụba na-emekpakwa ha ahụ.

Mba a nwere ọtụtụ ihe ọnatarachi Uranium bụ ihe e ji emepụta ngwa nụklịa

Aha onyonyo, Ihe ụfọdụ ụmụafọ Afrịka na-ekwu maka atụmatụ Ecowas iziga ndịagha ha na mba Niger
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Onyeisi Ọchịchị ndịagha mba Niger bụ Generalụ Abdourahmane Tchiani họpụtara ndị ọchịchị ọhụrụ ya n'ụbọchị Wenezde

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisi Ọchịchị ndịagha mba Niger bụ Generalụ Abdourahmane Tchiani họpụtara ndị ọchịchị ọhụrụ ya n'ụbọchị Wenezde

Ụfọdụ ihe ndị merela n’etiti ndịagha weghaara ọchịchị na otu Ecowas

  • Otu Ecowas nyere ndịagha a abalị asaa malite n’ụbọchị 30 nke ọnwa Jụlaị ruo ụbọchị isii nke onwa Ọgọọstụ iji weghachite ọchịchị onye kwuo uche ya
  • Ndịagha a erubeghiri otu Ecowas isi
  • Ecowas enyela mba ọtụtụ mmachị nakwa ntaramahụhụ nke gụnyere igbachi okeala jịkọrọ ha nakwa ikwụsị azụmahịa niile dị n’etiti ha na mba Niger
  • Mba Niger gbachịrị ọdọ ụgbọelu ha ka ụgbọelu ọbụla ghara ibata maọbụ pụọ na mbido izuụka a
  • Naịjirịa so na mba nọ n’otu Ecowas kwụsịrị inye mba Niger ọkụ latrịk – Cheta na onyeisi otu Ecowas bụ onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu
  • Mba Niger ekweghi nabata ụfọdụ ndị Ecowas, otu UN, mba Amerịka nakwa AU chọrọ ibata nwee mkparịtaụka udo n’ụbọchị Tuzde dịka ha kwuru na echieche nchekwa mere ha ekweghi ndị a bata
  • Nke a so iwe ha sị ọha ndị mmadụ na Niger na-ewe ka Ecowas kwuru na ha nwereike iziga ndịagha mba ahụ iji mee ka ndịagha a weghaara ọchịchị mee ihe ha chọrọ
  • Ecowas ekwuola ugboro ugboro na ha ga-esi ụzọ mkparịtaụka weghachite ọchịchị onye kwuo uche ya mana na nke a apụtaghị na ha agaghị eziga ndịagha ebe ahụ ma ọ bụrụ na okwu a ruo ime nke a
  • Onyeisi ndịagha weghara ọchịchị bụ Generalụ Abdourahmane Tchiani họpụtara ndị ọchịchị ọhụrụ ya n'ụbọchị Wenezde ma wepụta Ali Mahaman Lamine dịka Praịm minista ọhụrụ na mmalite izuụka a

Ka nke a na-eme, n’ụbọchị Wenezde Emir chịburu Kano bụ Sanusi Lamido Sanusi gara mba Niger ga zute onyeisi Ọchịchị ndịagha mba ahụ bụ Generalụ Abdourahmane Tchiani.

A na-eche na ha kpara ihe metụtara ọnọdụ onye ekwe, ibe ya ekwe dị n'etiti ndị ndu agha Niger na otu Ecowas.

Ọtụtụ na-atụ anya na nzukọ ndị isi Ecowas ga-enwe n’ụbọchị Tọọzde a nwereike ịbụ maka atụmatụ ime mkpebi ma atụmatụ iziga ndịagha na Niger.