Lamine Zeine: Onye bụbu Mịnịsta na-ahụ maka ego abụrụla Praim Minista mba Niger

Ebe foto si, AFP
- Onye dere ya, Ashley Lime
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist
Ka ọ gachara ihe ruru izuụka abụọ ndị agha ji wegharacha ọchịchị na mba Nijie, ndị ndu ha họpụtara Ali Mahaman Lamine Zeine dịka Praim Minista mba ahụ.
Ndị ndu ọchịchị ndịagha bụ National Council for the Safeguarding of the Homeland (CNSP), họpụtara nw amadi ahụ bụbụ mịnịsta na-ahụ maka ego ma tinye ya n'ọkwa so n'ọkwa kachasị na Nijie.
Zeine na-anọchi Mahamadou Ouhoumoudou bụ onye nọ na Yurop oge a kwaturu ọchịchị mba ahụ n'ike.
Nhọpụta ya na-abịa ka ọ gachara abalị asaa Ecowas nyere Nijie ka ha weghachi Onyeisiala Mohamed Bazoum a chụturu achutu n'ọkwa.
A na-ahụta Zeine dịka onye ga-agbanweli ọnọdụ akụnaụba mba ahụ n'ọnọdụ nsogbu ọ nọ na ya.
Onyeisi Ọchịchị ndịagha bụ Abdourahmane Tchiani họpụtara Zeine dịka Praim Minista dịka mbọ idozi nsogbo na-aga malitere na Niamey.
Onye bụdị Lamine Zeine?
A mụrụ Zeine na Zinder, obodo nke abụọ kachasị nwee ọnụọgụgụ ndị mmadụ na Ndịda Nijie.
Akwụkwọ akụkọ mba France bụ Le Monde nkọwara na Zeine bụ onye ndọrọndọọ nọrọla ogologo oge n'ọrụ ya ma bụrụkwa onye ụmụafọ Nijie ma nke ọma.
Ọ bụ onye agbụrụ Toubou mbụ na-abụ Praim Minista-Toubou bụ agbụrụ kachasị na mpaghara Ugwu nakwa Ọwụwa Anyanwụ Nijie.
Oge a họpụtara ya dịka Praim Minista, Zeine bụ onyeisi ụlọakụ "African Development Bank (AfDB) n'agbataobi 'isiobodo Chad bụ N’Djamena, ndị agbataobi ha.
Akwụkwọ akụkọ mba Fransị kwuru na Zeine gbanyere mgbọrọgwụ ọrụ nakwa ndọrọndọrọ ọchịchị na Ndịda Afrịka site n'ọrụ ya dịka Onyeisi ụlọakụ ahụ na mba Gabon nakwa Cote d'Ivoire, bụ ebe a na-ahụta ya dịka onye ọkaibe n'ọrụ.
Nhọpụta ya dịka Praịm Mịnịsta Nijie dowere ya n'ọnọdụ idu na okwu ihibe ọchịchị ọhụrụ na Nijie.
Oge ọrụ ya chawapụtara
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Zeine gbara afọ 58 bụ onye nwetara ọzụzụ dịka ọkachamara n'okwu akụnaụba(economist) bụ onye anya ha hụrla ọtụtụ nkwatu ọchịchị na mba ya.
Ọ gụzuru akwụkwọ ya n'ụlọmmụta 'National School of Administration'(ENA) dị na Niamey ma gụkwaa na 'Centre for Financial, Economic and Banking Studies ' na Marseille na Paris.
Zeine malitere ọrụ ya na 'Ministry of Economy and Finance' n'afọ 1991, n'okpuru Ọchịchị nchere oge nke Amadou Cheiffou, ka e mechara ọgbakọ udo 'National Conference for Civil Peace' bụ mgbe amalitere ọchịchị onyekwuoucheya na Nijie.
N'afọ 2001, a họpụtara ya dịka direktọ imeobi gọment dịka he was appointed cabinet director, Mamadou Tandja bụbụ onyeisiala banyere n'ọkwa ọchịchị.
Tandja bụbụ onyeagha sonyere na nkwatu ọchịchị wepụrụ Onyeisiala Diori Hamani maburu onyeisiala n'afọ 1999.
N'afọ 2003, Zeine bụrụ Mịnịsta na-ahụ maka ego.
Ọ nọgidere n'Ọchịchị Onyeisiala Tandja were rue afọ 2010, oge Majọ Salou Djibo kwaturu.
N'Ọgọstụ afọ 2010, e boro Zeine ebubo izu ego mana a hapụrụ ya kla o si n'ụlọ na-abịa ikpe.
Na-agbanyeghị na oge ya na ndọrọndọrọ ọchịchị nwere katakata, a na-ahụta Zeine dịka onye ndọrndọọ ọchịchị na-etinye uchu, bụ onye nwere ike idozi ọnọdụ akụnaụba Nijie.
Ndị ọzọ a họrọ n'ọkwa
Zeine abụghị nanị onye ọchịchị ndịagha Nijie họrọ n'ọrụ ọhụrụ.
A họpụtara Colonel Ibro Amadou Bachirou dịka onyeisi ọrụ nke onyeisi Ọchịchị ndịagha ahụ, ebe Lieutenant Colonel Habibou Assoumane bụzị onyeisi ndịagha na-eche onyeisiala (commander of the presidential guard.)
Brigadier General Amadou Didilli, bụbụ odeakwụkwọ ukwu nke Ministrị nchekwa bụzị onyeisi ngalaba, 'High Authority for Peace Consolidation'(HACP).
HACP bụ otu jikọrọ ndọrọndọro ọchịchị, ndịagha na ọha ndị mmadụ nke e hiwere n'afọ 1995 maka ịhụ na a na-emezu nkwekọrịta udo nke Nijie na ndịagha nnupuisi Tuareg binyere aka n'afọ ahụ.
A họpụtara Brigadier General Abou Tague Mahamadou dịka onyeisi ndịagha mba ahụ.
Ọnọdụ ọchịchị
Site na ịhọpụta ndịagha na ndị nkịtị, ndị ndu nkwatu ọchịchị na Nijie akpọchiela ntị ha na mmaja nke otu jịkọrọ mba ndị dị na Ndịda Anyanwụ Afrịka bụ 'Economic Community of West African States' (Ecowas) na ndị Ọdịda Anyanwụ Yorope ha na ha dị na mma nyere ha.
Ọchịchị ndịagha ahụ ezipụla ndị agha ha ichekwa obi gọọmentị na Niamey,isiobbbodo mba ahụ.








