Aga m ahazi ntuliaka ga-edo ewu na ọkụkọ anya na Gabon - Ọchịagha Nguema

Ebe foto si, AFP
Onyeisi ndịagha weere ọchịchị n’ike na mba Gabon bụ Ọchịagha Brice Oligui Nguema aṅụọla iyi na ọ ga-eweghachị ọchịchị n’aka ndị nkịtị ma e mechaa “ntuliaka doro ewu na ọkụkọ anya”.
Na mgbasaozi o nyere dịka e duchara ya n’iyi ọrụ dịka onyeisiala nchereoge, o kwughi oge a ga-eji eme ntuliaka.
Ndịagha chụpụrụ onyeisiala Ali Bongo n’ụbọchị Wenezde na-egbughi oge a kpọpụtara ya dịka onye meriri na ntuliaka.
A na-atụ anya na ndị nkwado mwere ọchịchị n’ike ahụ ga-anọ n’emume idu n’iyi ọrụ ahụ.


Obodo ahụ jụrụ oyi mana ugbua dịka ndị nchekwa juru ebe niile ịhụ na-enwe nsogbu ọbụla.
Onyeisi ndu ndịagha a weere ọchịchị n’ike si n’ezinaụlọ Onyeisiala Ali Bongo nke mere e ji na-ajụ ma ọchịchị o sila n’aka ezinaụlọ ha pụọ kamgbe afọ iri ise na atọ n’ezie?

Ọchịagha Nguema ekwuola na ọ dịghị ya ngwa ngwa iweghachị ọchịchị n’aka ndị nkịtị ka ihe mere mbụ ghara ime ọzọ.
Pati na-anọghị n’ọchịchi dọrọ aka na ntị na ndịagha a adịghị ka ndị chọrọ iweghachị ọchịchị n’aka ndị nkịtị.
Gabon bụ mba nke isii nweere onwe ha n’aka mba France bụkwanụ ebe ndịagha weere ọchịchị n’ike n’ime afọ atọ, dịka ndị France ka na-agba mbọ itinye aka n’ọchịchị ha.

Ihe i kwesịrị ịma maka ọchịagha Nguema

Ebe foto si, AFP
- A mụrụ ọchịagha Nguema na mpaghara Haut-Ogooué nke mba Gabon.
- Mpaghara bụ ebe ezinụlọ Bongo jisi aka ike, ụfọdụ na-ekwukwa na Nguema na Ali Bongo bụ nwanne.
- Dịka nna ya, Nguema banyere n'otu ndị agha oge ọ bụ nwata. O bu ụzọ nweta ọzụzụ n'ụlọakwụkwọ ndị agha a ma ama bụ 'Meknes Royal Military Academy na mba Morocco, tupu o sonyere otu ndị agha mba Gabo siri ike bụ 'Republican Guard Unit'.
- O teghị aka, ndị isi ndị agha matara Nguema n'ihi uchu ọ dị n'ọrụ, nke mere o ji bụrụ onye enyemaka nye onyeisiala oge ahụ bụ Omar Bongo, nna Ali Bongo.
- Akụkọ kwuru na Nguema na Omar Bongo nwere ezi mmekọrịta pụrụ iche - dịka ọchịagha ahụ gbaara Bongo odibo ruo mgbe onyeisiala ahụ nwụrụ n'afọ 2009.
- Mana dịka Ali Bongo malitere ọchịchị ya, a chụpụrụ Nguema n'ọrụ ya ma ziga ya dịka onye agha na-elekọta ụlọ nnọchiteanya mba Gabon na mba Noroccoa na Senegal, ọ nọrọ ihe ruru afọ iri na mba abụọ a.









