M na-ehi ụra mgbe di m wakporo m ma rụkpọo mkpụrụ anya m abụọ - Amarachi Lawrence

Amarachi Lawrence kwuru na o nweghi esemokwu ọbụla dị n'etiti ya na di ya tupu ọ chọrọ ịrụkpọ ya anya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Amarachi Lawrence, nwaanyị di ya rukpọro anya abụọ n’Umuahia Abia Steeti akọwaala ihe ọ gabigara n’aka di ya n’abalị ụbọchị ahụ.

Nwaanyị bụ na-anya ụfụ ihe mere ya n’ụlọọgwụ ugbua gwara BBC Igbo na ọ bụ n’abalị ụbọchị 27 Ọgọst 2024 ka di ya wakporo ya n’etiti abalị na enweghi ihe ọbụla o mere ya.

O kwuru na ha richara nri abalị ma tụọ okwe egwuregwu a kpọro ‘whot’ na Bekee tupu ọ lagbuo ụra.

Di ya jikwa mma gbukasịa ya ahụ ka ọ rụkpọchara ya anya.

Amarachi kwuru n’eruru ihe dịka elekere otu nke etiti abalị, na di ya kpọtee ya n’ụra ma malite itiya ihe, were aka ya abụọ rụgide ya na mkpụrụ anya.

“Mgbe anyị richara nri abalị, anyị zụrụ okwa ‘whot’ tupu m lakpuo ụra.

“E ruru n’etiti abalị, di m kpọtere m n’ụra, m gwara ya ka ọ hapụ m ka m hie ụra mana ọ jụrụ ma were aka rụgide m n’anya ka ọ rụpụta mkpụrụ anya m abụọ.

“Ọ gara n’ihu were mma oge na-egbukasị m n’aha nke mere m jiri na-eti mkpu ruo mgbe nwunye onyw nwe ụlọ anyị pụtara.

Anarachi kwuru na di ya mepere ụzọ ha ma malite igbu nwaanyị ahụ mma, na ọ bụ oge ahụ ka ọ maghizi ihe na-eme ruo mgbe o tetara n’ụlọọgwụ.

O kwuru na o rubeghi afọ abụọ ha lụrụ dịka di na nwunye, na ha amụtabeghi nwa ọbụla.

Ọ kpụkuru gọọmentị ka a gbara ya ọsọ enyemaka ma rịọ ka enyekwara ụmụnwaanyị ndị ọzọ na-agabiga ụdịrị ihe a aka.

Lawrence Uzor bụ di ya bụ onye obodo Umuhu Ezechi dị n’okpuruọchịchị Bende ebe Amarachi bụ onye Umuahia.

"Lawrence gburu m mma oge m chọrọ ịzọpụta nwunye ya"

Nwoke wakporo nwunye ya ka ọ na-ehi ụra n'ime abalị ma rụkpọọ ya anya abụọ

Ebe foto si, Other

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Nwaanyị nwe ụlọ ha bi bụ Lovejane Nwaiwu kwuru na ihe dịka elekere iri nke abalị ụbọchị Satọde ka nwoke a nọ na-eti mkpu ‘odogwu, odogwu’.

N’okwu ya “dịka nwoke a tichara mkpu ahụ, ụra pụrụ n’anya ruo ihe dịka elekere iri na abụọ nke etiti abalị.

“Mgbe ọ kụrụ elekere otu (1am), nwunye nwoke malitere iti mkpu, ‘Nne e gbuola m’.

“Emepere m ụzọ ma nyoo anya na mpio ụlọ ha wee hụụ ka nwoke a ji mma nwagidere nwunye ya n’elu.

“Amalitere ịkwa aka n’ọnụ ụzọ ndị agbataobi mana o nweghi onye kwere aza oku.

Agara m n’ọnụ ụzọ ụlọ ha ma malite ịkụ aka n’ụzọ, nwoke a hụ mepere ụzọ ma were mma sị ka o gbuo m n’isi, etinyere m aka mere o jiri gbuo mma ahụ n’aka nakwa n’ihu.

“Agbara m ọsọ ma gbaba n’ime ụlọ anyị tupu m kpọọ nwa m n’ekwentị bụ onye mechara kpọọ ndị ọrụ nchekwa tupu a nwụchie nwoke ahụ.”

Dịka ọ dị ugbua, nwoke a nọ n’aka ndị uweojii ugbua bụ ebe a ka na-agba ya ajụjụ ihe mere o jiri kpaa arụ a.

Nwunye Gọvanọ Abia Steeti bụ Priscilla Otti mere njem nleta n’ụlọọgwụ ebe nwaanyị a nọ ma kwaa arịrị n’ihi ọdachi a.

Onyeisi ụlọọgwụ ahụ kwuru na ha na-agbasi mbọ ike ịhụ na e mere ka nwaanyị a malitekwa ịhụ ụzọ.