Ndị uweojii anwụchiela mmadụ atọ maka di na nwunye e bepụrụ isi n’Abia steeti

Ebe foto si, Abia State Police Command
Aka ndị uweojii akparala mmadụ atọ a na-enyo enyo maka di na nwunye e bepụrụ isi n’obodo Etiti-ulo dị n’Okpuru ọchịchị Bende n’Abịa steeti.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abịa steeti bụ Maureen Chinaka kwuputara nke a n’ozi ọ wepụtara na nso nso a.
O kwuru na oge ndị uweojii Itumbuzo dị n’Okpuru ọchịchị Bende nwetara mkpesa banyere ya bụ ọnọdụ, ha wụchiri ebe ahụ ozugbo ma bugaa ndị e gburu egbu n’ọbaozu maka ime ha nnyocha.
O kpuhekwara na ha nwụchiri mmadụ atọ a na-enyo enyo aka ha dị n’ọnwụ di na nwunye ahụ dịka ndị uweojii nke ngalaba na-ahụ maka ndị omekoome dị n’Ụmụahịa na-eme ha nnyocha ugbua.
Gọvanọ Otti ekwela nkwa ịchọpụta ndị bepụrụ di na nwunye isi n’Abịa steeti

Ebe foto si, Getty Images
Aka na-achị Abịa steeti bụ Alex Otti agbarụọla ihu n’ihi ọnwụ di na nwunye ndị e bepụrụ isi n’Okpuru ọchịchị Bende nke steeti ahụ.
Otti gosipụtara iwe ya maka ihe ọdachi ahụ n’otu ozi ọ wepụtara n’ụbọchị Fraịde 4 Ọktoba 2024.
O nyere iwu ka ndị nchekwa niile e nwere n’Abịa steeti mee nnyocha miri emi iji chọpụta ma nwụchie ndị aka ha dị n’ọnwụ mmadụ abụọ ahụ.
N’aha Gọọmenti Abịa steeti, Gọvanọ Alex Otti kasiri ezinaụlọ ndị ahụ nwụrụ anwụ obi ma kwe ha nkwa na gọọmenti na-agbasi mbọ ike iji hụ na aka kpaara ndị omekoome kpara arụ ahụ.
Cheta na ndị omekoome amatabeghị ndị ha bụ gburu Maazị Jacob Udo na nwunye ya ma bepụ ha isi n’obodo Isiala dị n’Okpuru ọchịchị Bende n’Abịa steeti.
Ihe anyị ma maka dị na nwunye e bepụrụ isi n’Abia steeti

Ebe foto si, Getty Images
Ụdị ọnwụ Jacob Udo na nwunye ya bụ Comfort Udo nwụrụ bụ ihe mgbanwa obi.
BBC Igbo ghọtara na e ji mma bepụ ha abụọ isi ma gbukasia ozu ha na nke-nke n’obodo a na-akpọ Isiala na okpuruọchịchị Bende, n’Abia steeti.
Anyị nụkwara na mkpamkpa ahụ etinyela ọgbaaghara n’etiti obodo abụọ ndị a bụ Isiala na Itumbuzọ maka na Jacob na nwunye bụ ndị Ndiwo Itumbuzọ mana ebe e gburu ha bụ n’Isiala.
Ihe anyị nụrụ maka Jacob Udo na nwunye ya e gburu
Jacob Udo na nwunye ya bụ Comfort Udo bụ ndị Ndiwo Itumbuzor dị na okpuruọchịchị Bendel, Abia steeti mana ha nwere ebe obibi n’Isala dịka ndị ọbịa.
Jacob na nwunye ya mụrụ ụmụaka anọ.
Anyị nụrụ na nwa ha nwoke nke mbụ nọ na mba Amerika, ebe nwa ha nwaanyị nke mbụ bụ dọkịnta na Federal Medical Centre, dị na Kalaba, Kros Riva Steeti.
Nwa ya nwaanyị nke abụọ na dị ya bị n’Ibadan.
Jacob Udo na nwunye ya agaala mba Amerika ebe nwa ya nwoke nọ tupuu ha alọghachite na Naịjirịa n’ihe na-erubeghị otu afọ.
Anyị nụrụ na Jacob na-arịa ọrịa shuga bụ nke ọ na-arịa tupu e gbuo ya.
Ezinaụlọ ha gbara mbọ ka ọ nọrọ na mba Amerịka ma ọ siri ọnwụ ma lọghachite na Naịjirịa.
Ọ bụbụ onye na-atụ mgbere mmaya ma na-azụ ahịa n’akụkụ ụlọọrụ gọmentị okpuruọchịchị Bendel.
Ihe ndị uweoji kwuru maka ogbugbu Jacob na Comfort Udo
Ọnụ na-ekwuru ndị uweoji n’Abia steeti bụ Maureen Chinaka kwuru na “ọ bụ eziokwu na ha nwetere ọzị ahụ n’abalị garaaga na Bendel”
“Anyị agaala ebe mkpamkpa ahụ kpara, hụ ozu ha, ma buru ozu ha tinye n’ọba ozu”.
Chinaka gara n’ihu kwuo na ndị uweoji amalitere ime nnyocha gbasara mkpamkpa ahụ.
Ihe onye na-anọchịte anya ha n’ụlọomeiwu kwuru
N’aka nke ọzọ, osote onyeisi n’ụlọ omeiwu nke nta n’Abuja bụ Benjamin Okezie kwuru na ihe ahụ mere bụ arụ ma kpọọ oku ka a nwuchie ndị kpara mkpamkpa ahụ.
Okezie zigara ozi ịtịaka n’obi nye ezinaụlọ ndị e gburu ma kpọọ ndị eze na ndị ọnụ n’elu n’okwu na mpaghara ahụ ka ha jịkọọ aka ọnụ ma hara ikwe ka ọgbaaghara daa n’ebe ahụ.









