NEC agwala Onyeisiala Tinubu ka o wezuga atụmatụ inwogharị ụgwọ ụtụisi

Akụkọ ndị dị mkpa n'ọnwa Ọktoba.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Jessica Nwankwo, Michael Ilediagu, Ikechukwu Kalu, Uche Akolisa, Adline Okere.

  1. NEC agwala Onyeisiala Tinubu ka o wezuga atụmatụ inwogharị ụgwọ ụtụisi

    Otu National Economic Council

    Ebe foto si, Kashim Shettima/X

    Otu a kpọrọ National Economic Council (NEC) ekwupụtala uche ha banyere nwogharị atụmatụ ụtụisi nke Onyeisiala Bola Tinubu degaara ndị omeiwu.

    Onyeisiala Tinubu zigaara ndị omeiwu atụmatụ a site ntuziaka kọmitii na-ahụ mwogharị ụtụisi wepụtara bụ nke ga-ahụ na e welutere ego ga na-abata n’akpa gọọmentị etiti.

    Mana otu NEC gbakọtara aka ma kpọọ oku ka e wepụ atụmatụ ahụ.

    Nke a na-abịa dịka otu a nke Osote Onyeisiala bụ Kashim Shettima nọ n’isi ya nwechara ọgbakọ n’Abuja n’ụbọchị Tọzde.

    Na ngwụcha ọgbakọ ahụ, ndị gọvanọ kwuru na e kwesịrị inwe ezi nkwekọrịta n’etiti ngalaba dị iche iche banyere nwogharị ụtụisi ahụ.

    Gọvanọ Seyi Makinde nke Oyo Steeti kwuru na e kwesiri ịkpọtụrụ ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n’okwu gụnyere ndị gọvanọ Steeti tupu a na-ewepụta atụmatụ ahụ, iji hụụ na iwu ga-abara ụmụ Naịjirịa niile uru.

    Nke a na-abịa n’ime ụbọchị ole ma ole ndị gọvanọ mpaghara Ugwu jụrụ ịnabata ụfọdụ ihe dị n’atụmatụ nwogharị ahụ, gụnyere ike ụtụisi VAT.

  2. Etu ndị ntọrị si gbagbuo onye ọrụ ụlọakụ na mmadụ abụọ ndị ọzọ n’Umuahia, Abia Steeti

    Ndị ntọrị gbagburu ya ka ọ na-achọ ịgbanarị ha n'ọsọ

    Ebe foto si, Victor Udensi/Facebook

    Ndị ntọrị mmadụ atọ bu ọgbatutum gbagburu ihe ruru mmadụ atọ n’ụbọchị Tuzde n’Umuahia bụ isiobodo Abia Steeti.

    Kọmishọna ndị uweojii n’Abia Steeti bụ Danladi Isa mere ka ndị ntaakwụkọ mata nke a n’ụbọchị Tọzde ka ọ na-agba ụfọdụ ndị omekaome n’anwụ.

    Otu n’ime ndị a gbagburu bụ onye nwoke a kpọro Victor Udensi na-arụ ọrụ n’ụlọakụ, bụ onye a gbagburu na mpaghara Isi Court dị n’Olokoro.

    Akụkọ kwuru na ndị ntọrị a so ụgbọala nwamadị a n’azụ oge ọ gbasara ọrụ n’elekere asatọ nke abalị ma tọrọ ya chọrọ ịkwaba ya n’ime ụgbọala ya n’ike.

    Mgbe nke a na-eme Udensi chọrọ ịgba ọsọ mana ndị a gbara ya egbe n’azụ ma hapụ ya ka ọbara na-asọ ya n’azụ.

    Ndị ntọrị a ka ha na-achọ iburu ụgbọala mana o kweghi ha, ha kwụsịrị otu onye ọzọ bu ụgbọala ma chọro ịnapụ n’ike.

    Ha na onye ahụ malitere ịzọ igodo ụgbọala ahụ nke mere ha jiri gbagbuokwa onye ahụ mana onye ahụ nwụrụ.

    Mgbe ndị ntọrị a na-achọ isi n’okporoụzọ Ubakala tinye isi n’awara awara si Aba gawa Umuahia ha gbagbukwara otu onye ọkwọọgbatumtum Keke dịka ọ chọrọ igbochiri ha ụzọ.

    Mgbe nke a na-eme ndị mmadụ mechara buru onye ọrụ ụlọakụ ahụ gawa n’ụlọọgwụ mana ọ nwụrụ dịka ọtụtụ ọbara si ya n’ahụ pụọ.

    Isa gara n’ihu ṅụọ iyi na ndị ọrụ ya ga-esi imi n’ala chọpụta ndị kpara arụ a.

  3. Mmadụ iri anwụọla ka ụlọ dara n’Ibadan

    Ebe ụlọ dara n'Ibadan

    Ndị ọrụ gọọmentị Oyo Steeti ekwuola na otu ụlọ dara ada egbuola mmadụ iri ebe mmadụ asatọ ọzọ merụrụ ahụ.

    Ụlọ a dara n’ụbọchị Tọzde 31 Ọktoba, 2024 na mpaghara Jegede dị n’Ibadan isiobodo steetị ahụ.

    Njinji a jiri n’ihe dịka elekere abụọ nke isi ụtụtụ mgbe ndị mmadụ na-ehi ụra.

    Ndị uweoji ekwubeghi kpọmkwem ihe mere ụlọ a jiri daa ma kwuo na ha amalitela ime nyocha banyere ya.

    N’ozi ndị uweojii wepụtara, ha kwuru na ọ bụ mmadụ iri nwụrụ n’otu ntabi anya ụlọ ahụ dachara ebe mmadụ asatọ merụrụ nnukwu ahụ.

    Ụlọọrụ mgbanyụ ọkụ n’Oyo Steeti ekwuola na ha ka na-agba mbọ ịzọpụta ndị ka tọọrọ n’ụlọ ahụ.

    Onyeisi ụlọọrụ ahụ bụ Yemi Akinyinka kwuru na ha nwetere ozi n’ekwentị n’elekere abụọ nke ụtụtụ na otu ụlọ dara ada ebe ọtụtụ ndị mmadụ ka tọọrọ n’ime ya.

  4. Ụlọikpe mkpegharị achabibeghi ikpe kwuru na IPOB bụ otu na-eyi ọha egwu

    Ụlọikpe mkpegharị dị n'Abuja
    Nkọwa foto, Ụlọikpe mkpegharị dị n'Abuja

    Ụlọikpe mkpegharị dị n’Abuja, edobela mkpebi ya maka mkpesa nke ndị Indigenous People of Biafra (IPOB) nwetara banyere ikpe kwuru na ha bụ ndị na-eyi ọha egwu.

    Ka ọ na-agwa ụlọikpe ahụ okwu, onye ọkaiwu ndị IPOB bụ Chukwuma Machukwu Umeh, rịọrịọ ka ụlọikpe nabata mkpesa ha ma kagbuo ikpe ahụ kwuru na ha bụ ndị na-eyi ọhe egwu.

    N’aka nke ọzọ, ọkaiwu gọọmenti etiti kwuru na dịka akụkụ 25(a) iwu iyi ọha egwu nke Naịjirịa na-anọchite anya gọọmentị etiti, kwuru na dịka ngalaba 25 (a) nke iwu iyi ọha egwu siri kwuo, otu ọbụla a kpọrọ otu na-eyi ọha egwu, nwere ikike ịga ụlọikpe mkpegharị maka ịkpegharị ikpe ahụ.

    Ọ gara n’ihu gwa ụlọikpe ahụ ka ọ kagbuo mkpesa ahụ IPOB nwetara n’ihi na ikpe ahụ kọwara ha dịka otu na-eyi ọha egwu bụ nke e kpere n’ụzọ ziri ezi.

  5. Ihe mere ụlọomeiwu nta ji kwuo ka a kagbuo ikike ọdụ ụgbọelu e nyere Bishọpụ Oyedepo

    Bishọpụ Oyedepo na Ụlọomeiwu Naịjirịa

    Ebe foto si, David Oyedepo/House of Representatives/Facebook

    Nkọwa foto, Bishọpụ Oyedepo na Ụlọomeiwu Naịjirịa

    Ụlọomeiwu nta Naịjirịa agwala minista na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Festus Keyamo ka ọ kwụsị inye ndị mmadụ na otu ụlọọrụ dị iche iche ikike ọdụ ụgbọelu.

    Ha gwara ya ka o nnyochaa ma megharịa ikike ọdụ ụgbọelu o nyere Bishọpụ David Oyedepo nke ụlọụka Living Faith Church dị na Canaanland Ota, Ogun Steeti.

    Oku ụlọomeiwu kpọrọ bụ Sulaiman Gumi kwuputara nke a ma kwuo na inye ụdịrị ikike ndị a nwereike inye si azụụlọ ebubata ọgwụ ike, ngwaagha na ihe ndị ọzọ iwu Naịjirịa megidere ohere nke ga-aga n’ihu bute nsogbu ma metụta nchekwa obodo.

    Ọ gara n’ihu kwuo na nke a nwekwara ike ime ka nrụrụaka na mpụ dị iche iche n’amụbawanye.

    Cheta na Bishọpụ David Oyedepo nọrọ ụbọchị Sọnde 6 Ọktoba gwa ndị ụlọụka ya na gọọmenti enyela ya ikike ọdụ ụgbọelu n’ogige ụlọụka ya.

  6. E gbuola otu nwoke na-arụ akpụkpọ ụkwụ n’Aba, Abia Steeti

    Nwoke na-arụ akpụkpọ ụkwụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Nwoke na-arụ akpụkpọ ụkwụ

    Ndị ji egbe atọrọla ma gbuo otu nwoke na-arụ akpụkpọ ụkwụ aha ya bụ Chinaza Nwogu n’Aba, Abia steeti.

    Akụkọ BBC Igbo nwetara kwuru na mmadụ 50 ji egbe, kpuchiri ihu ha, wakporo ọdụ ahịa nwoke ahụ dị na 1 Imo Avenue n’akụkụ 175 B Faulks Rd, Aba ma tọrọ ya.

    E kwuru na njinji a butere ọgbaaghara na mpaghara ahụ ebe enwebeghi onye ma ihe mere e ji tọrọ ma gbuo nwoke ahụ.

    Ndị uweojii steeti ahụ kwuru na akụkọ ahụ bụ eziokwu ma kwuo na oge ha nnyochara ahụ nwoke, a chọpụtara na a gbara ya egbe ebe e ji mma gbujisie ya aka.

    Eburula ozu ya buga n’ọba ozu ebe a ga-anọ nnyocha ya iji chọpụta ihe ndị ọzọ.

    Ụfọdụ ndị ezinaụlọ ya na-achọghị ka a kpọ aha ha kwuru na ọnwụ Chinaza Nwogu juru ha ọnụ n;ihi na ha amaghị ihe nwereike ibute ụdịrị ọdachi a.

    Ha kpọkuru gọọmeti Abia steeti na ndị ọrụ chekwa ka ha gbaa mbọ mee nnyocha ma nwuchie ndị ahụ aka ha dị n’ọnwụ nwanne ha nwoke.

    Ndị bi na mpaghara ahụ kwuru na oteela aka ndị omekome ahụ kpuchiri ihu ha jiri akpa mkpa mkpa na mpaghara ahụ.

    Nwoke ahụ e gburu bụ onye otu United Shoes and Allied Industrial Union, Ariaria International Market, Aba.

  7. Mmadụ 95 anwụọla ebe a na-achọ ọtụtụ ndị ọzọ achọ ka idemmiri wakporo Spen

    Ọtụtụ ụgbọala idemmiri ahụ mebiri

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ọtụtụ ụgbọala idemmiri ahụ mebiri

    Ndị ọrụ gbatagbata na-agba mbọ ịchọta ndị a na-achọ achọ ka idemmiri wakporo ma gbuo mmadụ 95 na mpaghara ndịda mba Spen.

    Akụkọ kwuru na amabeghi mmadụ ole a na-achọ achọ mana e zigala ọtụtụ ndịagha na Valencia ebe idemmiri ahụ kacha metụta.

    Onye ntaakụkọ BBC gara ebe idemmiri ahụ mere gwara anyị na ọ bụ naanị ụgbọelu halikọpta nwereike ịga ebe ahụ maka na idemmiri ahụ mebiri okporoụzọ dị na mpaghara ahụ.

    Cheta na Eze mba Spen bụ Felipe VI kwuru na idemmiri ahụ mebiri ọtụtụ ụlọ, ụgbọala nakwa ihe ndị ọzọ e ji enyere ndụ aka.

    Otu onye bi ebe idemmiri ahụ mere bụ Julian Ormeṅo kwuru na ndị ọchịchị anaghị agba mbọ etu o kwesịrị iji zọpụta ndị a na-achọ achọ.

    Ụgbọala tọrọ n'idemmiri ahụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ụgbọala tọrọ n'idemmiri ahụ
    Ndị ọrụ gbatagbata

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị ọrụ gbatagbata
    Ndị ọrụ gbatagbata na-azọpụta onye idemmiri ahụ metụtara

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị ọrụ gbatagbata na-azọpụta onye idemmiri ahụ metụtara
  8. Ụlọomeiwu Sịnetị akwadoola Bianca Ojukwu na mmadụ isii ndị ọzọ ịbụ mịnịsta

    Bianca Ojukwu

    Ebe foto si, Nigeria Senate / facebook

    Ndị sịneti Naịjirịa enyochaala ma kwadoo ka Bianca Ojukwu na mmadụ isii ndị ọzọ onyeisiala Bola Tinubu họpụtara ịbụ mịnịsta na gọọmenti ya.

    Sịneti mere nyocha ahụ n’ụlọọrụ ha dị n’Abuja ebe ha nọ jụọ Bianca Ojukwu na ndị ọzọ ajuju banyere ọkwa a chọrọ inye ha.

    Ọkwa a họpụtara Bianca Ojukwu bụ ọkwa mịnịsta nta na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ.

    Lee ndị ọzọ a họpụtara na ọkwa ha:

    ·Nentawe Yilwatda - Minista na ahụ maka mmetuta mmadụ na ịbeleta ụbịam

    ·Muhammadu Maigari - Mịnịsta na ahụ maka ndị ọrụ na inye ọrụ

    ·Jumoke Oduwole - Mịnịsta na ahụ maka ụlọ nrụpụta ihe na azụmụahịa.

    ·Yusuf Abdullahi - Mịnịsta nta na ahụ maka mmepe obodo, na ịrụ ụlọ obibi

    ·Suwaiba Said - Mịnịsta nta na ahụ maka agụmụakwụkwọ

    ·Mukhtar Maiha - Mịnịsta na ahụ maka ịkpa anụmanụ

  9. A họpụtala ọchịagha Olufemi Olatubosun n'ọrụ onyeisi ndịagha Naịjirịa

    Olufemi Olatubosun Oluyede

    Ebe foto si, NTA News/X

    Onyeisiala ahọpụtala Ọchịagha Olufemi Olatubosun Oluyede dịka onye ga-arụ ọrụ ka Onyeisi ndịagha Naịjirịa.

    Nke a dị n'ozi ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Tinubu bụ Bayo Ononuga wepụtara na Wenezde.

    Nhọpụta a na-abịa dịka kepu kepu pụtara n'izuụka gara aga kwuru na Onyeisi ndịagha Naịjirịa bụ Taoreed Lagbaja anwụọla.

    Mana ndịagha Naịjirịa wepụtara ozi sị na akụkọ ahụ bụ akụkọ ụgha 'jọgburu udele ma sigbuo nkapị'.

    Ha kwuru na ọchịagha Lagbaja mere njem ahụike a kpọrọ 'medical leave' na Bekee, bụ ebe ọ na-anata ọgwụgwọ.

    Oluyede ga-arụ ọrụ ahụ ruo mgbe Ọchịagha Taoreed Lagbaja ji ọkwa ahụ ga-alọta na njem ahụ.

    Akụkọ ka na-abịa...

  10. Ụlọikpe asịla Alex Mascot Ikwechegh kwụọ N500,000 iji gbapụta onwe ya

    Alex Mascot Ikwechegh

    Ebe foto si, Alex Mascot Ikwechegh / Instagram

    Nkọwa foto, Alex Mascot Ikwechegh

    Ụlọikpe magịe agwala Alex Mascot Ikwechegh kwụọ ego ruru puku narị naira ise (N500,000) iji gbapụta onwe ya.

    Ha nyere ya ohere ahụ mgbe ndị uweojii kpụpụrụ ya n’ụlọikpe maka iti ọkwọụgbọala ihe n’Abuja.

    Ọkaikpe Magie bụ Abubakar Sai’d nyere ya ntọhapụ ahụ ma gwa ya ka o weta ndị akaebe mmadụ abụọ.

    Abubakar kwuru na ndị akaebe ahụ ga-abụ ndị were ego ahụ ma birikwa nso n’ebe ụlọikpe ahụ nwere ikike.

    Ebubo e ji kpọta ya n’ụlọikpe gunyere imebi ugwu dịịrị ụlọọrụ ya, iti mmadụ ihe nakwa iyi mmadụ egwu na ọ ga-egbu onye ahụ.

    Mana Alex Mascot Ikwechegh kwuru na ikpe amaghị ya oge ọkaikpe gụpụtachara ya ebubo niile e boro ya.

    Ọzọkwa, ọkaikpe nọchịtereanya ya rịọrọ ụlọikpe arịrịọ ka a tọhapụ ya, nke mere ụlọikpe jiri nye ya ntọhapụ ahụ ma gwa ya kpọta ndị akaebe mmadụ abụọ.

    Aha ọkwọụgbọala ahụ Alex Mascot Ikwechegh tiri ihe bụ Stephen Abuwatseya.

    Cheta na Alex Mascot Ikwechegh na ọkwọụgbọala ahụ bụ Stephen Abuwatseya were nsogbu ahụ n’ụlọ Alex.

    N’ihe onyonyo, Alex kwetere na ya mara Stephen ụra ugboro abụọ.

    A hụkwara ebe Alex Mascot Ikwechegh nyiri Stephen egwu sị na ya ga-eme ka o ofuo.

    Ndị uweoji na ụlọ ndị omeiwu katọrọ ihe ndị ahụ niile Alex Mascot Ikwechegh mere ma kwenkwa n’iwu Naịjirịa ga-enwere ọnọdụ.

  11. Ụlọikpe eyigharịala ikpe EFCC na Yahaya Bello gaa n’ọnwa Jenụwarị 2025

    Ikpe dị n'etiti ụlọọrụ EFCC na Yahaya Bello

    Ebe foto si, EFCC

    Ụlọikpe Ukwu dị n’Abuja eyigharịala ikpe dị n’ebubo ụlọọrụ na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka bụ EFCC boro Yahaha Bello bụbu Gọvanọ Kogi Steeti ruo ụbọchị 21 Jenụwarị 2025.

    Ụlọọrụ ntaakụkọ Daily Trust kwuru n’ikpe nke ụbọchị Wenezde na ọkaiwu ụlọọrụ EFCC bụ Kemi Pinheiro kpọtara ndị akaebe abụọ ma kwuo ka ụlọikpe gaa n’ihu nabata ha na-agbanyeghi na onye e boro ebubo jụrụ ịbịa zara ọnụ ya. Bello adịla mbụ kwuo na aka ya dị ọcha n’ebubo ahụ.

    Pinheiro kwuru na “ikikere mmadụ ikwu na aka ya dị ọcha adịghị oke mkpa na e nwereike ịnapụta ikikere ahụ”, ma ọ bụrụ na onye ahụ mebie ikikere ya.

    N’aka nke ọzọ, ọkaiwu Bello bụ Michael Adoyi kwuru na ha ekweghi na nke ahụ ma kwuo na arịrịọ ahụ ọkaiwu EFCC na-arịọ megidere mkpebi ụlọikpe.

    N’ikpeazụ, ọkaikpe Nwite kwuru na ọ gaghị adị mfe ịchabi ikpe ahụ n’afọ nke mere o jiri yigharịa ya n’ụbọchị 21 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2025.

    Cheta na ụlọọrụ EFCC boro ebubo na aka Yahaya Bello dị na nrụrụaka nakwa mbupụ ọkpụrụkpụ ego dị ijeri naịra iri asatọ na ụma (N80.2bn) mgbe ọ bụ Gọvanọ na-achị Kogi Steeti.

  12. Anyị ga-akpụpụ Alex Mascot Ikwechegh n'ụlọikpe – Ndị uweojii

    Foto ndị uweojii na Alex Mascot Ikwechegh

    Ebe foto si, Gettyimages/Alex Mascot Ikwechegh/Instagram

    Nkọwa foto, Ndị uweojii na Alex Mascot Ikwechegh

    Ndị uweoji ekwuola na ha ga-akpọpụ omeiwu Alex Mascot Ikwechegh n'ụlọikpe maka iti ọkwọụgbọala ihe.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweoji bụ Olumuyiwa Adejobi mere ka a mata nke a n’akara soshal midia X ya.

    N’okwu ya, “anyị ga-eme ka e kpee Alex Mascot Ikwechegh ikpe maka iti mmadụ ihe”.

    Olumuyiwa gara n’ihu kwuo na ha ga-eweputa ozi niile gbasara ihe ha chọrọ ime omeiwu ahụ n’oge na-adịghị anya.

    Cheta na oge ndị omeiwu nta na-eme ọgbakọ ha n’Abuja, Alex Mascot Ikwechegh rịọrọ mgbaghara maka etu o si kpaa agwa ma tie ọkwọụgbọala ihe.

    Njiri mara ndị uweojii

    Ebe foto si, Olumuyiwa Adejobi/X

    Nkọwa foto, Njiri mara ndị uweojii
  13. Ihe mere ụlọikpe ji machie ụlọakụ etiti ịkwụ Riva Steeti ego ruuru ha site n’akpa gọọmenti etiti

    Gọvanọ Siminalyi Fubara na-achị Riva steeti

    Ebe foto si, Siminalyi Fubara/X

    Nkọwa foto, Gọvanọ Siminalyi Fubara na-achị Riva steeti

    Ọkaikpe Joyce Abdulmalik nke ụlọikpe ukwu dị n’Abuja enyela iwu ka ụlọakụ etiti Naịjirịa ghara ịkwụ gọọmenti Riva steeti ego ruuru ha site n’akpa gọọmenti etiti.

    Ọkaikpe Abdulmalik kwuru na ego gọọmenti etiti na-akwụ Riva steeti nke Gọvanọ Siminalyi Fubara na-achị kemgbe ọnwa Jenụwarị 2024 ruo ugbua, bụ nke megidere iwu ma nye iwu ka a kwụsị ya.

    Ọkaikpe ahụ gara n’ihu kwuo na Budget steeti ahụ nke Gọvanọ Fubara gụpụtaara naanị mmadụ anọ ụlọomeiwu steeti ahụ, bụ nke na-ama iwu Naịjirịa aka.

    Ọ gwara ụlọakụ etiti na onye na-agụkọrọ gọọmenti ego nakwa ụlọakụ Zenith na Access ka gbochie Gọvanọ Fubara imetu ego Riva steeti dị n’ụlọakụ aka.

    Cheta na Gọvanọ Fubara na aka chibụru steeti ahụ bụ Nyesom Wike na-enwe esemokwu kemgbe ụfọdụ ndị omeiwu 25 steeti ahụ siri na pati PDP a nọrọ họpụta ha ma febanye na pati APC.

    Agwa a mere ka Gọvanọ Fubara kagbuo oche ha dịka ndị omeiwu steeti ahụ.

    Nsogbu dị na steeti ahụ ebutela ọtụtụ ọgbaaghara nke gụnyere ngagharịiwe e mere tupu e mee ntụliaka okpuru ọchịchị na steeti ahụ ụbọchị Satọde 5 Ọktoba 2024.

  14. Ndị uweojii Imo Steeti egbuola otu onye omekome n’Owerri

    Onye omekome ahụ ndị uweojii gbagburu na ụgbọala e nwetara n'aka ha

    Ebe foto si, Imo State Police Command

    Nkọwa foto, Onye omekome ahụ ndị uweojii gbagburu na ụgbọala e nwetara n'aka ha

    Ndị uweojii Imo steeti egbochiela mwakpo ndị a na-eyo enyo na ha bụ ndị otu IPOB na ESN n’okporoụzọ so Owerri gawa Aba dị n’akụkụ ọdọ ụgbọelu dị n’Owerri.

    Osi anyị nwetara n’aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Henry Okoye kwuru na ndị uweojii omekome ahụ ruru 10, ji ụgbọala abụọ nwee chọọ ịwakpo mpaghara ahụ.

    Ozi ahụ kwuru na ndị uweojii gburu otu onye omekome ahụ oge kwatara mgbọ ebe ndị otu ya ndị ọzọ bu ọnya mgbọ egbe gbanarị ma hapụ ugbọala abụọ ahụ.

    Okoye kwuru na ngwa agha ha nwetara n’aka ndị omekome ahụ gụnyere ọkọlọtọ ndị IPOB na ESN, otu egbe Ak-47 na ọtụtụmgbọ egbe dị iche iche.

    Okoye gara n’ihu kwuo na ndị uweojii na-aga n’ihu ime mkpocha na nzacha n’ime ọhịa niile dị na mpaghara iji nwuchie ndị omekome ahụ gbara ọsọ.

    Kọmishọna ndị uweojii steeti ahụ bụ Aboki Danjuma kpọrọ oku ka ọhanaeze na ụlọọgwụ dị na steeti ahụ kkpọtụrụ ụlọọrụ ndị uweojii ma ọ bụrụ na ha hụ onye ọbụla bu ọnya mgbọ egbe.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ndị uweojii steeti ahụ kwụrụ chịm ibu agha megide ndị omekome ma nweta ezi nchekwa na steeti ahụ.

  15. EFCC anwụchiela mmadụ anọ na-eji ịntaneti e zuru ego dị n’ụlọakụ n’Abuja

    EFCC anwụchiela mmadụ anọ na-eji ịntaneti e zuru ego dị n’ụlọakụ n’Abuja

    Ebe foto si, EFCC

    Ndị ụlọọrụ Enonomic and Financial Crime Commision (EFCC) ekwuola na ha nwụchiri mmadụ anọ ha na-enyo enyo na ha na-eji igwe ntaneti ezuru ego ndị mmadụ were n’ụlọakụ n’Abuja.

    Dịka akwụkwọ ozi ndị EFCC deputara n’akara X soshal mịdịa ha, ha kwuru na mmadụ anọ ndị ahụ na-abanye n’igwe kọmpụta ndị ụlọakụ ma were ego ndị mmadụ tinyere n’ime ya.

    Aha mmadụ anọ ndị ahụ gunyere Mohammed Bello Mahmud, Chima Anthony Nwigwe, Effiong Victor Emmanuel, na Daminan Ali.

    EFCC kwuru na “anyị wuchiri mmadụ anọ ndị a mgbe anyị nwetere ozi gbasara ka ha sị awakpo kọmpụta ụlọakụ dị icheiche ma were akụrụ ngwa dị icheiche na-adọrọ ego ndị mmadụ dobere n’ụlọakụ”

    Ha gara n’ihu kwuo na mmadụ anọ ndị ahụ ga-eje n’ụlọikpe ga zara ọnụ ha.

  16. Alex Mascot Ikwechegh arịọla mgbaghara maka ịkpagbu ọkwọụgbọala

    Mascot Ikwechegh

    Ebe foto si, Mascot Ikwechegh/Facebook

    Omeiwu na-anọchite anya Aba North & South n'Ụlọomeiwu Nta bụ Alex Mascot Ikwechegh arịọla mgbaghara maka ịkpagbu onye ọkwọụgbọala ọ kpagburu na nso nso a.

    Na nso nso a, ihe onyonyo fegharịrị na soshal media gosiri ebe Ikwechegh mara ọkwọụgbọala a kpọrọ Stephen Abuwatseya ụra ugboro ugboro na maja , si na o nwere ike imemilanwụ ya nke kpalitere iwe ọha ndịmmadụ na soshal midia.

    Mana n'ozi ya n'Ụlọọmeiwu n'ụbọchị Tuzde, gosiri omiiko ma kwuo n' agwa ya kpasara Abuwatseya egosighị eziakwa dịka nwamala na onye nnọchite anya ndị mmadụ.

    " Emejọrọ m. Ana m arịọ mgbara maka okwu na ihe m mere "

    Ikwechegh, onye rịọkwara ndị ụlọọmeiwu, Onyeisi ndịuweojii na ụmụ Naijiria nile mgbaghara, gara n'ihu gbaa ama na ya na Stephen Abuwatseya ekpeziela.

  17. Ụlọomeiwu eyigharịala ọgbakọ nnyocha ndị minista ọhụrụ

    Mmadụ asaa ahụ a họpụtara dịka minista ọhụrụ

    Ebe foto si, Socials

    Nkọwa foto, Mmadụ asaa ahụ a họpụtara dịka minista ọhụrụ

    Ụlọomeiwu Sineti Naịjirịa eyigharịala ọgbakọ nnyocha mmadụ asaa ahụ onyeisiala Bola Tinubu maka minista.

    Ha kwuru na nyigharị a bụ iji nye mmadụ asaa ahụ ohere iji kwado akwụkwọ na ihe ndị ọzọ a ga-eji mee ha nnyocha.

    Mmadụ asaa ahụ gụnyere Bianca Odimegwu Ojukwu - Minista nta na-ahụ maka mmekọ mba ofesi, Jumoke Oduwole – Minista na-ahụ maka ụlọ mmepụta na azụmahịa

    Ndị ọzọ bụ Nentawe Yilwatda - Minista na-ahụ maka ndị ụwa na-atụ n’ọnụ na igbochi ụbịam, Muhammadu Maigari Dingyadi - Minista na-ahụ maka ndị ọrụ na inwe ọrụ, Idi Mukhtar Maiha - Minista na-ahụ maka mmepụta anụmanụ, Yusuf Abdullahi Ata - Minista nta na-ahụ maka mmwụlite ụlọ na mmepe obodo, Suwaiba Said Ahmad Minista nta na-ahụ maka agụmakwụkwọ

    Cheta na e zigala aha mmadụ asaa ahụ onyeisiala Tinubu họpụtara n’ụlọọrụ DSS maka nchọpụta nakwa nnyocha tupu ụlọomeiwu Sineti eme nnyocha ikpeazụ.

    Akụkọ kwuru na ọgbakọ nnyocha ahụ ga-abụzi ụbọchị Wenezde, 30 Ọktoba, 2024.

  18. Hezbollah enweela onyeisi ọhụrụ

    Naim Qassem onyeisi ọhụrụ Hezbollah

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Naim Qassem onyeisi ọhụrụ Hezbollah

    Hezbollah ahọpụtala Naim Qassem dịka onyeisi ọhụrụ ha.

    Qassem ga-anọchi onye bụbu onyeisi Hassan Nasrallah ogbunigwe mba Izrel gburu na Beirut n’ọnwa Septemba 2024.

    Naim Qassem so na ndị isi Hezbollah ka dị ndụ n’agbanyeghi na mwakpo Izrel egbuola ọtụtụ n’ime ha.

    Ka ọ ugbua enweghị onye ma ebe Qassem bi mana akụkọ na-ekwu na o bi na mba Iran.

    Ozi Hezbollah wepụtara mere ka a mata na ha soro usoro ndị okpukperechi alakụba iji họpụta onyeisi ọhụrụ ahụ iji kwanyere Sayyid Hassan Nasrallah na ndị otu ha nwụgoro anwụ ugwu.

  19. Ndị omeiwu nta agbarụọla ihu maka omume Alex Mascot Ikwechegh

    Ụlọ ndị omeiwu nta nakwa Alexander Ikwechegh

    Ebe foto si, Benjamin Okezie Kalu/Alex Mascot/Facebook/Instagram

    Ụlọ omeiwu nta nke Naịjirịa agbarụọla ihu maka omume onye otu ha bụ Alexander Mascot Ikwechegh nke na-ewu ewu ebe niile.

    N'ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia nke mere ka iwe ndị mmadụ kpalie elu, Ikwechegh nọ ebe ahụ na-amaja otu nwoke na-arụ ọrụ ọkwọụgbọala, ọ gwara nwoke ahụ "m ga-eme ka ị fuo, o nweghi ihe ga-eme na Naịjirịa niile".

    N'ozi ndị ụlọomeiwu nta wepụtara nke Akin Rotimi bụ onụ na-ekwuru ha binyere aka, ha katọrọ omume ahụ ma kwuo na ọ bụghị omume e ji mara ha bụ ndị omeiwu.

    Ha gara n'ihu kwuo na ha ga-agbado anya n'ilebanye ụdịrị omume ahụ anya ngwangwa ma gwa ndị mmadụ ha nye ndị uweojii ohere ịrụ ọrụ ha dịka okwu ahụ nọzi n'aka ndị uweojii ugbua.

    N'otu aka ahụ, Ikwechegh n'onwe ya arịọla mgbaghara maka ihe mere.

  20. Aka ndị uweojii akparala nwatanwaanyị tụrụ asị gbasara ọnwụ ya n’Imo steeti

    Aka ndị uweojii akparala nwatanwaanyị tụrụ asị gbasara ọnwụ ya n’Imo steeti

    Ebe foto si, Imo State Police command

    Ndị uweojii Imo steeti anwụchiela nwa akwụkwọ mahadum Imo State University (IMSU) gbara afọ iri na asaa (17) aha ya bụ Jesse Chidebere maka ịtụ asị na ndị ntọrị tọọrọ ya ma gbuo ya.

    Ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye wepụtara n’ụbọchị Mọnde 28 Ọktoba 2024 kwuru na ọ bụ ngalaba ụlọọrụ ndị uweojii dị n’Orji nwuchiri Chidiebere.

    Okoye kwuru na ndị uweojii natara ozi gbatagbata mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere iri nke abalị n’ụbọchị Satọde 26 Ọktoba 2024 na Chidiebere na-efu efu.

    Ozi e nwetara n’akara ọbaozi Whatsapp ya kwuru na ndị ntọrị atọrọla ma gbuo ya ma gwa ezinaụlọ ya ka ha gaa n’ụlọọrụ ndị uweojii dị n’Orji iji chọpụta gbasara nke ahụ.

    Ọnọdụ ahụ mere ka ndị uweojii banye n’ọrụ ozugbo mana ka chi bọrọ, ha chopụtara na Chidiebere dị ndụ n’ihi na ọ bụ ojoro ka o ji ozi ụgha ahụ gwuo na soshal midịa.

    Ka o sinadị, ndị uweojii amalitela ime nnyocha iji chọpụta ihe mere Chidiebere ji mee omume dị etu ahụ dịka a ga-ekpe ya ikpe oge e mechara nnyocha.

    Aka ndị uweojii akparala nwatanwaanyị tụrụ asị gbasara ọnwụ ya n’Imo steeti

    Ebe foto si, Imo State Police command