Ihe anyị ma maka ebubo na Umahi nyere ndị agha iwu ka ha pịa ndị ọrụ bekee ụtalị

Ebe foto si, Dave Umahi/Facebook/Getty Images
Otu onyonyoo na-efegharị na soshal midịa Naịjirịa ugbua, ọ kachasị na Twitter, nke na-ekwu na Gọvanọ Ebonyi Steeti bụ Dave Umahi nyere ndị agha na-eche ya nche iwu ka ha pịa ndị ọrụ 'civil servant' ụtarị koboko.
Ndị na-ekesa onyonyo ahụ na-ekwu na ọ bụ oge Umahi gara ileta ka ọrụ si aga n'otu ebe, ka ọ gwara ndị agha ka ha pịa ndị ọrụ oyibo niile na-abịaghị n'oge ụtarị.
Ndị mmadụ ekiriela otu n'ime onyonyoo ahụ ihe ruru ugboro 111,600 na Twitter, mana gọọmentị Ebonyi steeti akọwaala na ya bụ akụkọ abụghị eziokwu.
Nkọwa gọọmentị Ebonyi nyere maka ya bụ ihe

Ebe foto si, Uchenna Orji/David Umahi/Facebook
Kọmishọna mgbasa ozi Ebonyi steeti bụ Uchenna Orji wepụtara akwụkwọ ozi iji kọwaa maka ya bụ onyonyoo na-efegharị.
Orji kwuru na ya bụ onyonyo bụ nke adigboroja, nke "ndị iro ọganihu na-ekesa" iji metọọ aha gọvanọ Umahi.
Nkọwa Uchenna Orji nyere maka onyonyo a bụ ndị a:
- Ebe ihe a mere bụ n'ihu ụzọ e si abanye ọdọụgbọelu ọhụrụ nke gọọmentị Ebonyi steeti na-arụ, ọ bụghị n'ihu ụzọ ụlọ gọọmentị dịka akụkọ si ekwu
- Enweghị ndị ọrụ bekee e nyere ọrụ n'ọdọụgbọelu a na-arụ ọhụrụ, nke pụtara na onweghị onye ọrụ 'civil servant' a pịara ihu n'ebe ahụ.
- Ọ bụ ndị agamevu na-achọ ịmanye ndị mmadụ ka ha nọrọ n'ụlọ ka ndị agha chụsara
- Ndị agamevu a achọbuola ịkwụsị ọrụ nke na-aga n'ihu n'ọdọ ụgbọelu ahụ n'oge gara aga mana atụmatụ ha enweghị isi
- Mbọ niile ndị iro na-agba iji chuo Gọvanọ David Umahi aha maọbụ metọọ ọrụ ya agaghị amịtara ha mkpụrụ
- Ndị mmadụ etinyela uche ọbụla n'ihe onyonyo ahụ na-efegharị maka na ọ bụghị eziokwu.

Ebe foto si, Screengrab
Ihe onye nọ nso kwuru
Otu onye nọ nso hụchatara ihe merenu gwara BBC Igbo na onyonyo ahụ abụghị adigboroja, kama na ọ bụghị ndị ọrụ 'civil servant' ka ndị agha pịara ụtarị.
Onye a na-achọghị ka anyị kpọpụta aha ya kwukwara na ọ bụghị n'ihu ebe e si abanye 'government house' ka ya bụ ihe mere, kama ọ bụ n'ihu ọdọụgbọelu a ka na-arụ arụ.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ ndị na-arụ ọrụ n'ọdọ ụgbọelu ahụ, ndị na-abịaghị n'oge n'ụbọchị gọvanọ gara nleta ebe ahụ.
N'oge gara aga...
Aha Gọvanọ David Umahi wukwara ewu n'ọnwa Eprel 2020, oge o yiri ndị ntaakụkọ egwu na ọ ga-apịa ha 'koboko'.
Umahi nyere mmaja a n'ihi akụkọ nke ndị ntaakụkọ abụọ bụ Chijioke Agwu na Peter Okutu dere gbasara etu ọrịa Lassa Fever si egbu ndị mmadụ n'Ebonyi steeti.
O kwuru sị: "Ụnụ bụ ndị ntaakụkọ chere na ụnụ nwere mkpịsị odee, mana anyị onwe anyị nwekwara koboko".
Koboko bụ ụdị ụtarị e ji achịkwa ụmụ anụmanụ.
Umahi mechara kwuo na ya amachiela ndị nta akụkọ abụọ a ịbata n’ụlọ gọọmentị ruo mgbe ebighị ebi.
Nke a mere ka ndị otu 'Citizens Advocacy for Social and Economic Rights' (CASER) kpọọ oku ka ndị ọchịchị mbaụwa nye Umahi ntaramahụhụ maka imegide ikike dịịrị mmadụ.










