Ndị uweojii Ebonyi Steeti ekwuola okwu banyere ihe onyonyo ahụ ebe a na-abọkasị ozu mmadụ

Njirimaara ndị uweojii Ebonyi Steeti na ihe onyonyo ebe ndị mmadụ na-abọkasị ozu mmadụ.

Ebe foto si, Ebonyi State Police Command

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndị uweojii Ebonyi ekwuola na ha maara maka ihe onyonyo ahụ ebe ndị mmadụ na-abọkasị ozu mmadụ nke a sị mere na steeti ahụ.

N'ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Joshua Ukandu ziteere BBC Igbo, o kwuru na ha amalitela ime nnyocha banyere ihe ọjọọ ahụ.

"Ụlọọrụ anyị maara maka ihe onyonyo ahụ na-efegharị na soshal midia nke gosiri ebe a na-abọkasị ozu mmadụ. Anyị na-eme nnyocha banyere agwa ọjọọ ahụ.

"Anyị na-ekwe ndị Ebonyi steeti nkwa na anyị na-agbasi mbọ ike ịchọpụta ihe butere ihe onyonyo ahụ ma taa ndị aka ha dị na ya ahụhụ."

Etu ihe onyonyo ahụ si malite ifesasị

Ihe onyonyo ebe ndị mmadụ na-abọkasị ahụ mmadụ.

Ebe foto si, Screenshot

Otu ihe onyonyo malitere ifesa aghara aghara na soshal midia nke na-egosi ebe ọtụtụ ụmụnwoke na-abọkasị ozu onye nwụrụ anwu.

O nweghi onye maara kpọmkwem ma ọ bụ ndị ahụ gburu onye ahụ, ebe ihe onyonyo ahụ si malite ifesa maọbụ ndị ụmụnwoke ahụ bụ.

Ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na o mere n'Ebonyi Steeti.

Gịnị dị n'ihe onyonyo ahụ?

Ihe onyonyo ahụ gosiri ụmụnwoke karịrị ihe dịka iri, ọkachasị na ndị ntoroọbịa ka ha gbakọtara ọnụ.

Ụfọdụ n'ime ndị a ji mma na-ebekasị ihe dịka ozu mmadụ, gụnyere aka abụọ, ụkwụ ya, ime afọ nakwa akụkụ ahụ ndị ọzọ.

Dịka ha na-eme nke a, ọtụtụ ndị ọzọ n'ime ha kwụụ ọtọ na-ekiri ka a na-ebekasị ozu ahụ.

Otu n'ime ndị a mechara bulie isi onye ahụ a na-ebekasị ahụ ya, bụ nke gosiri na onye ahụ bụ nwoke ka a na-ebekasị ozu ya.

Kedụ ihe BBC chọpụtara?

Onye BBC Igbo gbara ajụjụọnụ bụ nwafọ Ebonyi Steeti kwuru n'eziokwu na asụsụ ụmụokoroọbịa ahụ na-asụ bụ asụsụ ndị Ikwo nke Ebonyi Steeti.

Ikwo bụ okpuruọchịchị kachasị ukwuu n'Ebonyi Steeti n'Ebonyi Steeti, ọ dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nke steeti ahụ ma nwee okeala na Cross Rivers Steeti.

Onye a gwara BBC Igbo sị na ụfọdụ ihe ndị a kwuru n'ihe onyonyo ahụ gụnyere;

"Biko kee ya ọfụma. Isi ya dị mma oriri."

Onye ọzọ chịrị ọchị ma kwuo: "Anụ ndị a bụ otu narị naịra, otu narị naịra. Jizie ya ọfụma ka m nwee ike igbubi ya."

"Kedụ nke i nyere Papa?"

"Ụfọdụ anụ a kwesịrị ịbụ puku naịra iri na ise."

Otu onye n'ime ha gburu opi, ebe ndị ọzọ tiri mkpu ọṅụ 'Huuuuuuu!'

Mana a matabeghi kpọmkwem obodo dị n'Ikwo ihe a mere mana ọtụtụ ndị mmadụ na-enwe mgbagwoju anya banyere nke a dịka onye ọzọ gwara BBC Igbo okwu si kọwaa.