Ihe anyị ma maka onyonyoo ndị JTF na-anapụ ndị njem ego n'Imo Steeti

Ndị orụ nchekwa na ndị njem

Ebe foto si, Screengrab

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị uweojii Imo Steeti ekwuola na ha anwụchiela ndị uweojii na ndịagha na-anapụ ndị njem ego na 'Seven and Half Junction' dị n'Okpuru Ochịchị Obowo dị n'Imo Steeti.

Nke a na-abịa dịka ọha mmadụ na otu dị iche iche katọrọ agwa ndị ọrụ nchekwa kpasara ndị njem n'ihe onyonyo fegharịrị na soshal midịa na nso nso a.

Otu 'Stand For Humanity' katọrọ ihe ha kpọrọ mmekpaahụ megidere ikike dịịrị onye, nke ụmụamala Naijiria bụ ndị ha sirị na ndị uweojji nọ na Seven and Half nọ na okporoụzọ si Owere gawa Umuahịa na-eme, ma kpọọ oku na, "ndị uweojii nọ n'ihe onyonyo ahụ na-ewu ewu kwesịrị ka a nwụchie ma kpee ha ikpe."

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo Steeti bụ Henry Okoye kwuru n'akwụkwọ mgbasaozi o binyere aka ma wepụta n'ụbọchị Satọde 13 Disemba 2025, na ha anwụchiela ndị ọrụ nchekwa JTF niile nọ n'ihe onyonyoo ahụ na-efegharị.

Ozi ahụ sịrị: "Banyere ihe onyonyo metụtara ndị ọrụ JTF n'Obowo, a nwụchiela ndị niile nọ ọrụ n'Obowo a hụrụ n'ihe onyonyoo ahụ fegharịrị."

Okoye gara n'ihụ sị, "E meecha nnyocha, a ga-enyefe onye ọbụla n'aka otu nchekwa ọ nọ na ya."

Joint Task Force (JTF) bụ otu nchekwa pụrụ iche nke gụnyere ndị uweojii, ndịagha nakwa ndị Sịvụl dịfensị.

Na nsonso a, mkpesa malitere rịwa ibe ya elu gbasara etu ndị ọrụ ncheka si emekpa ndị njem ahụ, ma na-arụ ọrụ e zighị ezi na 'Seven and Half Junction' nakwa Amanze Junction, dị n'Obowo.

Gịnị dị n'ihe onyonyo na-ewu na soshal midịa?

Ndị orụ nchekwa na ndị njem

Ebe foto si, Screenshot

Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia gosiri ebe onye uweojii na-enyocha ekwentị ndị ntoroọbịa.

Ọzọ gosiri oge otu onye ọrụ nchekwa jichiri kọmputa mpanụkwụ nke otu onye njem.

Ọzọ gosiri ka otu onye nchekwa na-ajụ ogbo ya ma o nwetala ekweozi si n'ụlọakụ maka ego ha napụtara otu onye njem, sị: "I nwetala ego ahụ?"