Chinedu Agu: Ihe anyị ma maka Ọkaiwu a tụnyere na mkpọrọ maka ebubo ịkatọ Gọvanọ Imo steeti

Chinedu Agu na Hope Uzodimma, aka na-achị Imo steeti

Ebe foto si, Chinedu Agu/Hope Uzodimma

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụlọikpe Ukwu Etiti nọ n'Owere nyere ntụziaka n'ụbọchị Tọzde ka a tọhapụ otu nwoke a kpọrọ Chinedu Agụ ka o si n'ụlọ na-abịa n'ikpe metụtara ebubo imebi aha Gọvano Imo steeti bụ Hope Uzodimma site n'ihe o dere n'ọbaozi Facebook.

Dịka akụkọ ahụ na-akpọtụ na soshal midịa, ọtụtụ na-ajụ, kedụ ebe mmiri si banye opi ụgbọgụrụ?

Lee ihe BBC Igbo ma maka okwu ahụ mere ka mmiri ju awọ ọnụ:

Ọkaiwu Chinedu Agu

Ebe foto si, Chinedu Agu/Facebook

A kpụpụrụ Ọkaiwu Chinedu Agu gbara afọ iri atọ na asatọ (38) n'Ụlọikpe Majie dị n'Owere maka ebubo imebi aha mmadụ nakwa ịkpa agwa nwere ike ibute ọgbaghara n'Imo steeti.

N'akwukwọ ikpe ahụ nke bu akara :No:0W/c/2025 bụ nke Kọmishọna ndị uweojii Imo State gbara Agu boro ebubo na Agu dere n'ihu akwụkwọ ya ihe nwere ike "ịkpalite ndị Imo megide gọvanọ ha bụ Hope Uzodimma na ndị imeobi ya", sị na nke a megidere iwu na-ebu agha megide mpụ intanet nke afọ 2024 (Cybercrime Prohibition/Prevention Amendment Act 2024) .

Mana ndị Ọkaiwu na-anọchite Agu kwuru na ikpe amaghị ya.

Kama dịka okwu ahụ no n'Ụlọikpe Majie bụ ebe Ọkaikpe Majie kwuru na ya enweghị ikike ikpe ikpe ahụ ma nye ntuziaka ka edowe Agu na mkpọrọ, ndị ọkaiwu na-anọchite anya nwaamadi ahụ, gbara akwụkwọ n'Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Owere ma rịọ ka a tọhapụ ya na-egbughị oge.

Etu okwu si malite

N'abalị 29 nke ọnwa Ọgọst afọ 2025, Chinedu Agu dere ozi n'ihu akwụkwọ 'Facebook' nke isiokwu ya bụ: Anyammiri site n'Enugwu: Ndekọ ihe obi mgbawa nke onye Ọkaiwu hụrụ site na steeti na-aga aga gaa na steeti dakpọrọ adakpọ".

N'edemede ahụ, Agụ onye bụ Ọkaiwu nakwa odeakwụkwọ otu jikọrọ ndị Ọkaiwu Imo steeti kọrọ akụkọ gbasara ihe ọ hụrụ dịka o mere njem abalị 10 n'Enugwu steeti were jiri ya tụnyere ihe ọ na-ahụ n'Owere isiobodo Imo Steeti bụ ebe o bi.

N'ozi ahụ, Agu toro ọnọdụ okporoụzọ, nchekwa, ọnọdụ ụlọikpe nakwa etu ngalaba gọọmentị dị iche iche n'Enugwu steeti si aga siriri werere ma jụọ sị, "Gịnị mere anyị n'Imo?", ma kpoo oku ka gọọmentị Imo steeti ṅomie ihe na-eme n'Enugwu.

Akwụkwọ ịkpọ oku ndị uweojii Imo steeti

Ebe foto si, Chinedu Agu/Facebook

Mana Kọmọshọna ndị uweojii Imo steeti kpọrọ Agu oku n'ụlọọrụ ha site n'akwụkwọ ozi ụlọọrụ ya dere n'abalị asatọ nke ọnwa Septemba afọ 2025 ka ọ bịa zara ọnụ ya n'ebubo mpụ, imebi aha nakwa ịkpasa udo.

Akwụkwọ ozi ahu nke Osote Kọmịshọna Ndịuweojii Imo bụ Hamman Joda Barka binyere aka, gwara Agu ka ọ wụchie n'isiụlọọrụ ha dị n'Owere maka agbamajujụọnụ n'ụbọchị Wenezde, abalị 17 nke ọnwa Septemba.

Onye bụdị Chinedu Agu?

Chinedu Agu

Ebe foto si, Chinedu Agu/Facebook

Chinedu Agu bụ onye Ọkaiwu nakwa onye ochee goolu otu egwu bọọlụ NBA FC nke Owere.

Ọ gụrụ maka iwu na mahadum "Notthingham Trent University' di na Briten ma gụkwaa maka edemede (Creative Writing) na mahadum 'University of Hull n'otu ebe ahụ.

Nwaamadi ahụ bụ ya nwe ụlọọrụ iwu ọ kpọrọ 'Credo Legal'.