Lee etu ọnọdụ mpaghara Okigwe dị dịka ndị nchekwa malitere ọrụ ikpocha na ịzacha ndị omekaome

Mgbe ndị uweojii na-epogharị n'ime ọhịa dị n'Okigwe ịchọ ndị ojiegbe na-akpa ike ebe ahụ.

Ebe foto si, Imo State Police Command

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ụfọdụ ndi bi n'obodo Okigwe akọwaala etu ọnọdụ ha dị na ihe gọọmenti nwereike ime iji kwụsị ogbugbu na ntọrị ndị mmadụ na-arị ibe ya elu na mpaghara ahụ.

Nke a na-abịa dịka ndị ọrụ nchekwa kwuru na ha wụbatara na mpaghara ahụ iji buo agha megide ndị ojiegbe na-akpa ike n'ebe ahụ.

BBC Igbo kpọtụụrụ ụfọdụ ndị obodo ahụ ị maara ka ọnọdụ obodo ha dị ugbua kamgbe ndị uweojii batara.

Otu onye si n'obodo dị n'Okigwe na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ndị mpaghara Okigwe chọrọ nnukwu enyemaka gọọmenti na ndị ọrụ nchekwa.

O kwuru na ọ bụ eziokwu na ndị ọrụ nchekwa na-agbalị ugbua kama na ha kwesịrị ịtọ ntọala, gbaa mgbọrọgwụ ma biri ebiri na mpaghara ahụ iji nwee ike merie n'ọgụ a.

O kwukwara na ụfọdụ ihe ndị mere ka ọ raa ahụ ichụpụ ndị ojiegbe na-akpa ike n'Okigwe bụ maka na ndị ọrụ nchekwa anaghị abịa biri ebiri, na ihe ha na-eme bụ ha bịa rụọrọ ha alaa.

"Mgbe ọbụla ndị nchekwa bịara ndị ojiegbe na-agba ọsọ gbaba n'ime ime oke ọhịa gaa zoo mana mgbe ndị nchekwa lara ha apụta bịa na-akpa ike.

"Ọ bụrụ na ndị nchekwa a ga-abịa biri ebiri n'obodo ndị dị n'Okigwe, si ebe ahụ na-achụ ndị ojiegbe a, ọ ga-eme ka ha gbaa ọsọ."

Mgbe ndịisi ndị uweojii n'Imo Steeti na-enye ha ntuziaka tupu ha amalite ọrụ n'Okigwe.

Ebe foto si, Imo State Police Command

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị nchekwa kwesịrị iweta ụgbọelu helikọpta iji chụpụta ndị ojiegbe a n'ime oke ọhịa ha zoro.

O kwuru na ọtụtụ obodo dị n'Okigwe dịka Aku, Agbogwu, Umuawaibu, Umulolo, Amuru, Ezinnachi chọrọ ezigbo enyemaka na gbapụta site n'aka ndị ojiegbe a.

Onye ọzọ na-achọkwaghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ọzọ obodo ndị dị n'Okigwe emebichaala na o so n'ihe mere nchekwa jiri dị ọjọọ.

O kwuru na ụgbọala ndị nchekwa anaghị aganwu n'ọtụtụ ụzọ dị n'obodo ndị a nke mere na ha enweghi ike iru ebe ndị ojiegbe na-ezo.

Ọ rụrụ ka gọọmentị gbatara ha ọsọ enyemaka n'ịhụ na a rụrụ ụzọ ndị a, bụ nke ga-enye aka belata ọnọdụ nchekwa dị njọ.

BBC ka na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ ndị uweojii etu ọrụ ha na mpaghara Okigwe si aga.

Ọnụ na-ekwuru ha n'Imo Steeti bụ Henry Okoye azabeghi oku a kpọrọ ya n'ekwentị tupu akụkọ a pụta.

Akụkọ ka na-abịa...

Ndị nchekwa amalitela ibuso ndị ojiegbe a na-enyo bụ IPOB/ESN agha n'Okigwe

E gbuola mmadụ ise n’Okigwe dịka ndị uweojii kwuru na ha amalitela nzacha na mkpocha ndị IPOB/ESN a na-enyo enyo

Ebe foto si, Screenshot

Ndị ojiegbe a na-amatabeghị ndị ha bụ egbuola mmadụ ise ma bibie ọtụtụ ngwongwo oge ha wakporo obodo Ajanaumuna Ezinachi dị n'okpuru ọchịchị Okigwe n'Imo steeti.

Akụkọ anyị nwetara kwuru na ọ bụ n'abalị Fraịde 22 Ọgọst, 2025 ka ha bụ ndị ekperima mere mwakpo ọjọọ ahụ.

Otu ihe onyonyoo fesara n'ikuku gosiri mkpamkpa ọjọọ ndị omekome ahụ kpara oge ha mere ya bụ mwakpo ma gosikwa ụfọdụ ozu ndị e gburu egbu na ụlọ ndị a lara n'iyi.

Dịka ozi anyị nwetara siri kwuo, mmadụ ndị e gburu oge e mere mwakpo ahụ gụnyere Onyeisi obodo Ajanaumuna Ezinachi Okigwe bụ Ejike Nwankwo.

Ha gbukwara onye bụbu Onyeisi obodo Ajanaumuna Ezinachi Okigwe bụ Emeka Eziagwula na nwunye ya, ma gbaa ụlọ ha ọkụ.

Ha bụ ndị ekperima gara n'ihu gbaa onyendu ndị ntoroọbịa na-ahụ maka nchekwa n'obodo ahụ bụ George Edeh egbe ọjọọ, mụnye ụlọ ya ọkụ ma bibie ọgbaatumtum ise.

Pịa aka ebe a ka i soro Whatsapp Chanelụ anyị
Nkọwa foto, Pịa aka ebe a ka i soro Whatsapp Chanelụ anyị

Na mbụ ka a hụrụ George Edeh bụ onyeisi Okigwe Youth Vigilante (special squad) n'ihe onyonyoo fesara na soshal midịa, ebe ọ na-ama Angel Make-Up na Gentle D'Yahoo aka n'ihu.

Ọ gwara ha kwụsị igbusị ụmụ mmadụ n'ụdị na ha na-achọ nnwereonwe Bịafra n'ihi na nke ahụ abụghị ebumnobi ndị mbụ lụrụ agha Bịafra.

N'ihe onyonyoo ahụ, Edeh rụtụrụ aka n'obodo ndị ụfọdụ a ma ama na-achọ nnwereonwe Bịafra, ma kwuo na ha nwere nchekwa karịa Okigwe.

Ọ gwara Angel Make-Up na Gentle D'Yahoo ka ha pụta n'ọgbọ maa ya aka n'ihu karịa ịdị na-eyija ma na-egbu ụmụ mmadụ aka ha dị ọcha.

Ihe ndị uweojii Imo steeti kwuru

Ihe ndị uweojii Imo steeti kwuru

Ebe foto si, Imo State Police Command

Kọmịshọna ndị uweojii n'Imo steeti bụ Aboki Danjuma ezipụla ndị uweojii pụrụiche ka ha na ụlọọrụ nchekwa ndị ọzọ na ndị nche obodo jikọta aka kpochapụ ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị otu IPOB na ESN.

Nke a dị n'ozi, ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ ndị uweojii n'Imo steeti bụ Henry Okoye wepụtara n'ụbọchị Mọnde 25 Ọgọst, 2025.

A na-ekwu na aka ndị otu IPOB na ESN dị na mwakpo ọjọọ e mere na nso nso a n'Ajanaumuna, Ezinachi dị n'okpuru ọchịchị Okigwe, bụ nke tara isi mmadụ ise n'ụbọchị Fraịde 22 Ọgọst, 2025.

Ozi ahụ kwuru na a gbara otu onye nchekwa obodo aha ya bụ George Edeh egbe ọjọọ, tinyere ndị obodo anọ gụnyere ụmụnwaanyị abụọ. Ha bụ Emeka Ezeagwula, Chikodi Ezeagwula, Chidi Chileke, na Ejike Nwankwo.

Ọ sịrị na ha bụ ndị ekperima gara n'ihu mụnye ụlọ onye ndu ndị ntoroọbịa na-ahụ maka nchekwa ọkụ, ma bibie ọgbaatumtum ise.

Ihe ndị uweojii Imo steeti kwuru

Ebe foto si, Imo State Police Command

Dịka Okoye siri kwuo, oge ha natara ozi ahụ, ndị uweojii weere ọsọ na ije gaa ebe ahụ e mere ya bụ arụ ma bugaa mmadụ niile ọnọdụ ahụ metụtara ụlọọgwụ General Hospital dị n'Okigwe, bụ ebe dọkịta nọọrọ kwupụta na ha anwụọla.

Ka ọ dị ugbua, a dọnyela ozu ndị nwụrụ anwụ n'ọbaozu nke ụlọọgwụ ahụ, ebe onye nke dị ndụ na-anara ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ ugbua.

Aboki Danjuma, bụ onye duuru ndị uweojii gaa n'Okigwe katọrọ arụ ahụ ma kwe nkwa na ya ga-eme ihe niile dị ya n'aka iji hụ na ndị niile aka ha dị na mwakpo ahụ natara ntaramaahụhụ kwesịrị ekwesị.