Ụgbọelu ahụ fedara n'ike kpọkasịa ma merụọ ndị mmadụ ahụ n'ọdọụgbọelu Sam Mbakwe dị n'Imo Steeti

Obere ụgbọelu na-acha ọcha ma nwee akara anụnụ anụnụ dara ada ma sọgharịa isi
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụgbọelu bu ndị njem nke ụlọọrụ Sky Power nwee akpọkasịala n'ọdọụgbọelu Sam Mbakwe dị n'Imo Steeti n'abalị ụbọchị Tuzde 16 Disemba 2025.

Nke a mere mgbe ụgbọelu si Kaduna na-aga Owerri, ma mwee kpọkasị dịka ọ na-achọzi ifeti n'ọdọụgbọelu Sam Mbakwe n'okporoụzọ akara 17 n'ọdọụgbọelu ahụ.

N'ihe nke a mmadụ anọ nọ n'ime ụgbọelu merụrụ ahụ, e burula ha gaa n'ụlọọgwụ maka ọgwụgwọ.

Anya hụrụ ka ihe a si mee kwuru na ụgbọelu nwere nsogbu dịka ọ na-achọ ifetu n'ala, nke a mere o jiri sọgharịa isi tupu o jisie ike kwụsị n'ime ọdọụgbọelu ahụ.

Nke a tinyere egwu n'ahụ ndị mmadụ nọ n'ọdọụgbọelu n'oge ihe a mere mana o nweghi onye ọbụla nwụrụ.

Ndị ọrụ gbata gbata mere ngwa ngwa rute n'ebe ụgbọelu ahụ kpọkasịrị ma zọpụta ndị nọ n'ime ya ma buga ha n'ụlọọgwụ dị nso.

Ndị ọrụ ụgbọelu

Ngalaba na-ahụ maka nchekwa njem ụgbọelu bụ 'Nigerian Safety Investigation Bureau, NSIB' amalitela ime nnyocha etu ọdachi a si mee nakwa ihe nwereike ịbute ya.

Nnyocha ahụ ga-eleba anya n'akụrụngwa ụgbọelu ahụ si arụ ọrụ, ọnọdụ ihu eluigwe, ihe ndị na-akwọ ụgbọelu ahụ mere na ihe ndị ọzọ.

A kwụsịtụrụ njem ụgbọelu n'oge ihe a mere mana njem ụgbọelu amalitekwala n'ọdọụgbọelu ahụ dịka e mechiela akụkụ ebe ihe a mere.

"Ụgbọelu ahụ dara na mberede nke mere o jiri kpọkasịa."

Obere ụgbọelu na-acha ọcha ma nwee akara anụnụ anụnụ dara ada ma sọgharịa isi

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na ngalaba ụgbọelu ahụ bụ Muhammed Adiola kwuru na ọ bụ eziokwu na ụgbọelu ahụ.

"Ọ bụ obere ụgbọelu mmadụ anọ nọ n'ime ya, oge anyị nwetere ozi na ihe dị etu a mere, anyị ji ọsọ na ije gaa ebe ahụ ma chọpụta na ọ bụ mmadụ anọ nọ n'ime ụgbọelu ahụ.

"Abụọ n'ime ha maara onwe ha ebe abụọ ndị ọzọ nọ n'ọnọdụ amaghị onwe a kpọrọ 'unconscious'.

"Ngwa ngwa e buuru ha gawa n'ụlọọgwụ ebe ha na-anata ọgwụgwọ ugbua.

"Ihe anyị maara ugbua bụ na ụgbọelu ahụ dara na mberede nke mere o jiri kpọkasịa."