Olee ebe ndịagha Naịjirịa 11 e jichiri na Bọkịna Faso nọ ugbua?

Gọọmenti Naịjirịa ekwuola na mba Bọkịna Faso atọhapụla ndịagha iri na otu ahụ ha jichiburu, dịka ha maliteghachiri njem ha na-aga na mba Pọtugal.
N'ozi o wepụtara n'ụbọchị Fraịde 19 Disemba 2025, Minista Naịjirịa na-ahụ maka mba ofesi bụ Yusuf Tuggar kwuru na ndịagha ahụ ahapụla Bọkịna Faso na-enweghị nsogbu.
"Enwere m ike ikwu ugbua na ndị ọkwọụgbọelu na ndị ọrụ nke ụgbọelu ndịagha NAF C-130 (913) efedala n'ogige ndịagha elu dị n'Accra," ka Tuggar kwuru.
Ọ gara n'ihu sị: "N'isochi mkparịtaụka m nwere na Bọkịna Faso, ndị ọkwọụgbọelu na ndị ọrụ nke ụgbọelu ndịagha NAF C-130 (913) enwetala ikike ịpụ, dịka ha nọ n'elu ugbua na-aga Pọtugal site n'Accra."
Na mbụ ka ọnụ na-ekwuchitere Tuggar gwara BBC na a tọhapụla ndịagha ahụ e jichiri na Bọkịna Faso, dịka a na-atụ anya na ha ga-alọghachi Naịjirịa.
Ụlọọrụ Ndịagha Elu Naịjirịa kwuru na ụgbọelu ahụ na-efega mba Pọtugal tupu o nwee nsogbu, nke manyere ha ifedata na mba Bọkịna Faso.
Ndịagha Naịjirịa e ji eji na Bọkịna Faso alọghachitabeghị - Minista mba ofesi

Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu kwuru na ya ezigaala ndị nnọchiteanya a maara aha ha na mba Bọkịna Faso, nke onyendu ha bụ Minista na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ofesi bụ Yusuf Tuggar.
Ọnọdụ a na-abịa dịka e jichiri ndịagha Naịjirịa iri na otu na mba Bọkịna Faso kemgbe ihe karịrị otu izuụka.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ndị nnọchiteanya ahụ kwuru na Naịjirịa na Bọkịna Faso "jiri udo dozie okwu gbasara ndị ọkwọụgbọelu ndịagha Naịjirịa na ndị ọrụ ha e ji eji."
Mịnịstrị na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ofesi kwupụtara n'ụbọchị Wenezde 17 Disemba, 2025 na mba abụọ ahụ "ekpebiela ịga n'ihu na-akpọtụrụ onwe ha site na mgbe ruo na mgbe iji kwalite mmekọrịta ha."
Ọ gbakwunyere na mkparịtaụka ha nwere n'isi obodo Bọkịna Faso bụ Ouagadougou lekwasara anya na ndọrọndọrọ ọchịchị, nchekwa na akụnaụba.
Ọ gara n'ihu kwuo na ha kparịtara ụka gbasara ijikọta aka buo agha megide ọnọdụ enweghị nchekwa dị na mpaghara Sahel nakwa Odịdaanyanwụ Afrịka.
Cheta na Gọọmenti Naịjirịa kwuru na e jichiri ndịagha Naịjirịa gụnyere ndị ọkwọụgbọelu abụọ na ndị ọrụ itoolu na mba Bọkịna Faso kemgbe mmalite ọnwa Disemba, mgbe ụgbọelu agha Naịjirịa C-130 fedara na mberede na mba ahụ n'ihi nsogbu, oge ha nọ n'ụzọ na-aga mba Pọtugal.
Ka o sina dị, mịnịstrị na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ofesi ekwuola na ndịagha iri na otu ahụ alọghachibeghị Naịjirịa ka ọ dị ugbua.
Onye enyemaaka pụrụiche nke Minista na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ofesi bụ Alkasim Abdulkadir kwuru nke a oge onye ntaakụkọ BBC kpọtụụrụ ya.
Abdulkadir sịrị: "Ha [ndịagha Naịjirịa] ga-alọghachi Naịjirịa, mana ha alọghachitabeghị ka ọ dị ugbua."
Ihe Gọọmenti Naịjirịa kwuru maka nwuchi a nwuchiri ugbọelu bu ndịagha ha na mba Burkina Faso

Ebe foto si, Nigeria Airforce/Getty Images
Ndịagha ụgbọelu Naịjirịa kwuru na ụgbọelu ahụ fedara na mberede n amba Burkina Faso nọ na-aga njem na mba Pọtugal mgbe o fedara.
Ozi ahụ kwuru na ụgbọelu ahụ si na Legọs fepụ ma nwee nsogbu dịka ha nọ n'elu nke mere ha jiri fetuo n'obodo Bobo-Dioulasso nke Burkina Faso na mberede bụ ebe e nwere ọdọụgbọelu dị ha nso dịka iwu na-achịkwa njem ụgbọelu.
"Ndị ọrụ ụgbọelu anyị dị mma, e nyere ha nkwanye ugwu ruuru ha na mba ahụ. Atụmatụ na-aga n'ihu ka ha malite njem ha dịka a kwadobere na mbụ. Ndịagha Naịjirịa na-ekele nkwado niile a na-enye ha n'oge ma kwuo na ha ga-arụ ọrụ n'usoro iwu na-achị mbaụwa iji hụụ na e chekwara ndịagha ha," ka ozi ahụ gbakwụnyere.
Mana ihe ndịagha Naịjirịa kwuru dị iche n'ihe ndịagha na-achị mba Burkina Faso kwuru nke sị na ụgbọelu ahụ febatara na mbara ihueluigwe na-anataghị ikike nke mere e jiri mee ka o fetuo n'ike.
Ihe ndịagha na-achị mpaghara Sahel kwuru

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ndu mba atọ dị na mpaghara Sahel bụ Burkina Faso, Mali na Niger akatọọla mmetọ mbara ihu eluigwe ha nke ụgbọelu ndịagha Naịjirịa mere mgbe o feturu na mberede n'obodo Bobo Dioulasso nke mba Burkina Faso n'ụbọchị Mọnde.
Otu jikọtara mba ndị a dị na mpaghara Sahel a kpọrọ Alliance of Sahelian States (AES) nke gụnyere mba atọ ndịagha na-achị na West Afrịka dọrọ aka na ntị na ọ bụrụ ụdịrị ihe mee ọzọ, na ha ga-agbatu ụgbọelu ahụ.
Ha kwuru na ha etinyela akụrụngwa na-echekwa mbara ihu eluigwe n'ọrụ maka ihe dị etu a ime.
"A kwadobela ngwaagha na-eche mbara ihu eluigwe anyị, nye ya iwu ịgbatu ụgbọelu ọbụla na-enupu isi ma na-emetọ ihu eluigwe anyị," ka ozi ahụ kwuru,
Dịka ozi ahụ si kwuo, ụgbọelu ndịagha Naịjirịa a kpọrọ C130 bu ndị na-akwọ ya mmadụ abụọ na ndịagha mmadụ itoolu.
Onyeisi nlekọta mpaghara Burkina Faso bụ Emile Zerbo kwuru n'ihe onyonyo mbasaozi TV na ụgbọelu ahụ batara n'ihu eluigwe mba Burkina Faso na-enweteghi ikike.
O kwuru na ha anwuchiela ndịagha Naịjirịa mmadụ itoolu ndị a batara n'obodo ha.
Gọọmenti Naịjirịa ekwubeghi ihe ọbụla banyere nke a.
Nke a na-abịa dịka Naịjirịa kwuru na ọ bụ eziokwu na ha zipuru ụgbọelu agha na ndịagha na mba Benin iji nyere gọọmenti ha aka kwụsị iwere ọchịchị n'ike ndịagha chọbuuru ime.
Mba ndị Sahel na ndị ogbo nke West Afrịka enweghizi mmekọrịta kamgbe ha pụrụ n'otu ECOWAS, nke a mere ha jiri mụrụ anya maka na ECOWAS yiri egwu na a ga-eji ndịagha wakpoo ha.
Mba Burkina Faso, Mali na Niger na-enwe nsogbu nchekwa site n'aka ndị na-eyi ndụ egwu kamgbe ndịagha weere ọchịchị n'ike na mba ndị a.
Etu Naịjirịa si kwụsị ndịagha ikwatu gọọmenti mba Benin

Ebe foto si, Getty Images
Ndị mmadụ kwuru na ha nụrụ nnukwu ụda egbe nakwa ihe dara ka ogbunigwe na Kotonou bụ isi obodo mba Benin.
Gọọmenti Naịjirịa mechara kwuo na ọ bụ ha ji ụgbọelu agha kwụsị ndịagha chọrọ ikwatu gọọmenti mba Benin n'ike.
Ha sị na "Naịjirịa mere nke a dịka gọọmenti mba Benin kpọrọ ha ka ha bịa nyereaka, nke a mere Onyeisiala Tinubu ji ziga ndịagha ụgbọelu Naịjirịa bụ ndị mwakporo ebe ndịagha Benin ahụ chọrọ ikwatu gọọmenti nọ".
Ha sị na ndịagha Naịjirịa mere ngwagwa kwụsị ndị ahụ chọrọ ikwatu ọchịchị onye kwuo uche na mba Benin rugoro afọ iri atọ na ise.
Onyeisi ndịagha Naịjịrịa bụ ọchịagha Olufemi Oluyede kwuru na ihe niile mba Benin rịọrọ Naịjirịa ka ha mee na Naịjirịa emeela ya ma ziga ndịagha na mba ahụ.
Ndịagha Naịjirịa ji naanị nke nke awa nwere mwakpo ma chụpụ ndịagha mba Benin ahụ chọrọ ikwatu gọọmenti ma nwere ọchịchị n'ike.

Ebe foto si, FB/Nigeria Airforce HQ
Akụkọ si na mba Benin na-ekwu na e jidela ndịagha mba ahụ nakwa ndị a na-enyoenyo na aka ha dị n'atụmatụ ikwatu gọọmenti ha.
A sị na ndịagha Benin e jidere ruru mmadụ iri na atọ n'ebe ụlọ mgbasaozi gọọmenti mba ahụ nakwa otu onye agha a chụpụrụ achụ n'ọrụ n'oge garaaga.
Ọgbaghara dapụtara na mba Benin maka ntuliaka ha ga-eme n'ọnwa Epril afọ 2026 dịka ụlọikpe na mba ahụ machiri ọtụtụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị iso zọọ ọkwa ma tụọ ndị ọzọ nga.
Onyeisiala ha bụ Tolan ekwuola na ya adịghị achọ ịzọ ọkwa ọzọ ma kwupụta onye ọ chọrọ ka ọ nọchịe anya ya.
Nkwatu ọchịchị Tolan nke mba Benin na-abịa abalị ole ma ole ndịagha na mba Guinea-Bissau wepụchara Onyeisiala ha bụ Umaro Sissoco Embalo n'ọkwa.
Mba ise Naịjrịa zigara ndịagha n'oge garaaga

Ebe foto si, Getty Images
Naịjirịa enweela ndekọ iziga ndịagha n'ọtụtụ mba dị n'Afrịka maka ọrụ nchekwa maọbụ inweta udo na mba ndị ahụ.
Naịjirịa na-eme nke a site n'ikike ha nwere na otu jịkọtara mba ụwa bụ United Nations (UN), otu jịkọtara mba Afrịka bụ Afrịcan Union (AU) na otu ECOWAS.
Mba Liberia
Naịjirịa site n'ikike ndị West African Community Monitoring Mission (ECOMOG) zigara ndịagha n'Liberia n'afọ 1990 nakwa n'afọ 2003 bụ ugboro abụ a nụrụ agha n amba ahụ.
Na 1990 Naịjirịa gara ịhụ na e merezuru nkwekọrịta nkwụsị agha e nwere n'oge ahụ.
Mana n'afọ 2003 Naịjirịa zigara ndịagha udo bụ ndị ga-anọrọ chere ruo na ndịagha otu mba ụwa bụ United Nations Mission in Liberia (UNMIL) ga-abịa.
Cheta na agha a bụ nke mere Charles Taylor ji sin a Liberia pụọ ga zere ndụ n'ebe ọzọ.
Sierra Leone
Naịjirịa du otu ECOMOG gaa mba Sierra Leone mgbe ha na-anụ agha n'afọ 1997 ka ndịagha wepụchara ọchịchị Ahmed Tejan Kabbah mgbe ọ nọ naanị otu afọ n'ọkwa.

Ebe foto si, Getty Images
Guinea-Bissau
Ọzọ bụ na Guinea-Bissau n'afọ 1998 nke so na nkwekọrịta e nwere n'Abuja maka ịkwụsịagha na mba ahụ.
Ọrụ ndịagha Naịjirịa bụ ndị du ECOMOG bụ ime ka e mezuo nwekọrịta e nwere nke e binyereaka n'ime ya na Novemba 1, 1998.
Ivory Coast
Naịjirịa zigakwara ndịagha n'afọ 2003 na Ivory Coast sonyere na nke a kpọrọ ECOWAS mission in Côte d'Ivoire (ECOMICI) mgbe ọgbaaghara kewara mba ahụ bido n'afọ 2002, Naịjirịa kwadoro mba Fransi nakwa ndịagha UN bụ ndị bịara hụ na e mere nkwekọrịta nkwụsịagha
Ọgbaaghara dapụtara n amba ahụ mgbe ndịagha chọrọ ikwatu ọchịchị dara mba, ebe ndịagha nnupu na mpaghara ugwu mba ahụ butere ọnọdụ tiwara mba ahụ ụzọ abụọ.
Mali
Naịjirịa so na ndị kacha ziga ndịagha n amba Mali n'afọ 2013 mgbe ha kwadoro gọọmenti mba Mali ibuso ndịagha nnupuisi agha.








