Helicopter Crash in Lagos : Legọs steeti amalitela ịrụzi ebe ihe mberede ụgbọelu mebiri

Okiriko ụgbọelu ahụ kpọkasịrị

Ebe foto si, Lasema

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Gọọmentị Legos steeti amalitela ịrụzị ebe ụgbọelu kpọkasịrị na Legọs izu gara aga.

Ụgbọelu helicọpta nke ụlọọrụ 'Quorom Aviation' bu mmadụ atọ dara kpọkasịa na Salvation Road dị n'Opebi, Ikeja na Legọs n'etiti ụbọchị Fraide gara aka ma gbuo ndị nọ n'ime ya gụnyere Chika Ernest bụ ọkwọụgbọelu ahụ.

N'ozi nke ọnụ na-ekwuru Lasema bụ Nosa Okunbor wepụtara, o kwuru na "a malitere ịrụzịgharị ụlọ dị na 14 na 16 Salvation Road ,Opebi, dị n'iIkeja ebe ụgbọelu helicọpta kpọkasịrị dịka gọvanọ si kwee na nkwa."

Aha onyonyo, Ihe nkiri na-egosi ọnụụzọ ụgbọala DANA fekapụrụ n'Abuja

Cheta na Gọvanọ Legọs steeti bụ Babajide Sanwolu gaburu n'ebe ihe mberede ahụ mere ma kwee nkwa na ndị injinia ga-abịa inyocha ụlọ ndị dị nso n'ebe ihe ahụ mere iji hụ ka ha siri kwụrụ.

O kwukwara na a ga-enyekwara ndị o metụtara aka ịrụzị ihe mebiri emebi.

Onye nke atọ merụụ ahụ n'ihe mberede ụgbọelu mere na Legọsanwụọla

Okiriko ụgbọelu ahụ kpọkasịrị

Ebe foto si, Ibrahim Farinloye/NEMA

Nkọwa foto, Okiriko ụgbọelu ahụ kpọkasịrị

Ha adịla mmadụ atọ nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu mere na mpaghara Opebi dị n'Ikeja nke Legọs steeti.

Ndị ọrụ gbatagbata kwuburu na ọ bụ mmadụ atọ nọ n'ụgbọelu ahụ oge ọ dara, abụọ n'ime ha nwụrụ ozigbo, ebe e bu otu gawa ụlọọgwụ.

Mana ugbua, onye nke atọ ahụ alakwaala mmụọ.

Ewepụtabeghi aha ndị ahụ nwụrụ

Bhuari ezigala ozi iti aka n'obi maka ihe mberede ụgbọelu mere na Legọs

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Twitter/Bashir Ahmad

Nkọwa foto, Onyeisiala Muhammadu Buhari

Onyeisiala Muhammadu Buhari ezigarala ndị mmadụ nwụnahụrụ n'ihe mberede ụgbọelu mere na Legọs ozi iti aka n'obi.

Okiriko ụgbọelu ahụ kpọkasịrị
Nkọwa foto, Okiriko ụgbọelu ahụ kpọkasịrị

Onyeisiala kwuru sị: "Dịka a na-eche ka e mechaa nnyocha iji chọpụta ihe kpatara ihe mberede ahụ, ana m arịọ ka ndị mmadụ nwụnahụrụ kara obi".

"Ka Chineke kasie ha obi n'oge a ha na-eru uju, ma mee ka mkpụrụobi ndị nwụrụ anwụ zuru ike n'udo."

Ụgbọelu dara

Ebe foto si, @followlasema

Ụgbọelu Helikopta 'Bell Helicopter 206B3' nke ụgbọelu 'Quorom Aviation' bu mmadụ atọ adaala kpọkasịa n'ụzọ Salvation dị n'Opebi, Ikeja na Legọs n'etiti ụbọchị taa bụ Fraide.

Ndị ọrụ gbata gbata nke Legọs steeti bụ "Lagos State Emergency Management Agency" (Lasema) ewerela ọnọdụ ebe ahụ ịnyere ndị o metụtara aka.

Mmadụ abụọ nwụrụ pịị ebe otu onye ndị ọzọ merụrụ ahụ oge ụgbọelu helịkọpta kpọkasịrị na Legọs n'ụbọchị Fraịde.

Ya bụ ihe mere na mpaghara Ikeja, nke bụ isi obodo Legọs, n'elekere iri na abụọ nke ehihie.

E bugara onye nke atọ merụrụ ahụ ụlọgwụ 'Lagos State Teaching Hospital, Ikeja."

Akụkụ ụgbọelu ahụ kpọkasịrị

Ebe foto si, Lasema

Nkọwa foto, Akụkụ ụgbọelu ahụ kpọkasịrị

Ụgbọelu ahụ dabara n'ime ụlọ ebe ndị mmadụ bi ma kurie ngwuru ụlọ ahụ nakwa ọtụtụ ụgbọala dị n'ime ya.

A matabeghị aha ndị nwụrụ n'ihe mberede a maọbụ aha ndị merụrụ ahụ mana ndịọrụ gbata gbata na-agba mbọ ịchọpụta ma o nwere ndị ọzọ ha ga-azọpụta.

Onyeisi ndị uweojii nke Legọs bụ H.O Odumosu kwuru na ọ bụ mmadụ atọ nọ n'ime ụgbọala ahụ.

Lasema sị na ndi ọrụ ha nọ ebe ahụ na ozi ha zipụrụ n'akara Twitter ha.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ọ dara ka ogbunigwe

Ụgbọelu ahụ dapịara ụgbọala dị n'ime ụlọ ahụ
Nkọwa foto, Ụgbọelu ahụ dapịara ụgbọala dị n'ime ụlọ ahụ

Otu onye ụlọọrụ ha dị n'ime ụlọ ahụ gwara BBC na ha nụrụ ihe dara ka ogbunigwe nke mere ka nnukwu ụjọ jide ha.

Nwoke a aha ya bụ Olusumade Damola kwuru na ọbụ oge ha gbapụtara n'ezi ka ha hụrụ na ọ bụ helịkọpta dara n'elu ụlọ ha.

Damola gara n'ihu kwuo na ha "bupụtara ozu mmadụ abụọ n'ime ya bụ ụgbọelu ma burukwa otu onye nke ọzọ merụrụ nnukwu ahụ gaa ụlọọgwụ."

Akụkụ ụgbọelu ahụ kpọkasịrị

Ebe foto si, Lasema

Dịka aha e depụtara n'ahụ ụgbọelu ahụ si gosi, ndị nwe ya bụ ụgbọelu bụ ụlọọrụ a kpọrọ 'Quorum Aviation'.

Amabeghi ebe ya bụ ụgbọelu na-aga, maọbụ ebe o si alọta tupu ọ kpọkasịa.

Olufemi Oke-Osayintolu

Ebe foto si, Twitter/OkeOsanyintolu

Nkọwa foto, Onyeisi ngalaba gbatagbata Legọs bụ Olufemi Oke-Osayintolu

Onyeisi ngalaba ọrụ gbata gbata nke Legọs bụ Olufemi Oke-Osanyintolu kwuru na ndịọrụ ya gbatara ọsọ n'oge ebe ya bụ ihe mberede mere.

O kwuru sị: "Ọ bụrụ na ndịọrụ anyị agbataghị n'oge, ya bụ ihe gaara ịka njọ karịa etu ọ dị ugbua."

Ụgbọelu dara ada
Nkọwa foto, Ka ọ dị ugbua, ndịọrụ Lasema ebupụla ụgbọelu ahụ dara ada.

"Anyị ji igwe mgbanyụ ọkụ gbaa na ya bụ ụgbọelu oge ọ dara iji mee ka ọ ghara inwuru ọkụ."

"Anyị mekwara ngwa ngwa iji gbochi ọtụtụ ndị mmadụ ịbanye n'ebe ya bụ ihe mere."

Oke-Osanyintolu kwuru na ọ bụ mgbe e mechara nnyocha ka a ga-amata ihe kpatara ụgbọelu ahụ ji daa.

Ụgbọelu dara ada