Etu ndị obodo Ngbo dị n'Ebonyi Steeti si achụ ndị dibịa 'okeite' na ezenwaanyị ọsọ ụkwụ erughi ala

Ebe foto si, Njoku Chijioke
Dịka ọnwụ erughị eru bịara rịa elu n'obodo Ngbo dị n'Ebonyi steeti, ndị ọnụ na-eru n'okwu, ndị okenye na ndị ntoroọbịa amalitela nzacha na mkpocha n'obodo ha ebe ndị dibịa na ndị Ezenwaanyị na-agwọ ọkeite na ọgwụ ọjọọ ndị ọzọ riri mbọmbọ.
Oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'ụbọchị Tọzde 3 Eprel 2025 n'Ogbagede Ukwagba Ngbo dị n'okpuruọchịchị Ohaukwu n'Ebonyi steeti, onye nọchiri anya Eze obodo Umagudu Osha kwụụrụ onwe ya bụ Prince Uche Ali Aga sịrị na atụmatụ ahụ bụ nke ha bagidere iji napụta ndị obodo Ngbo na ndọghachiazụ sitere n'aka ndị dibịa.
Prince Uche kpughere na ndị dibịa ahụ anọrọla kemgbe ọtụtụ afọ ndị gara aga kpọchie ụfọdụ igodo nọchitere akaraaka ndị mmadụ ma kechiekwa aha ezinaụlọ dị iche iche, atụmatụ ha na ụfọdụ akwụkwọ ego, nke ebumnobi ya bụ iji gbochie ọganihu ndị obodo ahụ.
O kwuru na ọnwụ erughị eru ndị ntoroọbịa na Ngbo arịala elu bụ nke mere o jiri dị mkpa ịzacha ma kpochaa obodo ahụ iji gbochie ya.
Cheta na ụlọomeiwu Ebonyi steeti nọọrọ na nso nso a machie ịgba mmọnwụ n'obodo ahụ iji gbochie ọgbaaghara.
"Ndị omeiwu Ebonyi Steeti na-akwado ime iwu ga-amachi ịgwọ okeite na ọgwụ ndị ọzọ"

Ebe foto si, Screenshot
N'okwu ya, Prince Uche sịrị, "anyị abịala ebe a ma hụkwa ebe nchụaja abụọ; ebe nchụaja Jizọs Kraịst na ebe nchụaja agbara".
"Anyị ahụkwala omume ndị ọdịnala na-akwadoghị na ndị nke na-ekwesịghị ekwesị Ezenwaanyị a na-eme, bụ onye mekparala obodo a ahụ kemgbe ọtụtụ oge".
"Anyị ahụla na nwaanyị a kpọchiri ọtụtụ igodo na aha ezinaụlọ dị iche iche, atụmatụ ha na ụfọdụ akwụkwọ ego naịra iji mee ka ndị nwe ha ghara ịga n'ihu."
"Nke a abụghị omume ndị anyị ji mara ndị dibịa oge anyị na-etolite n'obodo a," ka o kwuru.
Ọ gara n'ihu sị "anyị nọ ebe a maka ozi anyị nwetara na ndị mmadụ na-anwụ aghara aghara dịkwa ka obodo a anaghị aga n'ihu, i lee anya ị ga-achọpụta na-enweghị ihe na-aga aga n'obodo a".
"Ebe nchụaja nke Chineke a ị na-ahụ ebe a bụ nke o ji emegheri ndị mmadụ anya."
Prince Uche kwuru na ọ bụ ndị ndu Ngbo malitere ihe a na-ahụ n'Anambra steeti ugbua bụ ebe aka na-achị steeti ahụ machiri ndị dibịa na-agwọ okeite.

Ebe foto si, Njoku Chijioke
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
N'otu aka ahụ, ndị obodo Ukwagba gara n'ihu na-emebisi ọtụtụ ebe nchụaja ndị ọzọ dị n'obodo ha ma na-agba osisi na ngwa nchụaja ọkụ.
N'ihe onyonyo onye enyemaka pụrụiche osote onyeisi ụlọomeiwu Ebonyi Steetị bụ Chinedu Onah wepụtara na soshal midia gosiri ka ebe nchụaja na-agba ọkụ dịka ndị mmadụ na-enwe aṅụrị maka nke a.
Akụkọ kwuru na ihe kpatara nke a bụ maka na ndị obodo ekwetela ma nabata okpukperechi Kraịst.
Mana mgbe BBC Igbo kpọtụụrụ Chinedu Onah, bụkwa onye obodo Ngbo, o kwuru na ọ bụghị omenala Igbo ka ha na-emebi kama na ọ bụ ndị ji aha omenala Igbo na-achụaja ma na-agwọ ọgwụ ọjọọ dị iche iche ka ha na-emebisi.
O kwuru na nso nso a, na e nweela ọtụtụ akụkọ ogbugbu ndị mmadụ n'ihi ọgwụego, okeite na ihe ọjọọ ndị ọzọ mere n'obodo ha.
Na ọ bụ nke a mere ka ndị obodo jiri kpebie ikpocha na ịzachasị obodo ha iji maara ndị bụ ndị dibịa na nke ọma ya.
Onah gara n'ihu kwuo na ndị omeiwu Ebonyi Steeti na-akwado ihiwe atụmatụ iwu ga-amachi ịgwọ ọgwụ okeite, ubobo na ndị ọjọọ ndị ọzọ na steeti ahụ, dịka Anambra si mee nke ha.








