A nwuchiela otu n'ime ndị a na-enyo wakporo ma gbuo ọtụtụ mmadụ na Nkalaha, Ebonyi Steeti

Aha onyonyo, Ndị obodo Nkalaha akọwaala etu ndị ekperima siri wakpoo ha ma gbuo ọtụtụ mmadụ
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ndị uweojii Ebonyi Steeti sị ha anwuchiela otu n'ime ndị a na-enyo enyo wakporo obodo Amagu Nkalaha ma gbuo ihe ruru mmadụ iri na ise.

N'ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Steeti ahụ bụ Joshua Ukandu wepụtara, kwuru na a nwuchiri nwamadị a n'okeala dị n'etiti Nkalaha na Eha-amafu site n'enyemaka ndị obodo.

O kwuru na mgbe a na-agba ya ajụjụọnụ, nwamadị a kpọrọ aha ndị ọzọ ya na ha so mee mwakpo ahụ. Nke mere ndị uweojii jiri wụchie n'ogige ebe ndị a nọ.

Ụlọ ndị a gbara ọkụ n'obodo Amagu Nkalaha.

Mgbe ha ruru ebe ahụ, ndị otu nwamadị a gbara ọsọ, mana a hụrụ ngwaọgụ dị iche iche gụnyere egbe, akwa ndị uweojii na nke ndị agha.

Ukandu kwuru na ndị uweojii na-achụ ndị ekperima a ọsọ dịka ọ dị ugbua ma sị na onye nwere ozi ga-enye aka n'ịnwuchi ndị a kpọtụụrụ ndị uweojii.

"Naanị uwe a m yi n'ahụ bụ ihe fọdụụrụ m na ndụ a"

Naanị uwe a m yi n’ahụ bụ ihe fọdụụrụ m na ndụ - Nwaanyị a gbara ụlọ ya ọkụ n’Ebonyi steeti
Nkọwa foto, Ụmụnwaanyị ndị a wakporo n'Ebonyi steeti

Ụmụ mmadụ akwaala arịrị gbasara mwakpo ndị a na-enyo na ha bụ ndị ọchịehi mere n'obodo Amegu Nkalaha dị n'Okpuru ọchịchị Ishielu n'Ebonyi steeti n'ụbọchị Sọnde ma gbuo mmadụ iri.

Ha mere ka a mata nke a oge onye ntaakụkọ BBC News Igbo gara n'obodo ahụ n'ụbọchị Mọnde 3 Febụwarị 2025.

Otu nwaanyị na-akpọghị aha ya kwuru na ndị ojiegbe ahụ gburu ụmụnne di ya abụọ ma gbuokwa nna ha oge ha mere ya bụ mwakpo.

O kwukwara na ndị ojiegbe ahụ bibiri ngwongwo ha dị iche iche dịka ụlọ, ji na ngwongwo ndị ọzọ ha ji biri n'ụlọ ma napụkwa ndị mmadụ ego ha n'ike.

"Ha jidere ụfọdụ ụmụnwaanyị, napụ ha ego n'ike. Ndị nke di ha nwụrụ anwụ, a gbara ụlọ ha ọkụ ma napụ ha ihe niile ha ji," ka nwaanyị ahụ kwuru.

Onye nke ọzọ aha ya bụ Nwakaego kwuru na ihe kachasị ewute ya bụ na a gbara ụlọ ya ọkụ ma bibie ngwongwo ya niile.

"Uwe a m yi ugbua agwụchaala ihe fọdụụrụ m na ndụ a. Ha dọkachara uwe m yi n'ahụ, nke a m yi ugbua bụ nke ndị mmadụ nyere m," ka nwaanyị ahụ kwuru.

Ha kpọkuru Gọọmenti Ebonyi steeti ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka ma nye ha ezi nchekwa.

Gọvanọ Nwifuru agwala ndị e mere mwakpo n'Ebonyi steeti ka ha dere duu

Ka onye niile fanye mma ya n'ọbọ - Gọvanọ Nwifuru na-agwa ndị e mere mwakpo n'Ebonyi steeti

Ebe foto si, Francis Nwifuru/X, BBC

Nkọwa foto, Gọvanọ Francis Nwifuru na otu n'ime ụlọ ndị a wakporo n'Ebonyi steeti

Aka na-achị Ebonyi steeti bụ Gọvanọ Francis Nwifuru akatọọla mwakpo e mere n'obodo Amagu Nkalaha dị n'Okpuru ọchịchị Ishielu dị na steeti ahụ.

Nwifuru mere ka a mata nke a n'ozi odeakwụkwọ mgbasaozi ya bụ Monday Uzor tinyere aka na ya.

N'ozi ahụ, Gọvanọ Nwifuru kwuru sị "ọ gbawara m obi ịnụ maka mwakpo e mere ndị obodo Nkalaha ma gbuo ụmụamaala aka ha dị ọcha."

"Ya bụ mwakpo na-abụghị nke mbụ a na-eme n'obodo ahụ na-egosi enweghị ihe e ji ndụ mmadụ kpọrọ," ka o kwuru.

Ka o sinadị, o kwere nkwa na gọọmenti Ebonyi steeti ga-eme ihe niile dị ya n'aka ịchọpụta ihe butere mwakpo ahụ.

O kwuru na gọọmenti ya dị ezigbo njikere ichekwa ndụ ụmụafọ steeti ahụ ma rịọ ka onye niile fanye mma ha n'ọbọ iji nye ohere ka gọọmenti mee nnyocha kwesịrị ekwesị.

Nwifuru nyere iwu ka ndị ọrụ nchekwa niile nọ n'Ebonyi steeti bilie n'ọrụ ozugbo iji zute ọnọdụ ahụ dịka ọ kasikwara ezinaụlọ niile ndị nke ha nwụrụ anwụ obi.

Mwakpo ndị ọchiehi: E gbuola ihe karịrị mmadụ 10 n'Ebonyi steeti

Mwakpo ndị ọchiehi: E gbuola ihe karịrị mmadụ 10 n’Ebonyi steeti
Nkọwa foto, Ụlọ na ngwingwo ndị mmadụ e bibiri n'Ebonyi steeti

E gbuola opekatampe mmadụ iri (10) n'obodo Amegu Nkalaha dị n'Okpuru ọchịchị Ishielu n'Ebonyi steeti oge ndị a na-enyo na ha bụ ndị ọchiehi mere mwakpo.

Akụkọ kwuru na ha bụ ndị ọchiehi mere nke ahụ iji buo agha maka ehi ha ndị a na-ebo ebubo na ha bụ ndị IPOB/ESN gburu na mpaghara ahụ.

Ọ bụ eziokwu na enwebeghị ndị kwuru na ọ bụ ha mere mwakpo ahụ n'ụzọ ụtụtụ Sọnde 2 Febụwarị 2025.

Ka o sinadị, ndị mwakpo ahụ bibiri ụfọdụ ụlọ ma gbaakwa ngwongwo ndị mmadụ dị iche iche ọkụ.

Gọvanọ Nwifuru agwala ndị e mere mwakpo n'Ebonyi steeti ka ha dere duu
Nkọwa foto, Ụlọ mmadụ a lara n'iyi n'Ebonyi steeti

Ndị ọrụ nchekwa ka na-agba mbọ ịchọpụta ndị mere mwakpo ahụ mana e nwebeghị onye ha nwụchirila ka ọ dị ugbua.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ebonyi steeti bụ Joshua Ukandu kọwara mwakpo ahụ dịka nke e mere megide naanị ụmụnwoke nakwa ụfọdụ ụlọ ndị a họọrọ.

Ọ sịrị na ndị ọrụ ha agaala were anya ha hụ ụlọ ndị ahụ a gbara ọkụ ma bupụkwa ozu ụmụnwoke iri ahụ e gburu egbu.

Mwakpo ndị ọchiehi: E gbuola ihe karịrị mmadụ 10 n’Ebonyi steeti
Nkọwa foto, Ụlọ mmadụ a lara n'iyi n'Ebonyi steeti