Iba Lasa eriela ndụ otu onye ọrụ ahụike n'Ondo

Okoloto ụlọ nyocha ọrịa Lasa

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndị ọrụ ụlọọgwụ na-arịọ ndị isi ha wega ọbara ha n'Irrua maka nyocha zuruoke

Otụ onye ọrụ ahụike na-arụ n'ụlọ nyocha ọrịa n'Ondo steeti anwụọla site n'ọrịa e chere na ọ bụ Iba Lasa.

Rasheedat Mohammed nwụrụ n'ụbọchị satode ebe ndị ibe ya na-akọwa na o si njem ọ gara na Pọtakọt(Port-Harcourt) lọta.

Akụkọ kwuru na onye ọ gara ịhụ nwụkwara site n'ọrịa a.

Ebe ndị ọrụ ahụike na-akpọ ndị isi ụlọọgwụ ahụ oku ka ha wega ọbara ha n'ụlọọgwụ Irrua nke dị na Edo steeti maka nyocha zuru oke.

Obodo ndị Iba Lasa metụtara

A na-akọwa na ndị isi ụlọọgwụ ahụ anaghị enye ha mgbochi kwesiri ekwesi maka ịgwọ ndị bu ọrịa ahụ.

Kọmịshọna na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ bụ Wahab Adegbenro kwuru na onweghị onye ọbụla na-arịa Iba Lasa na steeti ahụ.

Ebe dọkịta ukwu n'ụlọọgwụ ahụ bụ Akinwunmi Akinbodewa na-ekwu na ọ bụ ọrịa umeju gburu Rasheedat na ọ bụghị iba Lasa.

Otu onye ọkachamara na-ekwu ebe a ụzọ dị ịcheịche a ga-eji gbochi ọrịa ahụ ịmetụta gị:

Aha onyonyo, 'Chakwasa ịba lasa ọkụ dika esi mee Ebola'
Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ