Okada and Keke: A machiela ọgbatumtum n'ụfọdụ ebe na Legọs

Ebe foto si, Lagos State
Gọọmentị Legọs Steeti kwuru site n'ụbọchị mbụ ọnwa Febụwarị, 2020 na ha amachiela ọgbatumtum na keke ịgba n'ụfọdụ okpuruọchịchị dị na steeti ahụ.
Jubril Gawat bụ onye enyemaka gọvanọ Babajide Sanwo-Olu na mgbasa ozi ọhụrụ kwuru nke a n'ihe onyonyo o wepụtara na twitter.
Ọ sị na mmachị a ga-emetụta ndị ọrụ ọgbatumtum dịka Gokada na Opay.
Gawat sị na ọ bụ maka ọgbatumtum na keke nweghizi nchekwa ugbua na gọọmentị ga-ewepụta ụgbọala ọhụrụ ga-anọchi anya ha.
Ebe ndị o metụtara gụnyere; Apapa, Iganmu, Surulere, Itire, Coker-Aguda, Ikeja, Onigbongbo, Ojodu, Eti Osa, Ikoyi/Obalende, Iru, Victoria na Lagos Island.
Ụlọikpe ejirila nde naịra iri tọhapụ Shehu Sani nwamgbenta

Ebe foto si, Shehu sani Twitter
Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja sị na Shehu Sani nwere ohere ịla be ya ma ya kwụọ nde naịra iri dịka ngalaba na-ahụ maka nrụrụaka na mpụ bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) kpọ ha bịa zute ọkaikpe Inyang Ekwo.
EFCC na-ebo Sani ebubo abụọ banyere nrụrụaka.
Ha sị na Maazị Sani natara dọla puku iri na ise n'aha onyeisi EFCC bụ Ibrahim Magu.
EFCC sịkwa na ọ natara dọla puku iri n'aka mmadụ n'ụzọ akwụghị ọtọ.
Maazị Sani sị na ya emeghi ihe a ụlọọrụ EFCC na-ebo ya.
Ọ bụ n'ọnwa Febụwarị ka ọ ga-alaghachi ụlọikpe ị zara ọnụ ya.
Ọ bụ kamgbe ọnwa Disemba ka Sani nọ n'aka ha.
A ga-egbu Maryam Sanda, nwaanyị gburu di ya - Ụlọikpe

Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja amaala Maryam Sanda ikpe ọnwụ maka ogbugbu di ya bụ Bilyaminu Bello.
Ọkaikpe Yusuf Halilu kpebiri nke a n'ụtụtụ Mọnde bụ ụbọchị nke iri abụọ na asaa nke ọnwa Janụwarị 2020.
Sanda pụtara ịzara ọnụ ya maka ebubo na o ji mma magbuo di ya n'afọ 2017.
Ndị uweojii kpụpụrụ ya ụlọikpe ma sị ka a maa ya ikpe ọnwụ dịka ha sị na ọ ma ama gbuo di ya.
Sanda na onwe ya sị na aka ya dị ọcha n'ebubo e boro ya.
Ikpe a gara n'ihu ruo afọ tupu e ruo mkpebi a.
Mmadụ ise anwụọla na mwakpo Gwoza
Ọnụọgụgụ ihe nwụrụ na mwakpo a wakporo ụlọalakụba dị n'obodo Gwoza dị na Bọrnu steeti, eruola mmadụ ise.
Ndị nwụrụ gụnyere mmadụ abụọ yi ogbunigwe n'ahụ na mmadụ atọ ndị bịara ekpere.
Grammy 2020: Angelique Kidjo sepụrụ Burna Boy wee nara ihe nrite nturuugo Grammy
Angelique Kidjo bụ otiegwu a ma ama sepụrụ Burna Boy nke Naịjirịa ọnụ n'ara site n'irite nturuugo Grammy n'ogogo a kpọpụtara aha ha abụọ na mmadụ atọ ndị ọzọ.

Ebe foto si, Getty Images
Kidjo ji 'Celia' rite nturuugo 'ọbaegwu kachasị mma na mbaụwa'.
N'aka nke onwe ya, Kidjo ji ohere inye ekele wee sị na ọ na-akwanyekwara Burna Boy ugwu maka na o so na ndị na-etolite ga-eme ka anya ụwa tọ n'egwu Afrịka.
Coronavirus ka na-egbu na-aga:
Ka ọ dị ugbua, ọrịa coronavirus si na Chaịna malite ataala isi mmadụ iri asatọ na otu ebe ihe ruru mmadụ puku atọ ka bu ya bụ ọrịa.
N'ihi nke a, mba Chaịna eyigharịala ụbọchị ha kwesịrị ime emume mmalite afọ ọhụrụ ha, bugazie ya ụbọchị ụka na-abịa.
Akwa ka na-ahịọ n'isi Kobe Bryant
Ndị mmadụ ka na-eru uju maka ọnwụ Kobe Bryant dịka a na-enyocha ihe mere ka ụgbọelu helịkọpta ya na mmadụ asatọ ndị ọzọ nọ n'ime ya si n'elu dapụ ma kpọkasịa.
Ndị gụnyere Onyeisiala Donald Trump, Barack Obama chịbụrụ Amerịka, C. Ronaldo, Messi, Mo Salah na ndị ọzọ, so na ndị kwuputarala mwute ha maka ọnwụ ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 1
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 2
Coronavirus oruola Afrịka?

Ebe foto si, Gov.cn
Ndị mba Aịvọrị Kost ekeela nkwụcha dịka otu nwata akwụkwọ si mba China lọta na-egosi ihe mgbaama na o nwere ike ibu ọrịa Coronavirus.
Mba Aịvọrị Kost edopụla nwata akwụkwọ a otu ebe ma na-eche mpụtara nnyocha ahụ ya.
Ọ bụrụ na a chọta ọrịa a n'ahụ ya, ọ ga-abụ onye mbụ n'Afrịka a ga-achọta ya n'ahụ ya.
Cheta na Coronavirus a egbuola ihe ruru mmadụ iri asatọ na mba Chaịna.
Buhari agwala ndịagha ụgbọelu gaa bido ịlụ agha n'Ugwu
Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari enyela ikike ka ndịagha ụgbọelu nke Naijirịa tinye aka imegide mkpamkpa ndị omekome na-akpa na mpaghara Zamfara, Kaduna na Naịja steeti.

Ebe foto si, Getty Images
Dịka ọ dị ụgbu a, ndịagha ụgbọelu Naijirịa ehiwela ụlọọrụ na Minna ma kwuo na ha ga-ebido iwakpo ndị omekome a ozugbo ozugbo.
Naịjịrịa ga-ebi Chaịna ego:
Naijirịa ga-ebite ijeri dollar abụọ na ọma n'aka china nke ha ga-eji rụọ igwe na-eji ikuku agbịdị emepụta ọkụ Latrik.
Ha ga-ebido ịrụ ya bụ igwe na emepụta ọkụ Latrik nke ga-adị na Abuja,Kano na Kadunna steeti n'ọnwa Aprel ma na atụ anya na ịgwe a ga-ebulite ike ọkụ latrịk Naijiria rụọ mega watts puku iri.
N'Egwuregwu
Dịke ama ama na boolụ nkata bụ Kobe Bryant na nwa ya nwaanyị nwụrụ n'ihe mberede ụgọelu n'Amerika.

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụ ihe mbere ụgbọelu gburu ya na nwa ya nwaanyị bụ Gianna na mmadụ asaa ndị ọzọ.
Bryant gbara afọ iri anọ na otu tupu ọ nwụọ.
Lee ka ndị amaama sị ebe akwa arịrị maka ya ebe a:
Gụọ ihe ị kwesịrị ịma maka ya ebe a: Ihe asaa ị kwesiri ịma maka Kobe Bryant
Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji:










