Nigeria Election 2019:: Ntuliaka ga-aga n'Anambara dịka e siri hiwe ya - Inec

Inec ekwuola na agbanyeghị ọkụ gbara ụlọrụ ha na Anamara steeti, ntulliaka ga-aga dịka e siri kwado ya na steeti ahụ.
Ọkụ amaghị ebe osi gbapịala ụlọọrụ Inec dị n'Ọka, Anambara Steeti ụbọchị Tuzde.
Dika ozi Inec wepụta nke Onye Kọmịshọna ha na-ahụ maka mgbasaozi bụ Festus Okoye binyere aka kwuru, otụtụ ngwaọrụ ha nke gụnyere 'Card Reader' dị pụkụ anọ, narị isii na iri itoolu na ise so na ihe ọkụ ahụ repịara.
"N'agbanyeghị ndọghachi azụ ọdachie wetara na nknjikere anyị maka ntuliaka n'Anambara steeti, ụlọọrụ anyị gbalịrị nweta 'card reader' ndị etinyeghị nọ ọrụ na steeti ndị ọzọ a ga-eziga Anambara."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
"Nke a nyere anyị ọkịka obi na ntuliaka ga-aga n'Anambara dịka e siri kwado ya."
Okoye kọwara na ọdachi nke Anambara bụ nke atọ ya n'ime abali iri na abụọ dịka ọkụ gbara ụlọọrụ ha dị na Isiala Ngwa, Abia steeti nakwa Opuru ọchịchị Qua'an Pan dị na Platu steeti.
Ọ gara n'ihu kwuo na ha ewegarala ndị uweojii na ụlọọrụ na-agbanyụ ọkụ ozi, ndị maliterela nyocha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
N'Imo
Otu ndịagha Naijiria nke 134 Artillery regiment di n'Obinze na steeti Imo, anwuchiela umuokorobia ano bu ndi Soja adigboroja.
Ha kọwara ndi a dika ndi ori nọ n'Owere, gbakwunye na ha na-emenyụ ndị mmadu anya kemgbe.
Na mba ofesi
Otu onye anwụọla n'ọgbaghara sọ ndọrọndrọ ọchịchị na mba Senegal dịka ha na-akwado ime ntuliaka ọkwa onyeisiala.
Ọ bụ ndị na-akwado Onyeisiala Macky Sall na onye na-azọ oche ya bụ Issa Sall malitere nsogbu a.
N'egwuregwu,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Otu Flying Eagles nke Naịjirịa anarala ngalaba CAF ikike iyi mgbaaka ojii iji kwanyere Taiwo Ogbunjobi ugwu dịka ha na-akwado izute mba Mali n'asọmpị iko mba Afrịka.
Taiwo Ogbunjobi, onye bụbu odeakwụkwọ ukwu otu NFF nwụrụ ụbọchị Monde ka ọ rịachara ahụ obere oge.
Asup akwụsịla abụbọọrụ
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Otu jikọrọ ndị nkuzi politekni bụ Asup n'aha ịchafụ akwụsịla abụbọọrụ ha gbara kemgbe ọnwa abụọ.
Asup gbara abụbọ ọrụ kemgbe ọnwa Disemba afọ 2018 iji gosi iwe gbasara emezughị nkwekọrịta ha na gọọmenti etiti nke afọ 2009 nakwa nke 2017; akwụghị ha ụgwọ kwesịrị ha, ịta ụfọdụ ndị otu ha ahụhụ nakwa ihe ndị ọzọ.
Clinton sị na ya agaghịkwa abịa Naijiria dịka ọkwadoburu

Ebe foto si, Getty Images
Aka chiburu mba Amerịka bụ Bill Clinton akagbuola njem ya ịbịa Naịjirịa nke Otu National Peace Accord zigara ya akwụkwọ ka ọ bịa hụrụ ka mbinye aka n'akwụkwọ nkwekọrịta udo ga-esi gaa.
Cheta na akara na ọ ga-ekwupute okwu n´ụbọchị a ga-ebinye aka n'akwụkwọ bụ ụbọchị Febrụwarị iri na abụọ na iri na atọ.
Akwụkwọ ozi, ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Angel Ureña zigara ụlọọrụ Thisday kwuru na ya bụ njem aghaghị ịnwe ntụpọ ndọrọndọrọ ọchịchị.
"Nke a mere na Clinton agaghị abịalị ọgbakọ a."
N'Anambra,

Ebe foto si, LASEMA
Ụgbọala bu mmanụ ụgbọala agbala ọkụ n'okporoụzọ gawara Nnewi Okigwe dị n'Anambra steeti.
Onyeisioche ụlọ ebe a na-agbapụta mmanụ ụgbọala bụ Patrick Okeke kwuru na o nweghị onye nwụrụ n'ọkụ a gbaranụ.
Nke a na-eme ka akụkọ pụtachara abali abụọ gara aga na mmadụ asaa nwụrụ n'ọkụọgbụgba tanka mere n'Awka.

Ebe foto si, Google
Ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị Demokrats na Repọblikan na mba Amerika ekwekọrịtala iwepụta ego a ga-eji rụ agada jikọtara ha na mba ndị ọzọ ka ha gbochie mmechi gọọmenti mba Amerịka nke ọzọ.
N'Egwuregwu

Ebe foto si, Reuters
Onye otu egqwuregwu Arsenal ama ama bụ Aaron Ramsey ebinyela aka n'akwụkwọ n'ọrụ ngo ruru pounds narị anọ kwa izu ụka maka ịbanye otu egwuregwu Juventus.
Ọ nọọla ruo afọ iri na otu n'otu egwuregwu Arsenal.
Nkeji Taa
Ihe nkiri taa














