Mba 20 esonyela ịchụpụ ndị Rọshịa

Malcom Turnbull

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Onyeisi mba Ọstrelia bụ Turnbull kwuru na agwa a bụ maka ihe ndị Rọshịa mere

Mba Ọstrelia abụrụla mba ọhụrụ so achụpụ ndị mba Rọshịa nọ na mba ha arụ ọrụ dịka ndị nyocha nzuzo iji kwado mba UK maka nsị e nyere onye bubu onye nyocha nzuzo nke Rọshịa nọ na UK.

Onyeisi mba Ọstrelia bụ Malcolm Turnbull kwuru na nsị ahụ e nyere na Salisbury bụ agha e busoro mba niile.

Ihe karịrị ndị ọrụ Rọshịa mmadụ 100 ka-achụpụrụ site na mba dị icheiche na US na Eu ụnyaahụ.

Mba Rọshịa ekwela nkwa na ha ga-azaghachi mba ndị niile chụpụrụ ndị ha etu ha si mee ha.

Rọshịa agọnarịala na aka ha dị na nsị ahụ e nyere Sergei Skripa na nwa ya nwaanyị, Yulia na Salisbury dị mpaghara ọdịda mba Ịngịland. Ndị nyocha kwuru na nsị ahụ e nyere ha bụ ngwọagha ndị agha dịka mmadụ abụọ ahụ ka nọ n'ajọ ọnọdụ n'ụlọọgwụ.

Ọstrelia na-achụpụ mmadụ abụọ bụ ndị nyocha nzuzo a na-amaghị maka ha.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ