"Anyị ga-enyocha ọkụ gbara na Nnewi tupu ihe ọbụla" - Gọọmentị Anambra steeti

Gọọmentị Anambra steeti ekwuola na ha ga-enyocha ihe butere ya bụ ọkụ gbara na ahia Mgbuka tupu ha amara ụzọ ha ga-esi banye ya bụ ọkwụ.
Ọ bụ Kọmishọna maka mgbasa ozi bụ Don Adinuba kwuru nke a ma sị na nke a bụ ka a mara ihe butere ya bụ ọkụ ọgbụgba ka ụdi dịka ya hara ime ọzọ
Cheta na ngalaba na-agbanyụ ọkụ n'Anambara steeti kwuru na ọkụ gbara na Nnewi n'ụbọchị ụka erughị ahịa a na-ere akụrụngwa ụgbọala dịka ụfọdụ akụkọ na soshal Midia sịrị kwuo.
Ngalaba ahụ si na ọ bụ ebe a na-awụfu ahịhịa ka ọkụ a malitere mana ndị ọrụ ha gbara mbọ hụ na ọbaghi n'aha ahụ.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Babangidi sị na emechaghị ihe ekwesiri ime maka ahgha Biafra

Ebe foto si, AFP
Onye chịrị Naịjirịa dịka onye agha bụ Ibrahim Babangida ekwuola na Naịjiria emeghị ihe niile o kwesịrị ime ịhụ na e nwere ịdị na otu ka alụ chara agha Biafra
Babangida si na atụmatụ dịka ife ala nna,. Ụlọakwụkwọ nke gọọmenti etiti so n'ihe e wepụtara maka ihe agateghi aka etu o si kwesi.
Abiy Ahmed si Trump gaa jụọ ese

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Ethiopia bụ Abiy Ahmed sị ka Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ga jụọ ndị nyere ya ntụ ugo Ome udo n'ụwa ihe mere ha jiri nye ya ntụ ugo ahụ.
Trump sịbu na ọ bụ ya kwesịrị irite nturu ugo a.









