Queen Elizabeth: Eze Nwaanyị Ịngland sị na ọ kwadọrọ Harry na Meghan ịnọrọ onwe ha

Ebe foto si, Getty Images
Eze Nwaanyị Ịngland bụ Elizabeth ekwuola na ya na ezinaụlo ya nabatara Nwaeze Harry na nwunye ya bụ Meghan ị were oge wee nọrọ ọnwe ha ma sị na ọ ga-amasị ha ma ha abụọ na-ebi ma na-arụ ọrụ dịka ndị obieze Ingland.
Ọ bụ na mba Kanada na Briten ka a na-atụanya na ha ga-anọ.
Ikpe ntụliaka Imo steeti

Ụlọikpe Ukwu nke Naịjirịa ekwuola na ọ bụ n'ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Janụwarị ka ọ ga-ekpebi ikpe banyere ntuliaka eji hopụta aka ga-achị Imo steeti site afọ 2019 ruo afo 2023.
Ọ bụ taata bụ ụbọchị iri na atọ nke ọnwa Janụwarị ka ekwesiri ikpe ya bụ ikpe tupu ebugharịa ya ruo eche.
Hope Uzodinma nke APC na-arịọ ulọikpe ikpe ahu ka ọ kagbuo mmerị Emeka Ihedioha meriri iji bụru Gọvano Imo steeti.
Okwu onye ga-achị Kano na Sokoto steeti sokwa n'Ikpe kwesiburu ukpebi taa.
Lee etu ọnụọgụ vootu ntuliaka a siri kwụrụ oge agbakọchara ya ebe a.
Otu onye tinyere ọnụ n'okwu mere ojiri dịrị ọkụ bụ Ụkọchukwu Mbaka buru amụma na "Hope n'abịa n'Imo".
Gụọ maka ihe Mbaka kwuru ebe a: Amụma Mbaka maka Hope Uzodinma, Buhari ekwuola okwu, bịa gere ozi ndị ọnụ na-eru n'okwu.

Lee oge otu onye na-akwado PDP na onye nke pati ọzọ dọkara akwụkwọ eji agbakọ ọnu ọgụ vootu.
Ndị uwe ojii Imo steeti adoola ndị Imo aka na ntị

Ebe foto si, Getty Images
Dịka ụlọikpe kachasị na Naijirịa ka ekpebi ikpe maka ntụlịaka Gọvanọ Imo steeti n'ụbọchi iri na anọ nke Jenuarị afọ a,ndị uweojii adọọla ndị Imo steeti aka na ntị ma sị ka mmadụ niile kwanyere ọnwe ha ugwu.
Ọ bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ bụ Ikeokwu Orlando kwuru nkea na akwụkwọ ha depụtara ma sị na ha dị njikere ichekwa steeti ahụ na-agbanyeghị otu ikpe siri gaa.
Ọgbakọ maka ncheta agha Biafra a kpọro 'Never Again'

Omeiwu Enyinnaya Abaribe kwuru sị na nsogbu anyi na Naijirịa bụ na ọ di ka amụtaghị ihe na agha Biafra. Ọ bụ n'ọgbakọ maka ncheta Agha Biafra akpọrọ 'Never Again' nke e mere na Legos ka okwuru nke a.
O kwukwara na dịka Naijirịa nweziri steeti iri atọ na isii ụgbụa, na agha ọzọ ga-ebute otutu ihe mgbu na ọgba aghara karịa nke agha Biafra.
Nke mere na Kenya
Ndị omekome egbuola ndị nkuzi atọ ma tọrọ otu n'ime ha n'obodo Garissa nke dị na Kenya.
Enwebeghị ndị sị na ọ bụ ha kpara mkpamkpa a kama ndị otu Al Shabab na awakpo ndị mmadụ kemgbe na mba Kenya.
Mba US enyela ikike ewepụta ọgwụ mgbochi Ebola

Ebe foto si, Getty Images
Ị nwere ike tie mkpu maka akụkụ nke a, dịka ngalaba na-ahụ maka nrị na ọgwụ na Amerịka nyere ndị na-emepụte ọgwụ akpọrọ Ervebo ikike ịga n'ihu malite imepụta ya.
Ervebo bụ ọgwụ mgbochi ajụ ọrịa akpọrọ Ebola ga-erere ndị dị afọ iri na asato gawa.
Ndị Iran ka na-eme ngagharị iwe

Ebe foto si, Getty Images
Ndị Iran na-eme ngagharị iwe nke ụbọchị abụọ maka mgbatu ndị agha ha gbaturu ụgbọelu Yụkren nke mmadụ otu narị na iri asaa na isii nwuru n'ime ya.
Ha na-akọwa na iwe ha bụ na ndị be ha gbajọrọ ịmechi mfepu ụgbọelu dika ha tụchara ogbunigwe na ọdọ ndị agha Amerịka dị na Ịrak.
N'Egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Oji ego achụ ego ama ama bụ Aliko Dangote ekwuola na ya nwere ike ịzụta otu egwu bọọlụ Arsenal n'afọ 2020 ma ya hiwesie ụlọorụ ọ chọrọ ihiwe.
Anyi na ajụ; Onye nzọpụta Arsenal ọ ga-abụzị onye Naijirịa.
Ncheta Biafra nke afọ 50

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụ n'izu a ka a na-eme ncheta ngwụcha agha Biafra.
Ọ bụ n'ụgbọchị iri na ise nke ọnwa Janụwarị ka agbara egbe ịkpeazụ nke ejiri suo kpọm na ya bụ agha.
Mka nke a, BBC Igbo ga-amalite taata na-ewetere unu ọtụtụ ihe nkiri nakwa akụkọ maka Biafra.
Ga na BBC Igbo dọt Kọm ka ịmata nke na-eme









