Ọkụ ereela Mgbuka Obosi tọọ tọọ

Mgbuka Obosi

Ebe foto si, Anambra Fire Service

Ngalaba mmenyụ ọkụ n'Anambara bu "Anambra Fire Service" si na ọkụ gbara ahịa Mgbuka Obosi dị Anambara steeti tara akpu maka ụdịrị ihe a na-ere ebe ahu nke mere imenyụ ya jiri rịa ahụ.

N'ozi ha dere n'akara Facebook ha, ngalaba sị na ha mere ọsịsọ gbagawa Mgbuka Obosi oge ha nụru na ọkụ na-agba ebe ahụ.

Ha sị na amabeghi ihe kpatara ya bu ọkụ ma sịkwa na onweghi onye nwụru na ya kama ngwa ahịa o mebiri ka nkụ.

"Ọ bụ ihe na-ere ọkụ n'ike di n'ahịa ahụ mere ọku a jiri karịa mana anyi gbanyụru ya."

Mgbuka Obosi

Ebe foto si, Anambra Fire Service

Mgbuka Obosi

Ebe foto si, Anambra Fire Service

Mgbuka Obosi

Ebe foto si, Anambra Fire Service

Jamb akagbuola atumatụ NIN maka ule 2020

Ụmụakwụkwọ na-ele ule Jamb

Ebe foto si, Jamb/webste

Ngalaba na-ahụ maka ule mahadum na Naịjirịa bụ "Joint Admissions and Matriculation Board" (Jamb) akwụsịla atụmatu ha jiri si na ọ bụ iwu na ndi chọrọ ile ule mahadum ga-enwerịrị akara ọnụọgụ ejirimara Bekee kpọrọ "National Identification Number" (NIN) tupu ha edenye aha ule nke 2020.

Onyeisi Jamb bụ Ishaq Oloyede kwuru nke a ka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Abuja ụbọchị Satọde.

Ọ sị na ha kagburu atụmatụ iji nye ụmụakwụkwọ ohere ịgbata akara njirimara NIN a.

Ọ sịkwa na nwezuga a ga-enye aka hụ na nsogbu ha nwere n'ụfọdụ ebe a na-agbata akwụkwọ ule bu ihe gara aga.

Maazị Oloyede sị na iji NIN denye aha ga-abụrụ usoro ule nke 2021.

Jamb sị na ọ bụ maka ịkwụsị ndi mmadụ idenye aha karịa otu ugboro kpatara ha jiri wete atụmatụ.

Ọtụtụ ihe gọọmentị na-emekwa chọrọ akara NIN a tupu ọ gaa n'ihu.

Atụmatụ a Jamb weputara tinyere ọtụtụ ndi chọrị ide ule n'ezigbote ahụhụ dika BBC hụrụ n'ebe a.

Gọọmentị Buhari di Ọwụwa Anyanwụ mma na-alụ

Chris Ngige

Ebe foto si, @LabourMinNG

Nkọwa foto, Chris Ngige na-arụ dịka Minịsta na-ahu maka ọrụ

Onye kwuru nke bụ Minista na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige ka ọ na-etinye ọnụ na ọnọdụ ndị Igbo n'ọchịchị Muhammadu Buhari

Ngige sị na ihe Buhari rụrụ n'ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa n'afọ ise karịrị ihe PD rụru n'afọ iri na itoolu ha chịrị.

Delta steeti na ụgwọ opekete mpe

Gọvanọ Delta steeti bụ Ifeanyi Okowa

Ebe foto si, @GovIfeanyiOkowa

Nkọwa foto, Delta steeti ekwuola na ha amaliteka ikwụ ụgwo opekete mpe

Gọọmentị Delta steeti etinyela aka n'akwụkwọ were kwuo na ha ga-ebido ịkwụ ndị ọrụ gọọmentị ụgwọ obekete mpe dịka gọomenti etiti si hiwe .

Ha kwụrụ nke a dịka ha na ngalaba na-ahu maka ndị ọrụ nke Delta steeti nwere nzụkọ ma kwuo na ndị ọrụ ga-erite elele a site n'ọnwa Nọvemba 2019 were gawa n'ihu.

N'Ofesi

Tsai Ing-wen emeriela

Tsai Ing-wen

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Tsai Ing-wen

Tsai Ing-wen emeriela dịka onyeisiala mba Taiwan. Nkea ga-eme ya gba nke abụọ ya.

Nke a na-abịa n'azụ ọgbaghara maka okwu ọnọdụ ogbo ha bụ Hong Kong na Chaina. Dịka Hong Kong, ụfọdụ ndi Taiwan chọrọ ka ha nwere onwe ha, ebe ụfọdụ chọrọ ka ha laghachi sonye na Chaina.

Canada na ụgbelu mba Ukraine gbaturu

Ebe ụgbọelu dara na Iran

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mmadụ niile nọ na ya bụ ụgboelu nwụrụ

Gọọmentị mba Kanada ekwuola na ihe ka mkpa ugbua bụ ka ịhụ na ndị nwụrụ n'ụgbọelu Yukren Iran gbaturu anwụghi n'efu.

Mmadụ iri ise na asaa si mba Kanada so n'ime mmadụ otu narị na iri asaa na isii nwụrụ n'ọdachi a.

Eze ndị mba Oman anwụla

Qaboos bin Said

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Qaboos bin Said

Eze ndị mba Oman bụ Qaboos bin Said anwụọla.

Said dị afọ iri asaa na itolu ma bụrụ kwa ọnye ọchịchi Arab kacha kaa nka n'ụwa niile tupu ọ nwụọ.

N'egwuregwu,

Ozil nke Arsenal na Zaha Crystal Palace

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Arsenal na Crystal Palace ji ọtụ ọkpụ goolu otu ọkpụ goolu were mechie asọmpị ha

Egbe ndị Arsenal ka na-ada chamcham dịka ha gara na be ndị otu egwu bọọlụ Crystal palace ebe ha abụo a ji otu ọkpụ goolu otu ọgbu goolu were maa onwe ha aka.

Ebe ndi Chelsea ji ọkpu goolu ano asataghi ma otu were mere ndị Burnley oji. Ndị Man Utd wara anya n'ike dika ha jiri ọkpụ goolu anọ were meria ndi otu egwu Norwich.

Leicester City gbara ọnyụpa dịka ndị Brighton ji otu goolu were merie ha n'azụ ụlọ ha.

Ndị otu egwu bọolụ Liverpool ka nọ n'oche Eze Premiership dịka ha jị otu ọkpui goolu were merie ndi Tottenham.