Tinubu: Oyegun na-egbochi ọrụ ịkpa ụdọ Buhari nyere m

Ebe foto si, @apcnigeria
Tinubu bụ onye chịbụrụ Lagos n'oge gara aga kwuru na onyeisi pati APC bụ Oyegun na-emebi ọrụ onyeisiala Buhari keere ya ị chịkọta otu ha maka ịkwado ntuliaka afọ 2019.
Ọ sị na mmụọ ya mere nkụda ebe Oyegun nọ maka na n'agbanyehị nzụkọ ha nwere maka ị dozi ime otu ha, Oyegun gara niru na-atụ ya aka n'anya.
O kwuru ihe ndị a n'ime akwụkwọ ozi nke o degara ya bụ Oyegun ma gosi kwa Onyeisiala Buhari, osote ya Yemi Osinbajo, Onyeisi ụlọọrụ Sineti Bukola Saraki na Onyeisi ụlọọrụ omeiwu ukwu Yakubu Dogara.
Ọtụtụ ndi mmadụ na-ekwu na ọrụ ekenyere Tinubu siri ike ebe ndị ọzọ na-ekwu na ọbụ ịhe nkwụghachi Buhari nyere Tinubu.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:






