Na Kano, ụmụaka atọ ekubiela n'ime ụgbọala

Ụgbọala agbaghapụrụ agbahapụ

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Ụgbọala a na-agbaghapụ n'ụzọ n'ala Naijiria karịrị akarị

Nke a mere na ụzọ Warri/Ibo Road dị na Sabon Gari dị na okpuru ọchịchị Fagge.

Akụkọ kwuru na ụmụ akọ anọ nke abụọ n' ime ha bụ ndị otu nne mụrụ na-egwu egwu n'akụkụ ụgbọala apasara kemgbe na otu ebe, ndị nọ ebe ahụ amaghị mgbe ụmụaka ahụ ndị dị ihe dị afọ abụọ rue afọ anọ jiri banye ma tọ n'ime ụgbọala ahụ.

Atọ n'ime ha nwụrụ mana otu n'ime ha ghọgburu ọnwụ ma na-anara nleta n'ụlọọgwụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Kano bụ DSP Magaji Musa Majia kwetara na ihe nke a mere.

Ọ gara n'ihu kwuo na,"A kpọọla onye nwe ụgbọala ahụ maka ịgba ya ajụjụ. Nyocha na-aga n'ihu. Ihe achọpụtara a ga-eme ka ọha mara".