What is 5G: Gịnị bụ 5G? O nwereike ibutere mmadụ ọrịa?

Ebe foto si, Getty Images
Nnyocha Ofcom mere hụrụ na "radiation" dị na 5G bu nwa ntịị ka nọkwa n'ime nke a nabatara dịka nke agaghị enye mmadụ nsogbu.
Atụmatụ iwepụta 5G mere ka ụfọdụ mmadụ na-atụ ụjọ na o nwereike nye mmadụ nsogbu n'ime ahụ.
Mana, Ofcom, bụ ngalaba na-ahụ maka intaneti na Briten, sị na ọnweghi ihe ọbụla ha hụrụ na nyocha ha mere banyere ihe.

Olee mba ndị coronavirus metụtara?


Ebe foto si, Getty Images
Ha sị ọkachị ihe ha hụrụ na 5G bụ sọsọ pacentị 0.039% n'ime a sị di mma.
Etu ihe a kpọrọ "radiation" ga-adị n'igwe intanetị bụ ihe ngalaba akpọrọ "International Commission on Non-Ionizing Radiation Protection" (ICNIRP) kwekọrịtara.
N'ebe a, "non-ionizing" pụtara na ọdịghị emebe ime ahụ mmadụ nakwa "DNA" mmadụ.
Otu onye na-ekwuru Ofcom sịrị; "Ihe na-akpụ na ebe anyi nyochara bu nwa ntịị n'etu nkwekọrịta si dị mma na-hụ mmadụ.
E mere nyocha na mpaghara iri na isii n'obodo iri dị na mpaghara dị iche iche na Briten etinyegoro 5G.
Ha nyochara ike ieh akpọrọ "electromagnetic field" (EMF) n'ebe ndị a.

5G onwereike inye mmadụ nsogbu?
Ofcom malitere ịgbakọ EMF si igwe ekwentị kemgbe 2003. Mana dịka ụtụtụ ụlọ ọrụ ekwenti na Briten wepụtara 5G n'ime afọ gara aga, Ofcom mekwara nyocha ọhụrụ.
Ọ sị na nwepụta 5G mere ka ha tinye uche na nsogbu nwereike soro ya, dika otụtụ mmadụ na-ajụ maka nke a.
Ọ sị, "5G ka bụ ihe na-apụta apụta. Ya mere anyị ka ga-ana emekwa nyocha ma na-ele etu o siri kwụrụ dika a na-aga n'ihu."

Ebe foto si, Getty Images
Agbanyeghi ihe ndị mmadu na-ekwu maka ya, ndi okachamara n'ahụike na-ekwusike na onweghi nsogbu dị na 5G dịka o si metụta ahụike mmadụ.
Ngalaba na-ahụ maka ahụike mba ụwa bụ nke Bekee kpọrọ "World Health Organization" n'aka nke ha sị na "radiation" nke sị "radio frequency" nwere ike butere mmadu kansa.
O tinyere ya n'ofu ebe o tinyere akwụkwọ nri na-aka pawụda. Nke pụtara na mmanya na anụ agbara na kom kom ka ya njọ.













