Health and Wellness: Ihe ise ịgbaọtọ rahụ ụra ga-emere ahụ gị

Nwaanyị na-ararụ ụra

Ebe foto si, Getty Images

Irahụ ụra bụ otu ihe onye ọbụla na-emekarị n'abalị, nke bụ na ụwa dum nwere nkwekọrịta na irahụ ezigbo ụra na-edozi ahụ.

Ndị dọkịta apụtabeghị kwuo na e nwere nchọpụta gosiri na iyi akwa rahụ ụra dị mma karịa igba ọtọ.

Mana ndị nkuzi maka ọdịmma ahụ na-adụ ndị mmadụ ọdụ ka ha yipụ akwa rahụ ụra.

Kris Ero bụ udiri onye nkuzi a gwara BBC ihe mere o ji dị mma mmadụ iyipụ akwa ma ọ chọo ịrahụ ụra.

1. na-eme ka okpofufu ghara inye gị nsogbu ma ị na-arahụ ụra

Nne na nwa

Ebe foto si, Getty Images

Ero kwuru na igba ọtọ rahụ ụra ga-eme ka ahụ gị jụọ oyi .

Nke a ga-eme ka ị rahụ ụra ọfụma.

2.Ahụ na-egbuke egbuke

Ejima na-ararụ ụra

Ebe foto si, Getty Images

Maka na igba ọtọ rahụ ụra na-eme ka mmadụ rahụ ụra ọfụma, ọ na-eme ka ahụ maa mma.

Otu nyocha e mere maka ịchọpụta ma arahụghị ụra a na-egbchi ohere ọnya mmadụ ịla ọsịsọ gosiri na inweta ezigbo ụra na-enye aka.

3. Ọ na-ebelata mgbakasi ahụ nakwa obi iko n'elu

Ero kwuru na ọ na bụ ha na-agwa ndị bịara ikpesa na ha anaghị arahụ ụra ọfụma, ihe mbụ ha na-ajụ bụ "akwa ole ka ị na-eyi n'ahụ were alakpu ụra?"

O kwuru na ha na-adụ ndị mmadụ ọdụ ka ha na-agba ọtọ arahụ ụra ka ahụ dere ha duu ma mekwaa ka obi ha ruo ala.

I teta n'ụra, ahụ agbasie gị ike.

4. Nsori ga-ana-atọwa nti

Onye gba ọtọ

Ebe foto si, Getty Images

Ero kwuru na igba ọtọ rahụ ụra ga-eme ka ahụ gị na onye nke gị (dị maọbụ nwunye gị) na-emetụta.

Nke a ge-eme ka nsori na-atọ ụtọ maka na ahụ ụnụ ga-anabata nsori ọsịsọ.

5. Ahụ gị ga-eju gị afọ

Ero kwuru na igba ọtọ rahụ ụra ga-eme ka onwe gị maọbụ ahụ ju gị afọ.

N'okwu ya, onweghị ihe ịgwara onye na-agba ọtọ arahụ ụra ga-akụja ya.

O kwuru na ọ ga-adị mma ka ndị na-ahụghị ahụ n'anya na-agba ọtọ arahụ ụra.

"I na-ekpuchi ahụ gị site n'ụtụtụ ruo abalị, n'abalị yipu akwa gị niile ka ahụ gị kute ume.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị

Aha onyonyo, Female Pilot: O nweghị ihe ọzọ m kaara ịme karịa ịnya ụgbọelụ