Dental health: Ịta "chewing gum" ọ dị gị mma n'ahụ?

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Kedụ ihe ndị ị nụrụla gbasara ịta chịngọm? Ị nụrụ na ọ na-emebi eze? Ị nụrụ na ọ na-agbaze n'afọ ma ị loo ya?
Akụkọ a ga-edo gị anya na nke bụ eziokwu na nke bụ asị n'ihe ndị a ị nụrụla, ma kuziere gị ihe ndị ị na-amabughi maka ịta chịngọm.
Eziokwu bụ na ịta chịngọm nwere uru ma nwee ọghọm, mana akụkọ a na-eji etinye ndị mmadụ ụjọ n'ahụ ọkachasị mgbe ha ka bụ ụmụaka, bụ ọghọm dị na ya.
Otu ajụjụ ndị mmadụ anaghị ajụkarị tupu ha etinye chịngọm n'ọnụ bụ "gịnị dị n'ime chịngọm a m na-ata?"
Azịza ajụjụ a bụ: ihe e ji arụpụta chịngọm gụnyere polyisobutylene, polyvinyl acetate (latex) bụ nke e ji eme ihe Bekee kpọrọ "gum base", glycerine, shuga, corn syrup maọbụ corn starch, sorbitol, ụfọdụ na-enwekwa menthol na-eme ka ọ na-ekpo ekpo, Lecithin, Calcium Carbonate nakwa ihe ọtọbịrị bịrị nke a na-akpọ "sweeteners" gụnyere Aspartame na ụmụnne ya.
Ndị dịka glycerine anaghị enye usoro mgbari nri nsogbu, ebe a na-anyụpụnwu ndị gụnyere shuga na mịntị na nsị. Mana gum base ahụ bụ nke kacha enye nsogbu makana ọ na-ara ahụ agbaze n'ime ahụ.

Gịnị bụ uru dị n'ịta chịngọm?
1) Ọ na-enyere aka ịnyụ nsị:
Nnyocha gosiri na ịta chịngọm na-enye aka n'ịnyụ nsị ọ kachasị ndị a wara afọ.
Ọ na-eme ka akwara ndị na-enye aka n'ịgbari nri na-emegharị emegharị nke ga-eme ka ịnyụ nsị maọbụ ahụrụ dị mfe.
Otu onye ọkacha mara n'ọrịa 'bowel cancer' kwuru na: "ịta chịngọm dịka iri nri bụ nke na-enye aka imegharị akpa nsị mmadụ."
2) Ọ nwereike inyere gị aka ịgbado anya ọfụma:
Nnyocha ndị mahadum Cardiff mere bụ nke e tinyere British Journal of Psychology gosiri na ịta chịngọm na-enyere aka ịgbado anya ọfụma nke Bekee na-akpọ "focus".
Nke a dị mma nye ndị uche ha anaghị ara ahụ apụ ma ha na-eme ihe dị ka ịge ntị na nzukọ maọbụ mgbe ha na-arụ ọrụ e ji ụbụrụ arụ.
3) Ọ nwereike inyere ndị chọrọ ịta ahụ aka:
Ị na-achọ ịta ahụ? Ndị ọkachamara ekwuola na ịta chịngọm nwereike inyere gị aka, ọkachasị nke enweghi shuga n'ime ya.
Kedụ etu o si ebute ịta ahụ a? Ụfọdụ chịngọm na-enweghi shuga na-enwe sorbitol bụ 'sweetener' na-anọchi shuga; nke a na-eme ka afọ saa mmadụ ma ọ baa n'afọ ebe ọ dị ukwu.
Oke ọnyụnyụ na-ebutekwanụ gịnị? Ọ na-ebute ịta ahụ.
4) Ọ na-enye aka ịkwụsị ọnụ isi:
Ị nụtụla maka menthol? Ọ bụ ihe a na-etinye na chịngọm iji mee ka ọ na-ekpo ekpo.
Ọ na-enyekwa aka eme ka ukuru ọnụ gị na-esi isi ọma.

Ebe foto si, Getty Images
5) Ọ na-enye aka ịkwụsị agbọ.
Onye agbọ na-ahụ nwereike itinye chịngọm n'ọnụ iji nyere aka kwụsị ya bụ agbọ.
6) Ọ na-enyere aka ịgbatị agba:
Maka ndị ọnụ na-ara ahụ imepe, ịma atụ bụ onye ihe mberede mere ma metụta ọnụ ya; ịta chịngọm na-enyere aka ime ka onye ahụ nwee ike imegharị ọnụ ya.
Ịta chịngọm iji megharịa ọnụ ga-enyere aka ime ka ọnụ ahụ mepewe ebe ọ ga-emecha dị mfe.
Gịnị bụ ọghọm dị n'ịta chịngọm?
1) O nwere ike ịkpata isi ọwụwa:

Ebe foto si, Getty Images
Ụfọdụ ekwuola na ịta chịngọm ogologo oge na-akpatara ha isi ọwụwa.
Nke a na-aka njọ ma ọ bụrụ na ị na-enwe ọrịa ọtawa isi nke Bekee kpọrọ 'migrane'.
Ndị ọkachamara na-adọ aka na ntị ka onye nwere 'migrane' gbaara ịta chịngọm ọsọ.
2) Ọ na-enye nsogbu n'eze:
Ị nụtụla maka ihe a kpọrọ "cavity" na Bekee? Ọ bụ oghere dị n'ime eze mmadụ na-amụbawanye ka ụbọchị na-aga, nke na-egbu eze.
"Cavity" a na-esokwa ihe ọtọ bịrị bịrị dịka nke na-adị n'ime chịngọm. Shuga a na-ebute ure n'eze nke na-ebute bakteria na-amụbanye wee na-eme ka eze ree.
Ọ na-emekwa ka agba fụọ mmadụ ụfụ site n'ịtate ya aka.
3) Ọ na-emepe afọ:
Ụfọdụ ndị na-ekwu na ịta chịngọm na-amachi ha afọ, mana ndị ọzọ achọpụtala na ịta chịngọm na-emepe ha afọ, na-eme ka agụụ gụọ ha.
Nke bụ na ọ bụrụ na onye ahụ anọghị nso ebe ọ ga-ahụ nri rie, agụụ ga-akpa ya eze.
Akụkọ ga-amasị gị:









