Coronavirus in Nigeria: Omume ndị anyị na-eme na-enye aka ịkesa ọrịa a

Ebe foto si, Getty Images
O fọrọ obere ihe ka ọrịa Coronavirus gbasa rue mba niile dị n'ụwa.
Nke kachasị akpọtụ bụ na enwebeghị ọgwụgwọ ọbụla a ma ama ga-enye aka ịgwọ ya.
Mana ndị sayensị na ndị ọnụ na-eru n'okwu enyeela ọtụtụ ụzọ ndị mmadụ ga-esi gbochie nkesa ọrịa a.
Ha gụnyere: ịkwọ aka gị, ịmechi ihu gị ma ịzee uzele nakwa ịbelata mmetụ ndị ọzọ ahụ bụ "Social Distancing" na bekee.
1. Ọtụtụ mmadụ ịbiko n'ime otu ụlọ

Ebe foto si, Getty Images
Gọọmentị steeti dị ichiche amachiela ọgbakọ mmadụ karịrị iri ise n'ihi ofufe ọrịa a.
Mana n'agbanyeghị nke a, ebe obibi ọtụtụ ndị mmadụ dị kpakọkpakọ.
Ọ pụtara na ịnwereike ịchọta ihe dịka ezinaụlọ mmadụ asaa bi n'ime otu mkpuru, ma nwekwaa ihe dịka mkpuru iri n'ime otu ụlọ ahụ.
2. Ịnọju n'ime ụgbọala 'bus'

Ebe foto si, Getty Images
Maka etu njem ụgbọala siri dị na ọtụtụ obodo Naịjirịa, ọ ga-ara ahụ ị nye mmadụ ibe gị efe maọbụrụ na ị na-apụ apụ
Ịjị ma atụ, ụfọdụ ụgbọala na Legọs na-ebu mmadụ isee n'oche kwesiri ị ba mmadụ atọ.
Ụgbọala ọzọ na-ebu ndị na-akwụkarị ọtọ ma ụgbọala ju eju nke ga-emeriri na ahụ ndị mmadụ metụrụ onwe ha.
3. Ị nọkọta ọnụ n'ọgbakọ ọbụla

Ebe foto si, Getty Images
Ebe ọbụla ị hụrụ ọgbakọ ndị mmadụ na Naịjirịa dịka ahịa, ụlọụka, mmemme ndz, ndị mmadụ na-anọkarị onwe ha nso.
Nke a ga-emekwa na ndị mmadụ ga-emetụta onwe ha ahụ nke ga-enye aka ịkesa ọrịa na-efe efe.
4. Ị bi n'ụlọ ezighi ezi dị kpakọkpakọ

Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ ndị mmadụ bi n'ụlọ arụchaghị ọfụma ma dịkwa oke nso n'ebe ha dị.
Nke a ga-eme ka ọ raa ahụ ị me ihe bekee kpọrọ "Social Distancing" ga-enye aka ịbelata mgbasa ọrịa a.
5. Ị nwe ahịa na-ekwo ekwo

Ebe foto si, Getty Images
Etu ahịa si dị ọ kachasị n'obodo ndị buru ibu dịka Legọs, Pọtakọt na ndị ọzọ na-ekwokwarị ekwo.
Nke a pụtara na ahụ ndị mmadụ ga na-emetụ onwe ha.
Mmetụ ahụ bụ otu ụzọ a ga-esi ekesa ọrịa a.












