A hapụla ndị dị ndụ tọrọwa ndị nwụrụ anwụ?
Andrew Enwerem gwara BBC Igbo na ha anwụchiela mmadụ abụọ tọrọ ozu agadị nwaanyị a dọwara n'ụlọozu dị n'Imo steeti buru ya ga dọwa n'ime ọhịa.
Ọ sị na ndị omekome ahụ sị ndị nwe ụlọọgwụ ebe a dọwara ozu nakwa ndị nwe ozu ka ha kwụọ puku nde narị naịra anọ tupu ha ebughachi ozu nwaanyị a.
Enwerem kwuru na ihe tụrụ ha anya bụ na otu n'ime ndị omekome a ka sị n'ụlọ mkpọrọ pụta bụ ebe ọ nọrọla afọ iri na anọ maka ntọ.
Onye nke ọzọ sị mkpọrọ afọ isii pụta maka mmerụaka ntọ.
N'ọnụ ya, anyị amaghị ma onye a tọrọ maọbụ onye echiche maọbụ onye ọkwa ya gbalitere n'obodo tupu ọ nwuọ.
Enwerem kwuru na dịka ọnwa "mba" bịarala nakwa ntuliaka na-abianụ n'afọ 2019 ya na ndị otu ya kere ezigbo nkwụcha ị chekwa ndị Imo steeti ma memina ndị omekome nwereike ị kpa mkpa mkpa ọbụla.

Ebe foto si, Getty Images