Akụkọ kachasị mkpa: 'Dozienu ụzọ ụgbọelu Enugwu' - Ndị ọkwọụgboelu
Akụkọ ndị dị mkpa

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ọrụ na-akwọ ụgbọelu na Naịjirịa arịọla ngalaba na-elekọta ọdọụgboelu ha dozie okporo ụzọ ụgboelu nke odọụgboelu Enugu na Benin.
Ha kwuru na ọ bụrụ na-emeghị nke a, na ọ ga-ebute ihe mberede n'oge adịghị anya.
Ọzọ,

Ebe foto si, Getty Images
Otu APC ekwuola na amụma ụlọọrụ abụọ ndị nke sị mba Briten bụ HSBC na 'The Economist' buru maka Buharị bụ amụma ụgha nke enweghị eziokwu dị ya.
Economist kwuru na Buhari agaghị emeri na 2019 ebe HSBC kwuru na akụnaụba Naịjirịa ga-akụ afọ n'ala ma Buhari merie.
Na mba ofesi
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ndị uweojii ekwuola mmadụ isii nwụrụ dịka otu nwoke ji egbe gbagburu ha n'obodo Bakersfield nke dị na California na mba Amerịka.
Ha kwukwara na nwoke ahụ a mabeghị aha ya gbagburu onwe ya mgbe ndịuweojii na-akwado ịnwụchi ya.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Otu ụlọikpe na mba Britain amachiela onye nche bọọlụ otu Tottenham bụ Hugo Lloris ịkwọ ụgbọala n'afọ abụọ ma daa ya nha puku pounds iri na abụọ.
Cheta na ndị uweojii jidere ya ebe ọ na-akwọ ụgbọala ebe mmanya na-egbu ya.
Gee Nkeji nke ụtụtụ a:










