Abuja Airport Plane Crash: E liela ndị agha Naịjirịa nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu n'ụbọchị Sọnde

Ebe foto si, Ndị agha elu Naịjirịa
Anyammiri ruru ka osimiri oge e liri ndị agha asaa nwụrụn'ihe mberede ụgbọelu n'Abuja n'ụbọchị Sọnde.
Ndị isi ndị agha Naịjirịa niile gbakọrọ n'ogige olili ozu gọọmentị dị na Lugbe, Abuja, iji kwanyere ndị agha ahụ ugwu ma sị laa n'udo.
Mmadụ abụọ n'ime mmadụ asaa nwụrụ n'ihe mberede ahụ bụ ndị Igbo, aha ha bụ Michael Okpara na Ugochukwu Oluka.
Lee ụbọchị a ga-eli ndị agha Naịjirịa nwụrụ na Plane Crash

Ebe foto si, Afolabi Sotunde/Reuters
Ndị agha Naịjirịa ekwuola ụbọchị a ga-eli ndị otu ha nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu n'Abuja n'ụbọchị Sọnde, abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Febrụwarị afọ 2021.
Na mkparịtaụka ha na ndị ntaakụkọ nwere n'ụbọchị Wenezde, ọnụ na-ekwuru ndị agha Naịjirịa kwuru na ọ bụ n'ụbọchị Tọzde, abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Febrụwarị ka a ga-eli mmadụ asaa tufuru ndụ ha n'ihe mberede ahụ.
Ebe a ga-eli ha bụ n'ogige olili ozu nke gọọmentị etiti dị na Lugbe, Abuja.
Ndị agha ahụ gara Niger steeti ime nchọpụta, dịka a na-agba mbọ ịchọta ụmụ akwụkwọ iri anọ na abụọ ndị ntọ tọọrọ na Kagara, Niger steeti.
Ọ bụ njem a ka si alọghachi Abuja oge ụgbọelu ha kpọkasịrị dịka ọ na-chọ ifetu n'ọdọ ụgbọelu dị n'Abuja.
Lee aha ndị nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu ahụ

Ebe foto si, Afolabi Sotunde/Reuters
Ndị agha elu Naịjirịa ewepụtala aha mmadụ asaa tụfuru ndụ ha n'ihe mberede ụgbọelu mere n'Abuja ụbọchị Sọnde
Nke a dị n'ime akwụkwọ ozi nke ọnụ na-ekwuru ndị agha elu Naịjirịa bụ Ibikunle Daramola wepụtara.
Aha ndị a gụnyere: Haruna Gadzama, onye na-efe ụgbọelu ahụ; Henry Piyo, onye na-enyere ya aka, Michael Okpara, onye ji ọkwa 'Flying Officer'; na Bassey Etim, onye ji ọkwa 'Warrant Officer'.
Ndị ọzọ gụnyereOlasunkanmi Olawunmi, onye ji ọkwa 'Flight Sergeant'; Ugochukwu Oluka, ji ọkwa Sergeant; na Adewale Johnson, onye ji ọkwa 'Aircraftman'.
Buhari ebeela akwa arịrị maka ndị nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu n'Abuja

Ebe foto si, Bayo Omonoriowo
Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari egosila mwute maka ọnwụ mmadụ asaa n'ihe mberede ụgbọelu mere n'Abuja n'ụbọchị Sọnde.
Nke a bụ dịka akwụkwọ ozi onye enyemaka mgbasa ozi ya bụ Femi Adesina wepụtara.
Adesina kwuru na Buhari na-esonyere ndị otu agha elu nke Naịjirịa, nakwa ụmụ Naịjirịa niile n'iru uju maka ọnwụ mmadụ asaa bụ ndị nwụrụ n'ihu ọrụ ha.
"Buhari kwuru na dịka nnyocha na-aga n'ihu iji chọpụta ihe kpatara ihe mberede a, nchekwa ndị niile na-eme njem ụgbọelu na Naịjirịa dị gọọmentị ya oke mkpa," Adesina depụtara.
Nwa agbọghọ hụrụ mkpọkasị ụgbọelu ndị agha Naịjirịa n'Abuja akọọla ka o si mee

Otu nwaagbọghọ aha ya bụ Nkechi Ugochukwu gwara BBC Igbo na ụlọ ya dị na mpaghara Bassa, nke dị nso n'ọdọụgbọelu Abuja.
O kwuru sị: "Ana m anọ n'ime ụlọ m anụ oge ọbụla ụgbọelu na-efeli maọbụ efetu."
"Mana mkpọtụ nke a m bụrụ taa abụghị ụdị mkpọtụ m na-anụbu."
"Oge m pụtara, ahụrụ m na ụgbọelu ahụ amalitela ịgba ọkụ, mana ụgbọala abụọ na-agbanyụ ọkụ bịara malite ịgbanyụ ọkụ ahụ."
"Onweghị onye m hụrụ si n'ime ya pụta."
Mmadụ asaa nwụrụ na ihe mberede ụgbọelu ndị agha Naịjirịa n'Abuja- NAF
Ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ Nigeria Airforce bụ Ibikunle Daramola ekwuputela na mmadụ asaa nọ n'ime ụgbọelu ndị agha kpọkasiri taa bụ ụbọchị Februwarị 21 n'Abuja enweghị onye pụtara na ndụ.
O kwukwara na ndị ọrụ gbata gbata eruola ebe ahụ.
Daramola depụtara nke a na twitter ya ma na-ekwukwa na onyeisi ndị agha ụgbọelu enyela iwu ka e nyocha ihe kpatara ya bụ ọdachị.
Etu ụgbọelu ndị agha si kpọkasịa n'Abuja
Minista na-ahụ maka njem ụgbọelu na Naịjirịa bụ Hadi Sirika edepụtala na ụgbọelu ndị agha Naịjiria akpọrọ aircraft King Air 350 akpọkasiala dịka o kwuputechara na ingin ya kụrụ ka ọ si Minna abata ọdọụgbọelu dị n'Abuja.
O kwuru na ọ kpọkasiri nke ọjọ ya.
Sirika depụtara n'akara twitter ya ka onye ọbụla ka nọrọ jụụ dịka a na-eche mpụtara nyocha ndị agha na-eme.
O kwuru na etu ọ dị ugbua amabeghị ma mmadụ a ka dị ndụ maọbụ nwụrụ anwụ na ya bụ ọdachị.
Ịchetara mgbe otu onye nwụrụ dịka ụgbọelu ndịagha Naijiria dara n'ike n'Abuja n'afọ 2018?

Ebe foto si, NAF
Otu onye anwụọla dịka ụgbọelu ndịagha Naijiria adala n'ike na Katampe dị n'Abuja.
Ụgbọelu ahụ so na abụọ ndị agha ji eme ọmụmụ maka ncheta ụbọchị Nnwereonwe Naijiria.
Otu ọnụ na-ekwuru ndị agha Naijiria bụ Ibikunle Daramola kwuru na o nweghị onye merụrụ ahụ.
Mana ihe onyonyo gbara na soshal midia na-egosi na otu n'ụgboelu ahụ dara n'ike.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ha nụrụ ka ihe gbara, hụkwa ka otu onye nọ n'ime ụgbọelu ahụ ji 'parashout' fepụ.
Ka ọ dị ugbua, ahụbeghị onye ahụ ebe ụgboelu ndị agha atọ na-efegharị ebe ihe ahụ mere.
Cheta na ndị agha Naijiria kwuburu na ha ga mee ọmụmụ maka ncheta ụbọchị nnwereonwe naijiria.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2










