Nigeria Air Force recruitment 2020: Lee ụsọrọ ị ga-eji tinye akwụkwọ nwete ọrụ ebe ahụ

Ebe foto si, NIGERIA AIRF FORCE
Ụlọọrụ ndịagha ụgbọelu Naịjirịa emepela ọbaozi ha ebe ndị chọrọ inwete udịrị ọrụ ahụ ga-edebanye aha ha.
Ha kwuru na nke a bụ iji cheta nwaanyị mbụ ha bụ onye aghaelu na-eji ụgbọelu alụ agha bụ Tolulope Arotile nwụrụ anwụ n'ihe mberede ụgbọala,
Ọ bụkwa etu a ka nwada Arotile si malite njem ya n'ụlọọrụ ndịagha ụgbọelu Naịjirịa. Ndebanye aha maka inweta ọrụ na ngalaba ndịagha ụgbọelu Naịjirịa nke afọ 2020 malitere n'ụbọchị iri abụọ na anọ nke Julaị.
Ogogo ebe a chọrọ ndị mmadụ bụ nke ndị a ga-ewe ga-eji ụgbọelu dị iche iche were na-echekwa ala Naịjirịa ma agha dapụta.

Ebe foto si, Nigeria Air Force
Onye ọbụla bụ onye Naịjirịa nwereike itinye akwụkwọ maka Basic Military Training Course (BMTC), ya bụ ohere ga-emechi n'ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Ọgọstụ.
Ka ị ga-esi debanye aha maka inweta ọrụ a
- Ndị niile chọrọ idebanye aha maka inweta ọrụ gaa na websaịt www.airforce.mil.ng
- Naanị otu ugboro ka ị ga-edebanye aha, ọ karịa, a gụpụ ya.
- Ị ga-ebipụta akwụkwọ ndị a ma i debanyecha aha gị n'ọba ozi a (www.airforce.mil.ng)1. Local Government Indigeneship Form; b. Attestation Form nke onye ọrụ ndịagha maọbụ onyeisioche okpuruọchịchị gị ga-ebinye aka n'aya c. Parent/Guardian Consent Form; d. Acknowledgment Form.

Ebe foto si, Nigeria Air Force
Asambodo ikwesịrị inwe iji nweta ọrụ a
- Ị ga-abụrịrị nwafọ Naịjirịa
- Onye ahụ ga-eto ogologo ruo 1.66m maka ụmụnwoke nakwa 1.63m maka ụmụnwaanyị
- Ị ga-enwe ahụike zuru oke
- Ị gaghị enwe nrụrụaka maọbụ ebubo mpụ si n'ụlọikpe ọbụla
- Ị ga-agba afọ iri na asatọ maọbụ iri abụọ na abụọ n'ụbọchị iri atọ nke ọnwọa Juun nke afọ 2021
- Ị ga-achịtarịrị credit ise na Mathematics nakwa English na-agafe ugboro abụọ i lere ule SSCE/NECO/GCE/NABTEB
- Ndị na-etinye akwụkwọ maka ịkwọ ụgbọala kwesiri ịnwe passị abụọ n'ụle SSCE/NECO/GCE/NABTEB, credit na English na asambodo "trade test."
- Ndị na-etinye akwụkwọ maka i bu onye egwuregwu kwesiri iwete asambodo na medaalụ o ritegoro
Ọkwa dị mkpa
- Ndebanye aha maka inwete ọrụ a ga-amalite n'ụbọchị iri abụọ na anọ ma kwụsị ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Ọgọstụ 2020
- Ịgba ajụjụọnụ ga-amalite n'ụbọchị iri abụọ na anọ nke ọnwa Seputemba ruo iri na abụọ nke Novemba 2020
- Idebanye aha maka inwete ọrụ a bụ n'efu, a naghị akwụ kobo ọbụla
- Onye aka ebe gị ga-eweteriri foto 'passport', nakwa 'Drivers Licence' maọbụ 'International Passport' maọbụ 'National ID Card' ya.
- Maka ozi ndị ọzọ gbasara atụmatụ a kpọọ akara ekwentị ndị a: 09064432351, 08043440802 nakwa 09055840142 maọbụ e-mail: [email protected] maọbụ gaa na websaịt ha bụ www.airforce.mil.ng






