Arthur Eze na Anyim Pius Anyim: Gịnị na-esere ha? Lee ihe anyị ma

Ebe foto si, Arthur/Anyim/Facebook
Kamgbe izuụka ole na ole ka aha Authur Eze bụ nwafọ Igbo ji ego achụnta ego malitere iwu na soshal midia maka ihe o kwuru banyere onye Igbo ịchị Naịjirịa n'afọ 2023.
Eze nọọrọ n'obodo ya dị n'Ukpo, Dunukofia nke Anambra Steetị sị na onye Igbo ịchị Naịjirịa dị n'aka Chineke kama na ndị Igbo kwesịrị ibu ụzọ hụ onwe ha n'anya.
Ọ gara n'ihu kọwaa etu ndị Hausa si nyere ya aka site n'inye ya ọrụ ngo nakwa itinye ya n'azụmaahịa mmanụ Agbidi, na onweghi onye Igbo ga-emenwu ya.
Eze ji Pius Ayim bụbu odeakwụkwọ gọọmentị etiti n'ọchịchị Goodluck Jonathan maa atụ sị na onweghi ihe o ji ọkwa ahụ mere ndị Igbo.
Kama na ihe Anyim mere bụ ịkpọ ndị ọrụ Julius Berger ka ha rụọ ukporo gawara n'ụlọ ya, ebe ụzọ ndị ọzọ dị n'ọwụwanyanwụ adịghị mma.
Eze sị na ugbua ọ bụ onyeisiala Buhari na-arụ ụzọ ndị a tinyere akwammiri Naịja nke abụọ.
Okwu ndị a Eze kwuru wutere ọtụtụ ụmụafọ Igbo ọkachasị Pius Anyim bụ onye ọ kpọrọ aha.

Ebe foto si, Getty Images
Nke a mere Anyim ji dere Eze akwụkwọ ozi bụ nke e bipụtara n'ihu akwụkwọ ntaakụkọ n'ụbọchị abụọ gara aga.
Anyim sị na ihe na-ewe Eze iwu bụ na o nyeghi ya ọrụ ngo mgbe ọ ji ọkwa odeakwụkwọ gọọmentị etiti.
Ọ sị mgbe o malitere ọrụ a na Eze kpọ otu nwoke bịa n'ụlọọrụ ya, ma rịọ ya ka o mee ka e nye nwoke ahụ ọrụ ngo ịrụzi isiụlọọrụ ndị 'Code of Conduct Bureau'.
Mana ọ gwara Eze na ọ ka malitere ọrụ ọhụrụ na ọ mabeghi etu ihe si aga, kama na ọ gaa tinye akwụkwọ ọrụ dịka usoro iwu si dị.
Ọ sị na Eze hapụrụ ụlọọrụ ya pụọ, na ọ maghị ihe o mere mana nwoke ahụ mechara nwete ọrụ ngọ ahụ.
Anyim sị na ọ bụ kamgbe ahụ ka Eze malitere ịgba ya mgba okpuru nakwa imetọsị aha ya n'ọha.

Ebe foto si, Arthur/Facebook
Ihe ọzọ gbara ọkpụrụkpụ Anyim gwara Eze bụ na ọ na-ebere n'ahụ Jonathan mgbe ọ na-achị dịka ijiji, ugbua na o bere n'ahụ Buhari na-akatọzi ọchịchị Jonathan.
Ọ dị ka a ga-asị na ihe a Anyim dere wutere Eze ma baa ya n'ụmịị nke mere o ji zaghachị ihe niile a Anyim dere n'akwụkwọ ozi.
N'ozi si n'aka ndị mgbasaozi Eze nke Okpala Okechukwu tinyere aka na ya sị ọsịsa a Anyim dere gosiri na ọ na-emere Eze anyaụfụ.
Ọ sị n'agbanyeghi na Anyim arụọla ọrụ na gọọmentị dịka odeakwụkwọ nakwa onyeisi ndị sịnetị na o nweghi ihe o ji ya mepụta iji tụnyere Eze.
Ọ sị na Eze enyerela ọtụtụ ndị mmadụ aka site n'itinye ha n'ọrụ kamgbe ọ gụchara akwụkwọ na mba Amerịka.
Ọ gara n'ihu kwuo na Anyim bụ ihe iyi ndụ egwu nye ndị Ebonyi bụ steetị ya mgbe o ji ọkwa onyeisi ndị omeiwu.
Na Anyim bụ onyeisi ndị sịnetị si ala Igbo kachasị njọ, na onweghi uru o ji ọkwa ahụ baara ndị Igbo.
BBC Igbo ka na-agba mbọ inwete ozi n'aka ndị abụọ Igbo ji eme ọnụ bụ Arthur Eze na Pius Anyim ka a mara "etu mmiri si baa n'opi ụgbọghọrọ"
Akụkọ ka na-abịa...
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:









