Nnyocha NDDC, NNPC, ụlọakụ na nrụrụaka ise kpọtụru akpọtu na Naijiria

Ebe foto si, Akpabio/Facebook/Reuters
Kemgbe izu ole na ole, ụmụ Naijiria na-ele ihe nkiri na-eme ka ihe onyonyo Nollywood dịka ụlọmeiwu na-eme nnyocha ihe mere ego dị ijeri iri anọ nagala a kpọrọ "Niger Delta Development Commission" (NDDC) kwesiri iji rụọ ọrụ mmepe obodo.
Bido n'ebubo nke onye bụbu onyeisi NDDC bụ Joy Nunieh boro Godwill Akpabio bụ Mịnịsta na-ahụ maka Niger-Delta, onye ụlọọrụ NDDC dị n'okpuru ya were rue nke Akpabio boro ndị omeiwu ruo etu ndị Uweojii si wakpoo ụlọ Nunieh n'ụzọ ụtụtụ, ihe nkiri na-eme na-etipụta ụfọdụ ụmụ Naijiria akwa, ebe ọ na-atọkwa imirikiti ọchị.
Mana ọ bụghị taa ka ukwu jiri dị n'azụ, nnyocha NDDC abụghị mbụ e merela nnyocha kpụ ọkụ n'ọnụ na Naijiria dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-ewe ha dịka bụ "ụja nkịta na-agbọ onye nwe ya".
Lee ụfọdụ nnyocha e mere metụtara mmefu ego, i chere na chi ga-eji ehihie jie na Naijiria mana o jighị:
1. Nnyocha ijeri dọla 16 ($16Bn)ego ọkụ latrik nke afọ 2009

Ebe foto si, Ndudi Elumelu/Facebook
Nke a bụ nnyocha ihe mere ijeri dọla iri na isii ego e tinyere na ịhazigharị oku latrik na Naijria bido n'afọ 1999 rue afọ 2007 nke Ụlọomeiwu Nta site na kọmiti ha na-ahụ maka ọkụ latrik.
Tupu nnyocha ahụ abịa na njedebe, egwu dagharịrị dịka a malitere tụwa onye ndu kọmịti ahụ lebara ya anya bụ Ndudị Elumelu aka iri ngarị.
Ihe e jiri nchọpụta ahụ mee: Ka nnyocha ahụ bịara na njedebe, naanị anọ n'ime ihe iri asatọ na asatọ kọmiti Elumelu tụnyere alo ka e mee bụ ihe e mere.
2. Nnyocha ebubo mmefu ego dị N628 eboro Patricia Olubunmi Etteh oge ọ bụ onyeisi ụlọomeiwu nta

Ebe foto si, PAtricia Etteh/Facebook
E nyochara Patricia Etteh, onye bụbu onyeisi Ụlọomeiwu Nta n'afọ 1999 maka imefu N628m na ịrụzi ụlọ obibi onyeisi Ụlọomeiwu nta n'Abuja.
Ihe e jiri nchọpụta ahụ mee:E mechara jiri maka nnyoha ahụ chutuo Etteh n'ọkwa onyeisi ụlọomeiwu Nta n'afọ 2009.
Mana Lawan, onye bu nnyocha ahụ n'isi ma bụrụkwa onye ọtụtụ na-ahụta dịka onye na-akwụba aka ya ọtọ mechara maa na ọnya nrụrụaka dịka a chọpụtara na o riri ngarị.
3. Nnyocha ihe mere ego ụlọakụ
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ụlọakụ etiti bụ CBN n'aha ịchafụ mere nnyocha ụlọakụ dịga na Naijiria ma rụọ ụfọdụ ndị isi ụlọakụ gụnyere Erastus Akingbola, nke Intercontinental Bank, Cecilia Ibru nke Oceanic Bank na Bartholomew Ebong nke First Bank aka maka ebubo nrụrụaka n'ime ndị isi ụlọakụ.
Ndị ọzọ bụ Francis Atuche nke Bank PHB,Sebastian Adigwe nke Afribank na Okey Nwosu.
Nnyocha ijeri Naira 555( N555billion) ego batara n'akpa Nigeria National Petroleum Corporation (NNPC) bido na Decemba 2004 na Eprelu 2007 n'oge ọchịchị Umaru Musa Yar'Adua.
Ihe e jiri nchọpụta ahụ mee: A chụrụ ndị isi ụlọakụ iri abụọ n'ọrụ, kpụpụ ọtụtụ ha ụlọikpe.
E mechara tụọ Cecilia Ibru mkpọrọ ọnwa iri na asatọ ma nye ya iwu ka ọ kwụchigha ebe Erastus Akingbola onye ejichiburu na mkpọrọ gbatara isi onwe ya n'ụlọikpe kachasị.
4. Nnyocha Dasuki, Olisa Metu maka mmefu ego nchekwa

Ebe foto si, Reuters
Nke a mere ngwangwa Onyeisiala Muhammadu Buhari batara n'ọkwa ya n'afọ 2015.
E boioro Sambo Dansuki ebubo imefu ijeri dola abụọ($2bn) bụ ego e kwesịrị iji zụọ ngwa agha maka ọgụ Boko Haram.
Ndị ọzọ a rụụ aka n'ebubo ahụ gụnyere Chief Raymond Dopesi, nwee DAAR Communications PLC, aka chịburu Sokoto steeti bụ Attahiru Bafarawa, onye bụbu Mịnịsta nta na-ahụ maka eg Bashir Yuguda.

A rụkwa nwa afọ Igbo bụ Olisa Metuh aka n'ebubo ahụ si na o mefuru ego dị nde naira 400 .
Ihe e jiri nchọpụta ahụ mee:A kpụpụrụ ndị a ụlọikpe maka ị zara ọnụ ha.
E mechara tụrụ olisa Metu mkpọrọ afọ asaa maka ya.
Nnyocha NNPC
E nyochara ụlọọrụ na-ahụ maka mmefu ego dị tari atọ (3trillion naira) nke mere n'afọ 2016.
Ọ bụ Ụlọomeiwu Ukwu n'oge Bukola Saraki bụ onyeisi ya hibere kọmiti lebara anya na nrụrụaka na-aga n'ụlọ mmanụ agbịdị na Naijiria ma mee Senetọ Jibrin Barau, onyeisioche kọmiti ahụ.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
- Abụghị m onye ọgwụ ego - Kanayo O. Kanayo
- Abaribe: 'Aga m akwado Biafra ma e mee Referendum'
- Ndị Igbo sị na ha abụghị Igbo na ihe kpatara ya
- Etu ụdịrị nsị ị nyụrụ si egosi ahụike gị
- 'Ebubo Gọọmenti etiti boro Ipob bụ ebubo ụgha'









